Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 10 NKE 15

Ndị Kọlọsi Isi Nke Mbụ | Bie Ya

Nnọọ nụ ọzọ ndị enyi m - anyị mere ya! Anyị sooro Jizọs site na mbido na ruo ngwucha oziọma Mak. Ya mere gịnị na-esote? E kwuwe, nke ọzọ bụ na anyị ga-eso Jizọs. Amaara m - anyị mere nke ahụ na mbụ. Mana ugbu a, ọ dị iche. Na ngwụcha nke Mak, ndị na-eso ụzọ Jizọs ji anya ha hụ ka Jizọs na-arịgoro n'eluigwe. Ezigbo ihe itu n'anya! Mana mgbe ha sogidere nzọụkwụ Ya afọ atọ wee gasia, gịnị ka ha na-eme ugbu a?

E kwuwe, tụpụ Ọ pụọ, Jizọs nyere ha Ọrụ Ukwu ahụ:

“Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ M…” (Matiu 28:19).

Cheta - onye na-eso ụzọ pụtara onye na-erube isi nye ihe ọbụla si ụzọ ahu. Yabụ na a kpọrọ ndị mbụ na-eso ụzọ Ya ka ha meta ọtụtụ ndị na-eso ụzọ - dị ka anyị.

Ha mere ya! Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ akụkọ ha dị ịtụnanya ka ha ji ozi ọma wee rute akụkụ ụwa ha dum. Ugbu a ọ dị m ka ya bụrụ na m nwere ike ikwu na ihe niile dị mma kemgbe ahụ. Mana ọ dịghị otu ahu. Ụka Ndị Kraịst emewo ihe ọma dị ukwuu n'ụwa, mana anyị emewokwa ụfọdụ ihe ọjọọ a hụrụ anya. Ihe ọjọọ ndi a malitere n'oge ahụ - nrụrụ aka, anyaukwu, ihu abụọ - ha si n'mbụ wee bata. Ma e nwekwara ihe ọma: ọmịiko, olileanya, na amara. Yabụ na ọ bụrụ na anyị ga-eme nke a, ka anyị mee ya n'ụzọ ziri ezi. Ka anyị bie ya.

Mana elee otu anyị ga-esi bie ya? E nwere m ike ịsị, "Kwụsị ime ihe ọjọọ ma malite ime ihe ọma." ma nke ahụ bụ irụ ọrụ site n'èzí wee baa n'ime - ọ bụ ntụziaka maka ihu abụọ. Jizọs na-agbanwe anyị si n'ime pụta. Kedu ka nke ahụ si arụ ọrụ? Ka anyị gaa na Akwụkwọ Nsọ iji chọpụta.

Gafee akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, Akwụkwọ Nsọ nwere ọtụtụ akwụkwọ ozi di nke onwe nke ndịozi dere - nwere ntụziaka banyere otú e si eso Jizọs ugbu a. Ozizi ọjọọ batara n’ọgbakọ ndị Kraịst n’oge, ya mere e dere akwụkwọ ozi ndị ahụ iji nyere ndị kwere ekwe aka ịmata nke bụ eziokwu na ụgha – na ịbịpụta ndụ nke eziokwu.

Ya mere, ebe ahụ ka anyị na-aga na-nsote: Ndị Kọlọsi. Ọ bụ akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi. Ha bụ ndị kwere ekwe ọhụrụ, ya mere ọ bụ nke zuru oke maka anyị. Taa n'isi nke mbụ, anyị ga-ahụ ihe atọ dị mkpa maka ibi ndụ ziri ezi: amara, Mmụọ Nsọ, na ịmara Jizọs.

Akwụkwọ ozi a ji okwu ekele di nma sitere na Pọl wee malite, ọ na-amasị m nke ukwuu otu akwụkwọ ozi ndị a si bụrụ nke onwe. Ọ fọkwara nke nta ka akwụkwọ ozi ọ bụla e dere malite na amara. Ọ bụ ekele nkịtị, mana ọ bụkwa eziokwu di ntọala. Amara bụ onyinye - ọ bụghị nke anyị na-enweta, ọ bụghịkwa nke ekwesiri inye anyị, Chineke hụrụ anyị n'anya n'ihi na Ọ hụrụ anyị n'anya - amara. Na ịbịpụta ndụ anyị n'okwukwe na-amalite site n'ighọta amara.

N’ebe a na Ndị Kọlọsi, Pọl malitere site n’ikele Chineke maka ọrụ dị ịtụnanya Ọ na-arụ ná ndụ nke Ndị Kraịst ọhụrụ a: okwukwe ha, ịhụnanya ha, na olileanya ha. Ma Pọl na-ekwu na ọrụ a malitere n’ụbọchị ha nụrụ ozi ọma,

"...ma ghọta amara Chineke n’ezie" (Ndị Kọlọsi 1:6).

Nke a bụ nzọụkwụ nke mbụ. Ghọta na Chineke zọpụtara anyị n'ihi na Ọ hụrụ anyị n'anya. Ọ bụghị n'ihi na ọ bụ ihe anyị ji aka anyị rụta - anyị enwekataghị rụta ya. Ọ bụghị n'ihi na ọ bụ ihe ekwesịrị inye anyị - anyị ezughi ezu maka nke a. Jizọs kwụrụ ụgwọ zuru oke, anyị enweghị ike ime mgbakwunye nye ọrụ Ya. N’akwụkwọ ozi ọzọ Pọl degaara ndị Efesọs, Pọl si otú a kwuo ya:

"N’ihi na ọ bụ amara ka e jiworo zọpụta unu site n’okwukwe - nke a esiteghịkwa n’onwe unu, kama ọ bụ onyinye Chineke - ọ bụghị site n’ọrụ, ka onye ọ bụla ghara ịnya isi" (Ndị Efesọs 2:8).

Enwere udo n'enweghị atụ na ezigbo nnwere onwe n'eziokwu a dị mfe: a zọpụtara anyị site n'amara. "Ọ bụghị site n'ọrụ" pụtara na anyị anaghị enweta nzọpụta site n'ike aka anyị. Ịgbalị inweta nzọpụta na-eduga n'ịnya isi, mpako, na ikpe ikpe - dịka ndị ihu abụọ. Ịghọta amara na-eweta ịdị umeala n'obi. Anyị ka na-arụ ezi ọrụ, ma anyị na-eji otu amara ahụ Chineke nyere anyị. Pọl na-akpọ ya "ịmị mkpụrụ" - ntolite tụrụ anya si n'mgbanwe mere n'ime pụta.

N'ikwu okwu banyere ime, kedugodi ihe na-eme n'ime? Kedu ka mgbanwe ahụ si eme na elee ebe nghọta ahu si abịa? N’amaokwu nke asato, Pọl na-ekwu na ịhụnanya ọhụrụ n'eme n’etiti ndị kwere ekwe bụ "ịhụnanya n’ime Mmụọ Nsọ." Na n’amaokwu nke itolu, ọ kpere ekpere ka Chineke...

"...jupụta gị n’ọmụma nke uche Ya site n’amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ na-enye."

Nke a bụ igodo anyị n'esote: Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ bụ Chineke - akụkụ atọ nke Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ na-arụ ọrụ n'ime anyị, na-enye anyị ịhụnanya na ọmịiko, na-enyere anyị aka na nkwenye na ume iji guzogide ihe ọjọọ, ma na-eduzi anyị na amamihe na nzù maka ndụ. Site n'ike nke Mmụọ Nsọ bụ otu anyị si ebi ya.

Ihe si na ya pụta, n’amaokwu nke iri, bụ "ndụ kwesịrị otu Onye-nwe-anyị si ka anyi bie." Nke ahụ bụ isi ihe. Ọ bụghị irụ ọrụ iji nweta ihunanya Ya, kama ọ bụ ibi ndụ kwesịrị ekwesị maka ịhụnanya dị ịtụnanya Ọ si na mbụ gosi anyị. Amara na-ewepụ nlekwasị anya n'ọrụ anyị wee tinye ya na iru eru Ya, nakwa na "ito eto n'ọmụma nke Chineke" (1:10).

E kwuwerị, nke ahụ bụ ihe iso Jizọs bụ: ịmara Ya. Cheta - hụ Chineke n'anya na hụ ndị ọzọ n'anya. Ma nke ahụ na-eduga anyị na ihe di anyị mkpa nke atọ: amara, Mmụọ Nsọ, na ịmara Jizọs. Ịsi akwụkwọ ọzi nke a na-abia na njedebe jiri ihe ncheta di ike maka onye Jizọs bụ. A ga m eji ya wee mechie, ma ana m agba gị ume ka ị gụọ Ndị Kọlọsi Isi Nke Mbụ, ma jiri ezigbo oge tinye uche gị ebe a. Mata Ọkpara Chineke. N'amaokwu nke iri na ise:

"Ọkpara Chineke (Jizọs) bụ onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya, Onye e bụ ụzọ mụọ n’elu ihe nile e kere eke. N’ihi na n’ime Ya ka e kere ihe nile: ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’elu ụwa, ihe a na-ahụ anya na ihe a na-apụghị ịhụ anya, ma ọ bụ ocheeze ma ọ bụ ike ma ọ bụ ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị ikike; Ekère ihe nile site n’aka Ya na maka Ya. Ọ nọ tụpụ ihe niile, na n'ime Ya ka ejikọtara ihe niile ọnụ."

Maka Ntụghari Uche & Mkparita Ụka

  • Nduzi nke taa kwuru na ịgbalị ịgbanwe site n'ezí baa gawa n'ime bụ uzommepụta maka ihu abụọ. Gịnị ka i chere kpatara ọ jiri di otu ahu?
  • E kwuola na irụ ọrụ maka nzọpụta na-eduga n’ikpe ọmụma ma ọ bụ mpako, ebe amara Chineke na-eduga n’udo na ịdị umeala n’obi. Ì chere na nke ahụ bụ eziokwu?
  • Ndị Kọlọsi 1:10 na-akpo anyị ka anyị bie “ndụ tozuru otu Onye-nwe-anyị siri si ka anyị bie.” Gịnị ka i chere na ndụ ahụ yiri?
Igodo: ụbọchị_Iri ụbọchị_Iri
Ụbọchị 9Ụbọchị 11

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org