Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Mak 12-13 | Maka Ịhụnanya Chineke
Nnọọ nụ onye ọ bụla. Taa, anyị na-atụle isiokwu abụọ dị nnọọ iche: ihu abụọ nke okpukpere chi na ịhụnanya n'enweghị atụ. Ọdịiche dị n'etiti ha abụọ dị ịrịba ama taa dị ka ọ dịbu. Ịdị ihu abụọ n'okpukpere chi n'eji isọ oyi achụpụ anyị n'okpukpe - ma ịhụnanya pụrụ iche nke Chineke na-akpọghachi anyị azụ. Oleekwanụ otú anyị ga-esi mee ka nkewa dị otú ahụ dịghachi ná mma?
N'ebe a na ozi-ọma Mak, ọ bụ oke nkewa ahụ na-ebute akụkọ anyị ngwa ngwa n'isi. Anyị anọwo na-eso akụkọ Jizọs otu izu ugbu a, ma nye ndị na-eso ụzọ Ya, afọ atọ agafeela, Mak Isi Nke Iri na Abụọ na-akpọta anyị n’izu ikpeazụ nke ndụ Jizọs. Ebe a na-eme ya bụ Jeruselem, nnukwu ìgwè mmadụ esiwokwa n’Izrel dum gbakọta ime ememe Ngabiga.
Ngabiga bụ ememe okpukpere chi, ndị Juu ji echeta otú Chineke si napụta ha n’ohu ma napụta ha n’ọnwụ site n’ọbara nwa atụrụ. Ugbu a, mara nnọọ na obodo juru n'ọnụ maka ememe, na onye ọ bụla na-ekwu banyere Jizọs. N'agbanyeghị nke ahụ, echiche ndị e nwere banyere Jizọs kewara ekewa. Ọrụ ebube na ozizi Ya na-atụ ọtụtụ n’anya, mana ndị ndú okpukpe n'ewe iwe. Ha n'eleda ọmịiko Jizọs anya - ha apụghị ịghọta ịhụnanya Ọ nwere n’ebe ndị mmehie nọ.
Olee otú o si bụrụ na ụfọdụ ndị nwere ike ịdị ka ndị raara onwe ha nye Chineke ma bụrụ ndị na-enweghị ịhụnanya ma ọlị? Ha mụrụ iwu Chineke, ma ha aghọtachaghị isi ihe ha mụrụ. Jizọs kpọrọ ha ndị ihu abụọ, ndị na-eji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ Chineke mana obi ha nọ n’ebe dị anya (Mak 7:6). Mgbe Jizọs rutere ná mmalite izu ahụ, Ọ chọpụtara na ha agbanweela Ememe Ngabiga ka ọ bụrụ otu ohere ọzọ ha ga-esi nara ndị mmadụ ego.
Nye m, esemokwu nọ ebe a na-ewepụta oke nkewa dị n'omume Ndị Kraịst ruo taa. Jizọs nyere anyị iwu ka anyị hụ n'anya. E kwesịrị iji ịhụnanya mara Ndị Kraịst. N'agbanyeghị nke a, a na-ama anyị ofuma maka ikpe ikpe, ihu abụọ na-enweghị ọmịiko. Anyị yiri ndị ahụ Jizọs kwuru okwu megide. O kwesịghị ịdị otu ahụ.
Maka ndị ndú okpukpe, Jizọs kpughepụrụ anyaukwu na mpako ha ugboro ugboro, ma ugbu a, ha na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Ya. N'isi iri na abụọ, ha ji ọtụtụ ajụjụ maa Jizọs aka. Ha nyoro onyinyo banyere ikike Jizọs, ma gbalịa iji ụfọdụ iwu Chineke megide Ya n'ụzọ aghụghọ. Ihe na-atụ n'anya n'ihe a nile bụ na ndị ikom a bụ́ ndị raara onwe ha nye nke ukwuu n'ime ọbụnadị ihe ntakịrị nke iwu Chineke, tụfuru ihe bụ isi n'ime iwu ahụ.
Otú ọ dị, e nwere onye na-adịghị ka ndị ọzọ. Lee amaokwu nke iri abụọ na asatọ:
"Otu n’ime ndị nkuzi iwu bịara nụrụ ka ha na-arụ ụka ebe. Ọ hụrụ na Jizọs zara ha nke ọma, ọ jụrụ Ya sị: “N’ime ihe niile e nyere n’iwu, olee nke kachasị mkpa?'"
Nnukwu ajụjụ.
“‘Nke kachasị dị mkpa,’ ka Jizọs zara, bụ nke a: ‘Nụrụ, Izrel: Onye-nwe-anyị Chineke anyị, Onye-nwe-anyị bụ otu. Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum na ike gị dum hụ Onye-nwe-anyị bụ́ Chineke gị n’anya’” (Mak 12:29-30).
Ya bụ na iwu kachasị malitere site na ncheta na Onye-nwe-anyị bụ otu. Ugbu a Akwụkwọ Nsọ na-akụzi na Nna bụ Chineke, Jizọs bụ Chineke, na Mmụọ Nsọ bụ Chineke. Ma Ha atọ dị n'otu dị ka otu Chi. Iwu e nyekwara bụ iji ịhe niile hụ Chineke n'anya! Jizọs gara n'ihu:
"Nke abụọ bụ nke a: "Hụ onye agbata obi gị n'anya dị ka onwe gị." Ọ dịghị iwu karịrị ndị a" (Mak 12:31).
Ya bụ na a chịkọtara iwu niile n’ịhụnanya. Uche Chineke maka anyị karịrị akwụkwọ iwu. Ọ bụ ịhụnanya: hụ Chineke n'anya, hụ ndị ọzọ n'anya. Amaokwu nke iri atọ na abụọ:
“‘I kwuru nke ọma, onye nkuzi,’ nwoke ahụ zara. 'I kwuru eziokwu’…”
Ihe itunanya. N'oké osimiri nke ndị ihu abụọ, otu nwoke jụrụ ajụjụ ziri ezi, were azịza ọ nụrụ tinye n'obi ya. Ọ gosiri na ọ dị umeala n’obi, ma mgbe Jizọs hụrụ amamihe nwoke ahụ, O sịrị ya: “Ị nọghị n’ebe dị anya iji rute alaeze Chineke."
Ugbu a lelee ọdịiche a. Ndị ihu abụọ ahụ n'ekwu maka iwu mana obi ha di anya n'ebe Chineke nọ. Mana nwoke a bịakwutere nso alaeze Chineke mgbe ọ ghọtara na ịhụnanya bụ isi obi nke iwu. Hụ Chineke n'anya ma hụ ndị ọzọ n'anya.
Ịhụnanya Jizọs kpọrọ anyị ime bụ nke mgbanwe. Ihụ onye agbata obi anyị n'anya, ihụ ndị mmehie n'anya, ihụ ndị iro anyị n'anya. Ịhụ n'anya n'ụzọ na-enweghị atụ - jiri amara a na-apụghị ịghọta na oke ebere. Ọrụ anyị kacha ukwuu nye Chineke abaghị uru ma bụrụ ihe efu ma ọ bụrụ na anyị ahụghị n'anya (1 Ndị Kọrịnt 13:1-3).
Ma ebe a ka anyị ga-ahụ akụkụ ọzọ nke akụkọ Ndị Kraịst. Ndị na-adịghị egosi ikpe ikpe, kama ha n'egosi ọmịiko. Ndị na-eme omume kacha ịtụnanya nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n'anya nke a na-apụghị ichetụ n'echiche - ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ilekọta ndị ikpeazụ na ndị nta na ndị agupụrụ agụpụ - n'agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ nkwenkwe ma ọ bụ okpukpe ma ọ bụ etu esiri kee ha ma ọ bụ ụdị mmekọahụ ha n'enwe ma ọ bụ ihe ọbụla. Ha na-atọgbọ ndụ ha. Ndị a na-eju m anya. Ha n'ahụ nnọọ... n'anya.
Ana m ekpe ekpere ka ị nweta ngọzi ịmata ụfọdụ n’ime ndị ahụ. Ana m ekpekwa ekpere karịa na anyị ga- abụ ndị ahụ. Oleekwanụ ebe anyị pụrụ ịmụta ụdị ịhụnanya a n'ụwa? Nọgide na-eso Jizọs, anyị ga-achọpụtakwa n’oge na-adịghị anya.
Maka Ntughari & Mkparịta Ụka
- Gịnị ka Jizọs kwuru bụ iwu abụọ kachasị dị mkpa? (amaokwu nke 29-31). Gịnị mere i ji chee na ha abụọ dị ezigbo mkpa?
- Ị̀ ma ndị na-elekwasị anya n'iwu Chineke ma funahu ọbi nke ịhụnanya Chineke? Kedu ka i si chee nke ahụ si eme?
- Ị̀ ma ndị na-egosi ịhụnanya n'enweghị atụ nke Chineke n'ụzọ ahụrụ anya na nke dị irè? Kekọrịta akụkọ ha.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More