Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Ụbọchị Iri Na Ano | Ndị Kọlọsi Isi Nke Ano
Ndeewo ndị enyi m. Anyi na-eme Ndị Kọlọsi isi nke ano taa, na nlaghachi n'ihe ndị bụ isi. Jizọs kụziiri anyị iwu abụọ dị mfe: jiri ihe niile i nwere hụ Chineke n’anya ma hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ma igodo ndị ahụ dị mfe na-eduzi nzọụkwụ anyị ọ bụla ka anyị na-eso Jizọs.
Isi nke anọ malitere ebe isi nke atọ kwụsịrị: ọ nwekwara ntụzịaka maka mmekọrịta. Ebe a - ohu na nna ha ukwu. Ugbu a ị ga-ajụrịrị: Akwụkwọ Nsọ Ọ kwadoro ịgba ohu? Ọ na-akwado nhata n'ezighị ezi, ịkpa ókè agbụrụ, na mmegbu?
Ka m kwuo ya n'ezoghị ọnụ. Mba. Akwụkwọ Nsọ adịghị akwado ịgba ohu, ma onye ọ bụla nke na-eji Akwụkwọ Nsọ akwado mmegbu ma ọ bụ nhata n'ezighị ezi nke mmadụ na-emeto ma n'eji okwu ndị ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi - nke bụ ihe ihere nye ya. Ebe a Akwụkwọ Nsọ na-ekwu okwu banyere ndị ohu na ndị nna ha ukwu n'ihi na ịgba ohu bụ ihe dị adị n'ezie n'oge ahụ, Pọl nyekwara ntụziaka banyere otú ha ga-esi bie ndụ n'ezie. Nye ndị ohu, ọ sịrị: Na-arụsi ọrụ ike - dị ka ị na-arụrụ Chineke ọrụ n'ihi na Ọ bụ ezi nna gị ukwu.
Na n'isi nke ano:
““Ndị nna ukwu, na-enye ndị ohu unu ihe ziri ezi na ihe ha àhà, n’ihi na unu maara na unu nwekwara Nna Ukwu di n’eluigwe.”
N'ebe a na n'ebe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ na-echetara ndị nna ukwu na ndị ohu na ha hà ka otu ihe n'ihu Chineke, n'agbanyeghị otú ọha mmadụ si kewaa ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ị ghaghị ịnọ na-eche ihe mere na Pọl akwụsịghị ịgba ohu site n’iwu nke Chineke.
Nke a dị mkpa. Jizọs, na ọbịbịa Ya nke mbụ, abịaghị imezi usoro eji eme ihe nke uwa a ma ọ bụ dozie ụwa anyị nke ọma. Ọ bịara idozi obi anyị, na ime ka obi anyị guzozie eguzo n’ebe Chineke nọ. N’ọbịbịa Ya nke ugboro abụọ, Jizọs ga-eguzobe Alaeze Ya n’ụwa, ma Ọ bu ụzọ bịa ka Ọ guzobe Alaeze Ya n’ime anyị. Nke Mbụ: Eze nke obi gị. Nke abụọ: Eze nke ụwa.
Ya mere Pọl na-akụziri anyị ibi ndụ ziri ezi n’ụwa nke ka na-ezighị ezi. Ndị ohu na ndị nna ha ukwu, ndị ọrụ na ndị nwe ọrụ, na-eme ihe ziri ezi. Gbadawa, Pọl gwara ndị ohu ka ha nweta nnwere onwe ha ma ọ bụrụ na ha nwere ike, akwụkwọ ozi ọ degaara Fịlemọn gwara otu nna ukwu ohu ka ọ tọhapụ ohu ya ma kpọọ ya nwanne - okwu dị ọkpụrụkpụ oge ahụ.
Gaa n'ihu ngwa ngwa n'ime akụkọ ihe mere eme, anyị na-ahụkwa na ọtụtụ n'ime ndị dike lụrụ ọgụ ma chụọ àjà iji kwụsị ịgba ohu nwere mkpalite na obi ike ịme nke a site n'okwukwe ha na Akwụkwọ Nsọ. Chineke gbanwere obi ha, ha wee gbanwee ụwa ha.
N'ilaghachi azu na Ndị Kọlọsi, amaokwu nke abụọ:
"Rukpụọnụ onwe unu n’ekpere, na-eche nche, jupụtakwa n'ekele."
Nke ahụ bụ nke na-enye anyị omume ọhụrụ anyị: ekpere. Guo Akwụkwọ Nsọ gị na kpee ekpere ụbọchị niile ọ bụla. Ọzọ, ọ bụghị ihe e rutere. Ọ bụ ihe a ga-erute. Ekpere dị ịtụnanya. Anyị nwere ike ịkwuru Chineke okwu - Onye Okike nke eluigwe na ala - n'enweghị mgbochi. Pọl sị "Rukpụnye onwe gị" na ya. Mee ya ihe kacha mkpa.
Gịnị ka i ga-ekpe ekpere maka ya? Ihe niile. Ihe ị chọrọ, ihe ị di-ekele maka ya, ihe ị na-eche ma ọ bụ ihe n'agbagwoju gị anya ma ọ bụ ihe ị na-atụ anya ya. Kpeere ndị mmadụ ekpere. Kpeere m ekpere! Ọ di m mkpa. Kpee ekpere - maka - ihe niile.
Chee echiche banyere ya. Mkparita ụka dị mkpa maka mmekọrịta ọ bụla. Ikwu okwu bụ otu anyị ga-esi amata ibe anyị. Ihe di ukwu banyere njem a na-ejekọọnụ bụ oge ikwu okwu, ịkpughe ịme onwe, ntolite miri emi. Otú ahụ ka ọ dịkwa na Chineke. Ka anyị na-eso Jizọs, anyị na-ekwu okwu n’ụzọ. Anyị na-akparita ụka ka anyị n'aga. Anyị adighị ezo ihe ọbụla, anyị na-ekerịta olileanya na ụjọ anyị. Anyi na-emeghe ụzọ wee kwe ka Jizọs bata.
Chee echiche banyere ekpere dị ka mkparita ụka gị na ezigbo enyi gị. Mgbe ọ na-adịghị mma, ọ bụ naani maka inweta ihe ị chọrọ. Mgbe ọ dị mma, ọ bụ maka gị na enyi gi ịmara onwe unu. Ekpere abụghị ihe omume ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ edemede a na-enye akara ule, ya mere echegbula onwe gị maka ikpe ekpere "n'ụzọ ziri ezi." Naanị abụla onye aghụghọ. Ji obi umeala na nkwanye ùgwù bịaruo ocheeze Chineke nso - Ọ bụ Chineke; atukwala ujo ka ị na-abia - Jizọs mere ka gị na Chineke di n'nma. Ndị Rom isi iri na abụọ na-ekwukwa ka “anyi nọgidesie ike n’ekpere” - dị ka ọkpụkpọ ekwentị nke na-enweghị ngwucha.
Ka e kwụchara ihe ndị a, akụkụ Ndị Kọlọsi ndị fọdụrụnu bụ ekele. Cheta, nke a bụ akwụkwọ ozi a hụru anya ndị dị adị deere onwe ha. Ndị a hụkwara onwe ha n’anya! Ya mere, ha jiri zipụ ekele. Ihe nke a gbasara Akwụkwọ Nsọ na-amasị m. Ọ di nkeonwe. Chineke gaara itụ okwu Ya kpọmkwem na nkume, ma Ọ họọrọ ibu ụzọ dee ya n’obi ndị mmadu nwere ịhụnanya. Ma ịhụnanya ahu n'esi n'ebe edere ya nwupụta.
Ọ na-ebute anyị na otu ihe omume ọzọ: mkpakọrịta. Wepụta oge ka gị na Ndị Kraịst ndị ọzọ nọkọọ. Gị na ha mee ngwụba n'ime ndụ. Hụ Chineke n'anya nahụ ndị ọzọ n'anya. Ndị Hibru na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịhapụ nnọkọ ezinụlọ anyị nke Ndị Kraịst - bụ ndị ụka.
Ka a n'ekwu, okwu akporo ụka dị n'ime Akwụkwọ Nsọ abụghị ụlọ, ọ bụ ndị na-eso Jizọs. Ụka nwere ike izute na ụlọ ewuru ewu, ma ọ bụrụ na anyị adịghị ejikọ-ọnụ n'ụzọ dị ire, anyị na-efu ihe bụ isi. Ka ị na-agụ isi nke ano, leba anya n'aha ndị a na-akpọ - ndị na-elekota ndị ọzọ n'ụzọ chiri anya - Mak, Jọstus, Epafras, Luk, Nimfa, na rịba ama,
“...ụka dị n’ụlọ ya” (4:15).
Oge ahụ, ụka na-ezukọ n'ụlọ ndị mmadu - dịka ezinụlọ.
Ya mere ihe ndị ahu bụ isi: hụ Chineke n'anya na hụ ndị ọzọ n'anya. Iji mee nke ahụ, malite omume ikpe ekpere: mara Chineke. Na malite omume mkpakọrịta: mata ndị ọzọ. Ị nwere ike ikpọ onye nọ n'ebe ọrụ gị ma ọ bụ n'ụlọ akwụkwọ gị ka gị na ya soro atụmatụ a, gị na ya mee mkparịta ụka n'ajụjụ ndị di n'atụmatụ a, ma kpeekọ ekpere ọnụ. Nke ahụ bụ ihe àgwà nke Akwụkwọ Nsọ, ihe àgwà nke ekpere, na ihe àgwà nke mkpakọrịta. Ọ diegwu. Nke ahụ bụ ihe dịgburu onwe ya n'mfe.
Ugbu a enyemaka ibido di gị mkpa, anyị ga-eleba anya n'ya echi. Maka taa, gụọ Ndị Kọlọsi isi nke ano, ma mee ya ka ọ dị mfe: hụ Chineke n’anya na hụrịta ibe gị n’anya.
Maka Ntughari & Mkparịta Ụka
- Gịnị mere i ji chee na ekpere dị mkpa iji soro Jizọs? Olee otú ekpere si emetụta ije gị na Chineke?
- Gịnị mere i ji chee na mkpakọrịta dị mkpa maka iso Jizọs? Olee otú mkpakọrịta gị na Ndị Kraịst ndị ọzọ si emetụta ije gị na Chineke?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More