Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 12 NKE 15

Ndị Kọlọsi 2 | Nọrọ Na Ụzo N'Ezie

Nnọ nụ ndị enyi m. Nke taa bụ ịdọ aka ná ntị banyere aghụghọ. Anyị nọ na Ndị Kọlọsi 2, ma amaokwu nke anọ na-ekwu,

"Ana m agwa unu ihe a ka onye ọ bụla ghara iji arụmụka dị ka ọ bụ ezi ya ghọgbuo unu."

Akpọrọ m asị mmadu ị ghaara m ụgha. Ma e nwere aghụghọ - ndị nkuzi ụgha ma ọ bụ ndị nkuzi na-eduhie eduhie - makwa arụmụka ha nwere ike ịda ka ọ bụ nke ọma. Mana ekwela ka eduhie gị. N'ihi na aghụghọ nwere ike iziga gị n'ụzọ na-ezighị ezi. Ị banyetula ụgbọ ala na-aga n'ụzọ na-ezighi ezi? Ma ọ bụ nke ka njọ, oge m no n'ụlọ akwụkwọ e weere m ụzọ na-ezighị ezi n'agbamọsọ ụzọ ya bụ puku ise wee gbagide nno na-agba gbafeecha ahịrị njedebe wee gbamie karia ka a chọrọ. N'oge ahụ mgbasi m ike n'ọsọ adịghị mkpa - N'ihi na ana m agba ọsọ n'ụzọ na-ezighị ezi! Ma otu ihe ahụ nwere ike ime n'ụzọ ime mmụọ.

Dịka anyị na-eso Jizọs, anyị ga-anọrịrị n’ụzọ - na-aga n’ebe ziri ezi. Ma ụzọ ziri ezi iji na-eso Jizọs - bụ ị na-eso Jizọs. Ọ bụ Ya bụ ụzọ. Ugbu a nke ahụ nwere ike ịpụta ihe doro anya, ma mgbe ụfọdụ anyị na-adọpụ uche. Ma ọ bụ nke ka njọ - buru ndi a ghọgburu. Ya mere, iji dobe anyị n'ụzọ, ka anyị malite n'ime Okwu Chukwu. Ndị Kọlọsi 2, amaokwu 6:

"Ya mere, dị nnọọ ka unu siri nata Kraịst Jizọs dị ka Onye-nwe-anyị, nọgidenụ na-ebi ndụ unu n’ime Ya."

Nke ahụ masịrị m. Malite na Jizọs - na nọrọ na Jizọs. Ndị ozizi ụgha na-achụpụ ndị kwere ekwe pụọ na ịdị mfe nke nanị iso Jizọs. Ya mere gaa n'ihu nọgide na Ya, n'amaokwu nke 7,

"... gbanye mkpọrọgwụ ma di mwulite n'ime Ya."

Chee echiche banyere nke a. Mgbe ị kụru osisi, ị na-ekegide ya obere osisi nduzi ka ọ wee nyere ya aka imalite ma too. Ụfọdụ ndị na-ewere Jizọs dị ka a ga-asị na Ọ bụ obere osisi nduzi ahụ. Ha na etolite ma hapụ Ya wee gawa. Emekwala nke a. Jizọs bụ mgbọrọgwụ anyị n'ezie. Ya onwe-ya bụ osisi vainu, anyị bụ alaka Ya. Mgbọrọgwụ na-enye anyị nri maka uto ma mee ka anyị kwugidesie ike na oké ifufe. Anyị ‘gbanyere mkpọrọgwụ ma di mwulite’ n’ime Jizọs. Ya mere, Pọl dọkwara anyị aka ná ntị ọzọ, sị: “Ekwela ka e were “nkà ihe ọmụma nke n'enweghi ume na nke di aghụghọ” dokpuru unu ka ohu, bụ́ nke na-esiteghị n’ime Jizọs. Amaokwu nke 9:

"N’ihi na n’ime Kraịst ka uju nile nke Chineke dị ndụ n’ụdị anụ ahụ,"

Ezigbote ihe nturumanya. Uju nke Chineke na anụ ahụ. Nke a bụ Jizọs. Uju - ọ bụghị nke ntakịrị, ọ bụ otu narị pasenti. Na amaokwu nke 10:

"... n'ime Kraist ka e mere ka unu di uju."

N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, Jizọs bụ Chineke zuru oke, ma mgbe ị gbanyere mkpọrọgwụ na Ya, ị ga-aghọ onwe gị nke ọma - ụdị onye e zubere gi ka ị burụ.

Ya mere, ndị ozizi ụgha nọ na-achụpụ Ndị Kraịst n’ụzọ di ezie site n’ịkụzi na Jizọs abụghi Chineke zuru oke. Na kama ha ịgbaso Jizọs, ha lekwasịrị anya n'ịgbaso iwu. Ha sịrị na ị ga-emeriri ihe ndị a iji wee gaa Eluigwe. Ihe ndị sitere na Agba Ochie, dị ka ibi úgwù.

Ọ dị mma, kwụsị ịchị ọchị. Ibi úgwù pụtara dị ka ihe oyiyi anụ ahụ nke nwere ihe omimi ọ pụtara n'ime mmụọ. Iwepụ anụ ahụ anyị n'ibi úgwù bụ onyinyo na-egosi ka - ọdịdị mmehie anyị - si adi mbepu site n'aka Onye-nwe-anyị. Mana ibi úgwù nke anụ ahụ bụ maka ndị Juu, ọ dịghị mgbe e mere ya ka iwu nye Ndị Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ozizi ụgha siri ọnwụ ka e bie ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst úgwù, ha wee gbanwee iso Jizọs ka ọ ghọọ ụyọkọ ime ihe na nke a na-emeghi, na-eme ka a ga-asi na ha na-arụ ọrụ ime ezi ihe. N'agbanyeghị nke ahụ, Pọl na-ekwu na Jizọs rụrụ ọrụ ahụ niile - Ọ bepụrụ anụ ahụ anyị - n'ụzọ ime mmụọ, a bụghị n'ụzọ anụ ahụ.

Amaokwu nke iri na abụọ na-ewelitekwa baptizim. Ọ bụrụ na ị bụ nke Jizọs, Ọ na-akpọ gị ka e mee gị baptizim. Baptizim abụghị ọrụ iji nweta nzọpụta, ọ bụ ihe ị na-eme n’ihi na Jizọs zọpụtara gị. N'ime baptizim, anyị na esonyere Jizọs: ndụ ochie m sooro Jizọs nwụọ n'obe, mbilite n'ọnwụ Ya wetaara m ndụ ọhụrụ. Ya mere ime baptizim pụtara olili ozu - imikpunye n'ime mmiri, na mbilite n'ọnwụ - isite na mmiri ahu pụta.

Ndụ ọhụrụ ahụ bụkwa otú anyị si eso Jizọs ugbu a. Nke ochie agaala. Anyị anaghị arụ ọrụ iji kwụọ ụgwọ mmehie anyị niile. Amaokwu nke 13 na-ekwu na Jizọs

"...gbaghaara anyị niile mmehie anyị."

Ọ kagburu ụgwọ anyị niile - ọ nweghị ihe ọzọ di anyị ga-akwụ. Mmehie gị enweghị ihe ọ bụla ọ jigidere n'ahụ gị.

Ma ya mere ịgbaso Jizọs abụghị naanị ime usoro iwu. N'amaokwu nke 16, ọ bụghị ihe dị ka "Ihe ị na-eri ma ọ bụ ihe ị na-añu," ma ọ bụ ihe di ka "ememe ụlọ ụka" ma ọ bụ nke ụbọchi Sabbati. Ihe ndị ahụ dị na Ogbụgba Ndụ Nke Ochie, ma ha dịkwa mkpa, mana amaokwu 17 na-akọwa na ha niile bụ...

"...onyinyo nke ihe ndị ga-abịa."

Onyinyo bara uru - ha na-enye gị nkọwapụta nke ihe na-abịa. Ma Pọl na-ekwu na nke bụ eziokwu - isi ihe "dị na Kraịst."

Jizọs bụ isi ihe n'ezie. Iwu na omenala bụ naanị onyinyo.

Mgbe anyị na-ahapu onwe anyị n'ime ihe ndi anyi kwesịrị ime - dị ka "Ị kwesịrị ife ofufe, Ị kwesịrị ikpe ekpere" - anyị na-atụgharị ofufe ka ọ bụrụ ihe ikpe ọmụma. N’agbanyeghị nke a, anyị na-agbakwụnyekwu iwu dị ka amaokwu 21,

"Etinyele aka! Emetụla ọnụ! Emetụla aka!"

Pọl kwuru na iwu ndị ahụ nwere "ọdịdị amamihe," mana ha anaghị arụ ọrụ. Ị pụghị iji iwu siri ike na ofufe mmanye mee ka gị onwe gị di mma. Nakwa ndụ abụghị igbe mee na emeghie.

Gee ntị. Mgbe anyị na-eso Jizọs, e nwere ọtụtụ ihe anyị na-emebu nke anyị anaghị eme ozo. Mana ọ bụghị maka iwu. Anyị na-agbanwe n'ihi na e mere anyị ọhụrụ. Anyị gbanyere mkpọrọgwụ na Jizọs ma jupụta na Mmụọ Nsọ, Onye na-enyere anyị aka ịhapụ mmehie na ibi ndụ ezi omume. Nke ahụ abụghị onyinyo - nke ahụ bụ eziokwu.

Iso iwu bụ njem ikpe ọmụma. Iso Jizọs bụ njem nke amara. Gụọ Ndị Kọlọsi 2, ma hụkwa na ụgbọ ala ị nọ n'ime ya na-aga n'ụzọ ziri ezi.

Maka Ntughari & Mkparịta Ụka

  • Pọl gwara anyị ka anyị nọgide n'ime Jizọs, dị ka anyị si malite. Olee ihe ize ndụ na aghụghọ ndị ị na-ahụ nke pụrụ ịdọpụ uche gị n’iso Jizọs?
  • Olee otú iso Jizọs si dị iche n'ịgbaso iwu? (Gụọ Ndị Kọlọsi 2:16-17)
  • Ahụmahụ gị n'iso Jizọs ọ̀ na-adị gị ka njem ikpe ọmụma ma ọ bụ njem amara? Kekọrịta akụkọ gị.
Igodo: ụbọchị_12 ụbọchị_12

Okwu Chukwu

Ụbọchị 11Ụbọchị 13

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org