Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 4 NKE 15

Mak 6-7 | E Zipụrụ Iga Ozi

Anyị nọ na Mak Isi Nke Isii taa, na oge eruola ịbanye n'ihe ana eme. Ọ dịghị mgbe e bu n'obi na-iso Jizọs bụ ihe a na-ekiri ma ndị ọzọ a n'aru ya bụ ọrụ, ndị na-eso ụzọ Ya ga-enwetakwa oge ha ga-eji rụọ ọrụ.

Nke a gbasakwara gị. Ọ bụrụ na ị na-eso Jizọs, a kpọkwara gị ije ozi, ọ dịghị onye e wezụgara. Ugbu a ọ bụrụ na ị bụghị onye kwere ekwe, ọkpụkpo òkù ahụ ghekwara oghe n'ebe ịnọ. Ma buru n'uche, a naghị akpọ gị òkù ịbanye na ụlọ ọrụ, a na-akpọ gị òkù ka ịbanye na mmegharị.

Gịnị ka nke ahụ pụtara nye ndị ụmụ azụ Jizọs? Ha ga-achọpụta ugbu a. Mak Isi Nke Isii, amaokwu nke asaa:

“Mgbe Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ ka ha bịakwute Ya, Ọ malitere izipu ha abụọ abụọ wee nye ha ikike n’ebe ndị mmụọ na-adịghị ọcha nọ.”

Rịba ama na Jizọs na-ezipụ ha. Ozi nke ozi ọma anaghị eche ka ndị mmadụ bịakwute ya, ọ na-apụ gawa ebe mkpa dị. Jizọs zipụkwara ha n'ụzọ abụọ abụọ - ozi nke ozi ọma bụ ọrụ nke mmadụ na ibe ya n'aru. Ọ nyekwara ha ikike - ikike nke Chineke - ịga.

O wee nye ha ntụziaka. Amaokwu nke asatọ:

“Ejila ihe ọ bụla maka njem unu ma e wezụga mkpara - ejila achịcha, ejila akpa, ya enwekwala ego ọbụla dị n'akpa ego unu.”

Ya bụ na ozi mbụ ha bụ nkuzi n’okwukwe. Ha enweghị ihe ọbụla iji leta onwe ha - naanị okwukwe. N'agbanyeghị nke a, ntuziaka a na-enye abụghị otu ihe oge ọ bụla. Ka e mesịrị, Jizọs ga-ezipụ ha n’ozi ọzọ nke ha ji ihe ndị ha ji eleta onwe ha. Ozi abụghị usoro ma ọ bụ uzommeputa, ọ bụ njem a na-amaghị ihe ndị aga ahụ ma ọbụ zute n'ya, na ezigbo ihe njikwa bụ ịnweta ntụziaka gị n'aka Onye-nwe-anyị oge ọ bụla. Ịgbaso Jizọs pụtara ịgbaso ntụziaka, tụkwasịkwa Chineke obi mgbe niile. Ma ị gba aka efu ma ọ bụ ihe inwere ọ zuru ezu, tụkwasị obi na Chineke ga-enye ihe niile ị chọrọ.

Yabụ kedu ka ọ si gaa? Amaokwu nke iri na abụọ:

“Ha gara kwusaa ozi ọma ka ndị mmadụ chegharịa. Ha chụpụrụ ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ ma were mmanụ tee ọtụtụ ndị ọrịa ma gwọọ ha.”

Ya bụ na ha mere ya! Ha tụkwasịrị obi, Chineke wee nye ha ihe ha chọrọ. Ha laghachiri n’ebe Jizọs nọ ịkọrọ Ya akụkọ ka ha sịrị gaa, ma n’oge na-adịghị anya, ìgwè mmadụ gbakọtara, na n’amaokwu nke iri atọ na otu, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya,

“Soronụ M naanị unu gaa n’ebe dị jụụ ka unu wee zuru ike.”

Iwu ozi dị mkpa ebe a: zuru ike na Jizọs. Ya mere ha rutere n'otu ebe dịpụrụ adịpụ, ma ìgwè mmadụ ahụ bu ha ụzọ rute ebe ahụ! Ndo nụ ụmụ azụ Jizọs - enweghị ezumike oge a. Amaokwu nke iri atọ na anọ:

“Mgbe Jizọs rutere n'ebe ahụ wee hụ nnukwu ìgwè mmadụ, Ọ nwere ọmịiko maka ha.”

Oke ọmịiko Jizọs nwere na-eju m anya mgbe niile. Ọmịiko pụtara “iso taa ahụhụ” - ma Jizọs mekwara otú ahụ. Ọ hụrụ mkpa ndị mmadụ Ọ wee baa Ya n'obi. Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ Ya ka ha chee banyere ha.

A sị ka e kwuwa, Jizọs kụziri nkụzi tutuu anyanwụ wee daa. Ọtụtụ ndị mmadụ - bụ ndị sicha ebe dị anya - iri nri dị ha oké mkpa. Ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara Jizọs ka Ọ zilaa ha niile. Nke a bụ ụka ezi uche. Amaokwu nke ịrị atọ na asaa:

“Mana Jizọs zara si, Unu nye ha ihe ka ha rie.’”

Lezie anya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ mkpa dị, Jizọs e wee gwa ha ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ nri. Mana e nweghị nri ga-ezu ha. Ọ rughị! Ọ bụkwanụ n'etiti ebe a na-amaghị.

Ma cheta ihe ha mụtara ugbu ugbu a: ma a gba aka efu ma akpa ọ jụrụ eju, tụkwasị obi na Chineke ga-enye. Amaokwu nke iri atọ na asatọ:

“‘Achịcha ole ka unu nwere?’” O jụrụ. ‘Gaa nụ lee.’ Mgbe ha chọpụtara, ha siri, ‘Achịcha ise - na azụ abụọ.’”

Nke ahụ bụ achịcha na azụ maka nanị mmadụ ole na ole, ọ bụghị maka puku mmadụ. Mana lelee anya nke ọma. Ha gwara ndị mmadụ ka ha nọdụ ala, na n’amaokwu nke iri anọ na otu,

“O werele ogbe achicha ise na azù abụọ ahu, lelie anya n'elu-igwe, nye ekele, wee nyawa ogbe achịcha ndị ahu. O wee were ha nye ndị na-eso ụzọ Ya ka ha kesaara ndị mmadụ.”

Jide ebe ahụ. Kwụsịtụ n'akụkọ a na-akọ ma lee anya nke ọma. Jizọs nyere ekele, nyawaa ogbe achicha ndị ahu, ma nye ndị n'ēso ụzọ Ya - ole ole?

Zọbanye ụkwụ na akpụkpọ ụkwụ ha. Lee anya n'aka gị - ọkara otu ogbe achịcha ma eleghị anya, na obere azụ. Welie anya gị - ọtụtụ narị mmadụ. Mana Jizọs sịrị ka e nye ha nri, ya mere gị wee nye ha nri. Amaokwu nke Iri anọ na abụọ:

“Ha niile riri wee rijuo afọ, ndị ụmụ azụ Jizọs wee tutu juo nkata iri na abụọ jupụtara na iberibe achịcha na azụ. Ọnụ ọgụgụ ndị ikom ndị riri nri bụ puku ise.”

Nke ahụ dị egwu. Ọ ka na-emekwa. Anụwo m ọtụtụ akụkọ site n’aka ndị enyi m nọ n’ozi banyere ogbe achịcha na azụ̀ mere n’ezie. Ọrụ enyemaka maka ajọ ifufe nke mere na South, inye ndị ogbenye nọ na Mexico nri, na ọtụtụ ndị ọzọ a gaghị agutanwu ọnụ. Mgbe ụfọdụ, gwongworo jupụtara na nri na ihe ndị a chọrọ n'esi ebe a na-amaghị pụta. Mgbe ụfọdụ, obere ihe ndị dị n'ụlọ na-anọgide ogologo oge karịa ka ha kwesịrị. Ọrụ ebube n'ezie - mana ha n'eme mgbe niile n'etiti imezu mkpa. Mgbe niile ka ha na-eme n'nje m ozi nke ọmịiko.

Ka ị na-agụ Mak Isi Nke Isii na Isi Nke Asaa, leba ezigbo anya n'ọrụ ebube Jizọs rụrụ. Ọ na-egosipụta ike Ya n'ụzọ nganga - ka Ọ na-egosipụta ọmịiko? Ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ Ya ka esi arụ ọrụ ebube, ka ọ bụ Ọ na-akụziri ha ka ha na-elekọta ma na-enye aka ọbụna mgbe mkpa dị karịrị nnọọ ihe ha pụrụ inye?

Amụtara m ogologo oge gara aga na ezughị m oké n'onwe m maka ije ozi nke ozi ọma. Mana ije ozi nke ozi ọma bụ ọkpụkpọ oku nke ihe karịrị onwe anyị, ihe anyị na-apụghị ime n'onwe anyị.

Kedụkwanu maka gị? Ị nwere ihe ọ na-ewe iji nyere ndị a niile aka? Ìsi mba? Mụ onwe m enweghịkwa. Mana Jizọs sịrị gawa, ya mere ka anyị gawa. Ma ị gba aka efu ma ọ bụ na ihe ị nwere ọ zuuru gị, tụkwasị Chineke obi… ma banye n'ihe a na-eme.

Maka Ntụle & Mkparịta Ụka:

  • Gịnị ka i chere Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ Ya mgbe Ọ zipụrụ ha n'ejighị ego? Gịnịkwanụ banyere mgbe Ọ gwara ha ka ha nye puku mmadụ ise nri ma nri a ga-enye ha ezughị ezu? Ihe mmụta ndị ahụ ha ka bara uru taa?
  • Gịnị bụ ahụmahụ gị n'ijere Chineke ozi na inyere ndị mmadụ aka? Kesaa akụkọ gị.
  • Ọ bụrụ na ị nwere ike imere Chineke ihe ọ bụla, gịnị ka ọ ga-abụ?
Igodo: ụbọchị_anọ ụbọchị_anọ

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org