Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Mak isi nke Mbụ | Soro m na ị bịaruole na Mmalite. Ọ bụrụ na ị ka na-amalite - ma ọ bụ ikekwe ị na-ebidoghari - n'iso Jizọs, ma ọ bụ na ị chọrọ imata banyere okwukwe, ị nọ n'ebe kwesịrị ekwesị.
Ya mere olee ebe anyị ga-amalite? Ka a na-ekwu, nye ndị na-eso ụzọ Ya, ihe nile malitere site n’okwu abụọ dị mfe sitere n’ọnụ Jizọs, “Soro M.” Ma njem di n'ihụ ga-agbanwe ihe niile.
Ya mere ebe ahụ ka anyị ga-amalitekwa: iso Jizọs. Atụmatụ anyị dị mfe. Anyị ga-agụ Akwụkwọ Nsọ abụọ. Nke mbụ, anyị ga-eso akụkọ Jizọs n’Oziọma Mak; ka anyị mesịrị nke a, anyị ga-ekwu banyere akụkọ anyị n'akwụkwọ Ndị Kọlọsi. Na Mak anyị ga-ahụ ihe iso Jizọs n’oge ahụ pụtara, na Ndị Kọlọsi, anyị ga-ahụ ihe iso Ya pụtara taa.
Akụkụ kacha mkpa na atụmatụ a bụ ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ, mana a ga m anọ ebe a ịnonyere gị na ikọwapụtara gị ihe ka anyị na-aga. A sị ka e kwuwe, njem n'aka nma mgbe e jekotara ya ọnụ. Kpọta enyi gị, ị ga-amakwa Jizọs ka ụnụ na-amata onwe ụnụ! Ị nwere ike ịgụ ihe n'onwe gị, gị na enyi gị e wee banye na nkwurịta banyere ya kwa ụbọchị - ma ọ bụ kwa izu. Ime nke a nwere ike ịbụ naanị mụ na gị.
Ọ dị nma, ka anyị wubanye. Taa, Mak isi nke Mbụ, malite n’amaokwu nke mbụ:
“Mmalite ozi ọma banyere Jizọs bụ Mezaịya, Ọkpara Chineke.”
Nke ahụ bụ okwu mmeghe tụrụ anya. Nke mbụ, ọ bụ ozi ọma, ozi ọma na-amasịkwa m. Ọ bụ maka Jizọs, bụ́ Mezaịya. Mezaịya pụtara “onye e tere mmanụ” - dị ka onye bụ isi, onye Chineke họọrọ. Jizọs bụ Ọkpara Chineke.
Amaokwu nke abụọ ji amụma e buru n’ọtụtụ narị afọ gara aga malite:
“A ga M ezite onye ozi M ga-ebu gị uzo gaa n'ihụ, onye ga-edozikwa ụzọ gị.”
Onye ozi Chineke bụ otu nwoke aha ya bụ Jọn, onye e zigara ikwusa ozi ọma na ịkwadebe obi ndị mmadu maka Jizọs. Olee otú ọ si kwadebe obi ha? Ka a na-ekwu, amaokwu nke ano si na ọ ziri ozi ọma nke bụ “baptizim nke nchegharị maka mgbaghara nke mmehie.” Nchegharị bụ isi. Icheharị bụ ịgbanwe uche gị ma gbanwee ebe ị cheere ihụ n'ndụ. Ghọta, "Ihe m mere adịghị nma," ma hapụ ya ka ị soro ntuziaka ọhụrụ. Ya mere, ndị mmadụ si n’ebe dị anya bịa ka ha nụ Jọn, ichegharị, na ka e mee ha baptizim.
Nke a dị mkpa karicha. Nzọụkwụ mbụ iso Jizọs bụ ịgbanwe ebe ị cheere ihụ n'aga n'ndụ. Kwupụta ajọ omume ị meworo, si na ya pụọ, tụgharịa gakwuru Jizọs. Jọn ji mmiri mee baptizim dị ka ihe ịrịba ama nke nchegharị, ma ọ gwakwara ha na Jizọs na-abịa, “Ọ ga-ejikwa Mmụọ Nsọ mee ụnụ baptizim.”
Ka e mesiri, n’amaokwu nke itolu, Jizọs si Nazaret bịa, Jọn wee mee Ya baptizim. Mana baptizim e mere Jizọs dị iche. Mmụọ Nsọ dakwasịri Ya dị ka nduru, na n'amaokwu nke iri na otu:
““Otu olu si n’eluigwe bịa: ‘Ị bụ Ọkpara M, onye M hụrụ n’anya; obi dị M ụtọ na Gị.’”
E nwere ọtụtụ ihe a ga-ahụ ebe a, mana achọrọ m ka ị gụọ n’onwe gị. Otú ahụ ka nke a si arụ ọrụ. A ga m elekwasị anya na nnukwu ihe dị mkpa, ma gị a gụọ nkọwa dị na ya. Amaokwu nke iri na ano:
“Mgbe a tụsịrị Jọn n’ụlọ mkpọrọ, Jizọs gara n'ime Galili, na-ekwusa ozi ọma Chineke. ‘Oge ahụ eruwo,’ ka Ọ kwuru. ‘Alaeze Chineke abịaruwo nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ ozi ọma a!’”
Jizọs ji ozi bịa: Alaeze Chineke - ebe Chineke na-achị dị ka Eze - dị nso. Ọ dị nso, ebe n'adịghị anya. Ọ kpọkwara ndị mmadụ ka ha chegharịa - ka ha chigharịa na mmehie ha - ma kwere n'ozi ọma Ya.
Mana ọ bụrụ na Alaeze ahụ dị nso, olee otú ha ga-esi ruo ya? Amaokwu nke iri na isii:
“Ka Jizọs na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili, Ọ hụrụ Saịmọn na Andru nwanne ya ka ha na-atụba ụgbụ n’ime ọdọ ahụ, n’ihi na ha bụ ndị ọkụ azụ̀. ‘Bịa, soro M,’ ka Jizọs kwuru, ‘A ga M ezipụkwa ụnụ ka ụnụ gaa n'akụta ndị mmadụ di ka azụ.’”
Lee Anya. Ihe ga-enyere gị aka irute Alaeze Chineke dị n’okwu obere abụọ: soro Jizọs.
Amaokwu nke iri na asato:
“Ozugbo ha hapụrụ ụgbụ ha wee soro Ya.”
Lekwaa anya na ha hapụru ihe ka ha wee soro Ya. Jizọs gara n’ihu wee hụ Jems na Jọn (Jọn a dị iche), ha onwe ha hapụkwara ihe ha nwere wee soro Jizọs.
A na m eche mgbe ụfọdụ ma ndị na-eso ụzọ Ya ha maara na ndụ ha na-aga ịgbanwe, ma ọ bụ na ụwa dum ga-agbanwe. Amaghị m ole na ole ha ghọtara oge ahụ, mana ha tụkwasịrị Jizọs obi zuru ezu iji mee nzọụkwụ nke mbụ ha.
Ya mere ka anyị soro ha mee otu ha mere. Gụọ Mak isi nke Mbụ. Lee ikike Jizọs ka Ọ na-achụpụ ajo mmụọ. Nwee mmetụta obi ebere Ya ka Ọ na-agwọ ndị ọrịa. Nụrụ amamihe Ya ka Ọ na-akuzi ihe. Na ka ị na-agụ, ghọta na Jizọs adịghị akpọ anyị òkù ka anyị kwere nanị otu ihe ndị bụ́ eziokwu ma ọ bụ tụgharịa uche n'ihe ụfọdụ nkà ihe ọmụma. Ọ naghịkwa akpọ anyị òkù ịsonye otu. Ọ na-akpọ anyị òkù ka anyị soro Ya na njem. Ọ na-akpọ anyị òkù iso Ya.
Maka Ntụle & Mkparịta Ụka:
- Gịnị ka i chere Jizọs na-ekwu mgbe Ọ sịrị, “Soro M”? Olee otú nke ahụ si dị iche n’ịsị “gee M ntị” ma ọ bụ “kweere M”?
- Olee n'ime okwu ndị a i chere kacha akọwa ihe ịbụ Onye Kraịst pụtara: okpukperechi, okwukwe, nkà ihe ọmụma, iwu, njem, mmekọrịta? Gịnị kpatara ị jiri chee otu a?
- Olee otú ị si mata gbasara Jizọs? Kekọrịta akụkọ gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More