Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Ndị Kọlọsi 4:17 | Mechaa Ihe Ị Malitere
Ndewo ndị enyi m. Taa bụ ụbọchị ikpeazụ anyị. Ị mere nke ọma! Ị mechara ihe ị malitere - nke ahụ bụ ezigbo akara àgwà. Ọ bụ ikwu ya ka o dị. Ma eleghị anya ị na-eche - gịnị na-esote? Ya mere taa, anyị ga-enyocha ihe anyị mụtara, ma hazie nzọụkwụ ọzọ ị ga-eme.
E nwere amaokwu nke di n'ngwucha nke Ndị Kọlọsi dabara nke oma. Amaokwu nke 17:
"Gwa Akipọs: Hụ na i jezuru ozi ị natara n'ime Onye-nwe-anyị."
Nke a di nma ileba anya. Anyị amaghị Akipọs, anyị amaghịkwa ozi ya. Mana anyị maara na ọ dị mkpa. Otu onye dị Chineke mkpa nke ukwuu, na òkù Chineke na ndụ otu onye bara nnukwu uru nye ụwa ha. Ya mere Pọl jiri gwa ya, "jezuo ozi ahụ." Mechaa ihe ị malitere.
Nke ahụ bụkwa ozi m maka gị. Amaghị m gị n’onwe m, ma a maara m na ị dị Chineke mkpa, a makwaara m na ozi gị ga-eme ịhe di iche. Ị nwere nzube na ọkpụkpọ - ya mere rụchaa ọrụ ahụ. Nke mbụ, ka anyị mee nyocha.
Njem anyị ji okwu abụọ dị mfe malite: "Soro m." Nke ahụ bụkwa akụkọ anyị site na mmalite ruo ọgwụgwụ - iso Jizọs. Ka anyị na-aga, anyị hụrụ ka Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, mee ka oké ifufe ahụ dajụọ, gbaghara ndị mmehie jọgburu onwe ha ma weghachita ndị mmadụ n’ezie. Na ndị ụmụ azu Ya sokwa n'arụ ọrụ ahụ, gị onwe gị sokwa.
Na Mak 8, Jizọs kpọrọ ụmụ azu Ya ka ha kwenye:
"“Onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ M ga-ajụ onwe ya ma were obe ya soro M" (Mak 8:34).
Ndị ụmụ azu Ya wee soro Ya. Anyị na nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya, mụtara na iso Jizọs pụtara ịhapụ arụsị dị ka ego na nganga. Anyị mụtara iwu Chineke kachanụ: hụ Chineke n’anya na hụ onye agbata obi gị n’anya. Nke kachanụ, bụ na anyị mụtara otú Chineke si hụbiga anyị n'anya. Jizọs nyere ndụ Ya ka Ọ wee zọpụta anyị.
Ma cheta - anyị anaghị enweta ya site n'ike aka anyị. Anyị anaghị akwụ ụgwọ maka mmehie anyị, anyị anaghịkwa eme onwe anyị ka anyị di nma. Jizọs nwụrụ iji kwụọ ụgwọ zuru ezu, Ọ wee bilie ọzọ inye anyị ndụ ọhụrụ. Amara. Ọrụ anyị bụ ibi ndụ kwesịrị nke ọkpụkpọ Ya.
Nke ahụ na-ewega anyị ru Ndị Kọlọsi. Olee otú anyị si ebi yabụ ndu? Okwu abụọ dị mfe: soro Jizọs. Naanị ugbu a kama ịgbaso nzọụkwụ, ị nwere Kraịst n'ime gị. Ugbu a Mmụọ Nsọ na-eduzi gị ka i na-ebi ndụ, ka ị na-ewepụ onwe ochie gị ma yikwasị nke ọhụrụ.
Mmụọ Nsọ na-enyekwa gị omume di ọhụrụ. Cheta - ihe ndị a abụghị ihe e kwesịrị inwete, ha bụ ihe ndị a ga-erute. Ha bụkwa nnukwu ebe ịmalite nzọụkwụ gị ndi n'esote:
Malite àgwà nke Akwụkwọ Nsọ. Wepụta oge kwa ụbọchị iji sapee Akwụkwọ Nsọ gị ma gụọ ya. Anyị nwere usoro ihe ndị ọgụgụ di ezigbo nma ebe a na ngwa Akwụkwọ Nsọ iji mee ka ị na-aga n'ihu, na atụmatụ ndị na-enye agụmagụ n'otu akwụkwọ nke Akwụkwọ Nsọ n'otu oge bụ ndị na-amasị m karịsịa. Ma ọ bụ ị nwere ike ịmalite atụmatụ a ọzọ. Oge ugbu a kpọọ enyi gị ka ọ sonyere gị. Nke ahụ bụ nke na-eduga m ru…
Malite omume mkpakọrịta. Gị na ndị kwere ekwe ndị ọzọ mee njikọ. A kpọrọ anyị ka anyị hụ n'anya, nke ahụ bụ nke n'akpata idi mkpa ka anyi weputa oge nọkọọ ọnụ. Nke ahụ bụ ihe ụka bụ maka. Cheta, ụka abụghị ihe ngosi nke ị ga na-ekiri, ọ bụ nke mkpakọrịta. Ya mere tinye aka. Di ezi na nke onwe, kesaa otu obi gị di, kwupụta mmehie gị, kpekọ ekpere ọnụ na nweta ọgwụgwọ. Ma ọ bụ ọmarịcha ebe ị…
Malite omume ije ozi. Nke ahụ bụ ozi. Chọọ ohere iji nyere ndị ọzọ aka n'ụzọ ndị dị mfe. Otu nnukwu ụzọ isi nye aka bụ…
Malite omume ekpere. Cheta na ekpere abụghị maka inweta ihe ị chọrọ, kama ọ bụ maka ịbịaru Chineke nso. Ya mere, meghee, kesaa obi gị, mkpa gị, ma kpekwaara ndị ọzọ ekpere.
A ga-enwekwa àgwà ọhụrụ ndị ọzọ: nkwupụta omume, imeta ndị n'eso ụzọ Kraịst omume. Mana ọ bụrụ na nke a amalite ịdị ka ndepụta ihe a ga-eme, jiri ya nwayọ. Cheta - ọ bụghị ịgbaso iwu, ọ bụ iso Jizọs. Ya mere mee ya ka ọ dị mfe, lekwasị anya na Ya, ma kwee ka Mmụọ Nsọ duzie gị.
Chetakwa na a naghị eme gị ka i ghara inwe oyiyi pụrụ iche n'ebe ndi ọzọ n'eso uzo Kraist nọ. E si n'ime n'agbanwe gị pụta ìhè - n'emeghari gị n'ime oyiyi nke Chineke nke ị kwesịrị ịbụ. Dịka ọmụmaatụ: otu n'ime àgwà ọhụrụ gị ga-abụ inye ihe. Ma ị naghị enye ego iji nweta akara ezi omume na Chineke. Ị na-enye n'ihi na Chineke bụ Onye na-enye ihe, ị na-amụtakwa imesapụ aka ka Ya.
Ya mere, oge eruwo ịmalite. E nwere njem ihe itu anya di n'ihu. E nwere njem na ndụ na njem site na Akwụkwọ Nsọ. Chineke nwere ọrụ maka gị, ya mere rụchaa ihe ị malitere. Mana ọ bụghị ọrụ gị naanị, ọ bụ ọrụ Ya, na:
"Onye malitere ezi ọrụ n’ime unu ga-arụzu ya" (Ndị Filipaị 1:6).
Nke a abụghị naanị ka ị rụchaa ọrụ gị, ọ bụ ka Chineke rụchaa ọrụ Ya n’ime gị. Ya mere, lekwasị anya n’ebe Jizọs nọ, bụ “Onye ọsụ ụzọ na Onye mmezi zuru okè” nke okwukwe gị (Ndị Hibru 12:2). Ọ malitere nke a - Ọ ga-emecha ya. Chetakwa na ọ dịghị mgbe naanị gị nọ. Ọ gaghị ahapụ gị ma ọ bụ gbahapụ gi ma ọlị (Ndị Hibru 13:5). Okwu ikpeazụ Jizọs gwara ndị ụmụ azu Ya n’ozi ọma Matiu bụ:
"N’ezie, a nọnyeere M unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ nke oge a" (Matiu 28:20).
Maka Ntụleghachi na Mkparịta Uka
- Kedu ihe nkebi ahịrịokwu "Mechaa ihe ị malitere" pụtara na ndụ gị?
- Ndị Filipaị 1:6 na-agwa anyị na “Onye ahu malitere ezi ọrụ n’ime unu ga-arụzu ya.” Kedu ihe nke ahụ pụtara nye gị?
- Nduzi nke taa nyere aro maka nzọụkwụ gị ndi ọzọ. Kedu ihe ị na-atụ ime ọzọ?
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More