Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Mak 8-9 | Onye Jizọs Bụ
Taa Mak Isi Nke Asatọ na ewega anyi n'isi ihe nke dị n'Iso Ụzọ Kraịst. Anyị anọwo na-eso Jizọs na ndị na-eso ụzọ Ya ruo ụfọdụ oge. Ha ahụwo ọrụ ebube Ya, nwee mmetụta ọmịiko Ya, nụkwa ozizi Ya. Ugbu a ọ bụ oge mkpebi. E nwere ajụjụ abụọ bụ́ isi n'ebe a: Ònye bụ Jizọs? Gịnịkwa ka ọ na-ewe iji soro Ya?
Anyị na-amalite n’amaokwu nke iri abụọ na asaa:
“Jizọs na ndị na-eso ụzọ Ya gara n’obodo nta ndị dị gburugburu Sizeria Filipaị. N’ụzọ Ọ jụrụ ha, ‘Ònye ka ndị mmadụ na-asị na M bụ?’”
Ajụjụ dị mfe. N'ezie, nke a bụ ebe anyị niile na-amalite mgbe anyị na-agbalị ịchọpụta ihe anyị kwenyere na ya. Anyị na-amalite site n'ihe anyị nụrụ n'ọnụ ndị ọzọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs zara azịza ole na ole ha nụworo: Ụfọdụ na-ekwu na Jizọs bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim a mụworo ọzọ, ma ọ bụ Elaịja, ma ọ bụ onye amụma.
Ma taa ndị mmadụ nwere ọtụtụ echiche banyere onye Jizọs bụ. Ndị Alakụba na-asọpụrụ Jizọs dị ka onye oké amụma nke Allah - onye n'enweghị mmehie na nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ. Ndị Juu dị nkewa n'echiche ha banyere onye Jizọs bụ - ụfọdụ na-ahụ Ya dịka ezigbo rabaị, ndị ọzọ na-ahụ Ya dịka onye jụrụ okwukwe nke ndị be ya, ebe ọtụtụ na-ahụ Ya dịka Mezaịya. Otụtụ ndị Hindu na-asọpụrụ Jizọs dị ka onye guru nye ndị Juu, ebe ọtụtụ ndị Buddha na-ele Jizọs anya dị ka onye nwere nghọta dị ukwuu. Ya bụ na e nwere ọtụtụ echiche banyere Jizọs - ọtụtụ n'ime ha bụkwa ezi echiche. Mana n’amaokwu nke iri abụọ na itoolu, Jizọs rụgidesiri ụka ahụ aka:
“‘Mana banyere unu?’ Ọ jụrụ. ‘Ònye ka unu na-asị na M bụ?’”
Nke a bụ ajụjụ bụ isi. Maka okwukwe ibụ ihe ọ bụla, ọ ga-abụrịrị nke-onwe. Ọ zughị ezu ịmara ihe ndị ọzọ na-ekwu. Ọ ga-esi n’uche gị pụta: Ònye ka ị na-asị na Jizọs bụ?
Oge mkpebi eruola, ma Pita mere nke ya:
“Pita zara si, ‘Ị bụ Mezaịya.’”
Nke a bụ oge maka nnukwu ihe. Mezaịya pụtara onye e tere mmanụ. Ọ bụ onye Chineke họọrọ imezu nkwa Ya na imezu oke atụmatụ Ya maka nzọpụta. Anyị ga-enyoba anya na nkwa na amụma Chineke n'ihe ọmụmụ anyị ọzọ. Maka ugbu a, ghọta na nkwuputa nke Pita bụ nkume ntọ-ala nye okwukwe. Ije ije anyị na Chineke na-ebido site n'onye anyị sị na Jizọs bụ.
Na n'amaokwu nke iri atọ na otu, Jizọs na-akụziri ha na Mezaịya...
“...ga-atariri ahụhụ banyere ọtụtụ ihe, na ndị okenye ga-ajụkwa Ya.”
Jizọs achọghị ka ọ ju ha anya mgbe ndị ndú ihu abụọ jụrụ onye Chineke họọrọ,
“...nakwa a ga-egburiri Ya, ma mgbe ụbọchị atọ gachara, Ọ ga-ebili.”
Ya mere, Jizọs gbara ihe niile n'anwụ. A ga-egbu Ya mana Ọ ga-ebili ọzọ. E buru amụma ihe dị otú a ruo ọtụtụ narị afọ, n’Aịsaịa Isi Nke Iri Ise Na Atọ, Abụ Ọma Isi Nke Iri Abụọ Na Abụọ, Zekaraịya Isi Nke Iri Na Abụọ. Ọ bụ atụmatụ Chineke. Ọnwụ n'obe na-abịa.
Ọ dị ụtọ n'uche, ọ bụ ọnwụ n'obe na-ekewa Jizọs nke Akwụkwọ Nsọ na ihe ndị ọzọ na-ekwu. Ndị Alakụba na-ajụ akụkọ nke obe; Ndị Hindu na-ekwu na Jizọs nwụrụ wee banye na Samadhi udo; ma maka ndị Buddha bụ ndị na-ekweghị na mmehie, akụkọ nke obe bụ nnọọ ihe mmegbu nke obi mgbuwa.
Na mbụ, Pita nwere mmeghachi omume yiri nke ahụ. Ọ kpọpụrụ Jizọs n’akụkụ ka ọ baara Ya mba. Mana Jizọs baara Pita mba maka iche echiche ka mmadụ, na ileghara ihe Chineke anya. Echiche mmadụ ga-azọpụta ezigbo mmadụ ka ọ ghara ịta ahụhụ, ma mee ka ndị ọjọọ nweta ihe kwesịịrị ha. Mana nke a abụghị maka Jizọs. Jizọs bịrị ndụ ezi omume, mana Ọ weere ọnwụ onye mmehie. Ọ weere ọnọdụ anyị.
Ka e mesịrị, n’amaokwu nke iri atọ na anọ, Jizọs kọwara ihe ọ ga-ewe iji bụrụ onye na-eso ụzọ Ya. Gụọ ya nke ọma:
“Onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ M ga-ajụ onwe ya ma bulie obe ya soro M.”
Ọ bụrụ na ị chọrọ iso Jizọs, buru amaokwu a n’isi. Nke a bụ ihe ọ na-ewe. Iji soro Jizọs, ị ga-:
Ajụriri onwe gị: Ị nweghị ike ịzọpụta onwe gị, ị nweghị ike ịdị mma dịzụọ ya oke. Jizọs dị gị mkpa.
Bulie obe gị: Onye Kraịst ọ bụla bu ibu, nke àjà. Ndụ agaghị emenyere gị nke ọma mgbe niile.
Ma soro Jizọs: Ebe ọ bụla Jizọs n'edu gị aga, gị onwe gị ga-esorokwa.
Iso Jizọs karịrị nkwenye, dị ka alụmdi na nwunye si karịa naanị mmetụta. Ọ bụ nkwa na-adịgide adịgide, ọgbụgba ndụ n’ime ọbara Ya. Amaokwu nke iri atọ na ise:
“N'ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya, mana onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya n'ihi Mụ na n'ihi ozi ọma ga-azọpụta ya. Ùrù gini ka ọ diiri madu irite uwa dum, ma tufuo mkpuru-obi-ya? Ma ọ bụ gịnị ka mmadụ pụrụ inye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya?”
Ahụrụ m amaokwu ahụ n'anya. Ị̀ ma ihe Jizọs na-ekwu? Ọ na-ekwu na mkpụrụ obi gị bara uru karịa ụwa niile. Ya mere hapụ ụwa, jidesie Jizọs ike. Nye Jizọs, mkpụrụ obi gị bụ ihe e kwesịrị ịnwụ maka ya. Kedụ uru ọ bara nye gị?
Na ndụ nke m, a lara m ọtụtụ afọ n'iyi n'ihi afọ ojuju m nwere ịhapụ okwukwe nye ndị ọzọ, “Ha kwenyere na nke a na nke ahụ.” Mana ụbọchị maka mkpebi bịarutere - maka okwukwe nke m. Enwere nnukwu ọdịiche dị n'etiti ikwere n'alụmdi na nwunye na idi ya adị. E nwekwara nnukwu ọdịiche dị n’etiti ikwere n'ihe banyere Jizọs na iso Jizọs. Ihe dị iche bụ ikwugide n'nkwa ị kwere na ibi ndụ gị dịka nchụ àjà. Na nkenke, ihe dị iche bụ ndụ gị. Ma ọ bara uru kwa sekọnd ọ bụla.
Gụọ Mak Isi Nke Asatọ, zaa ajụjụ ndị a na-ajụ taa. Ọ̀nye ka i si na Jizọs bụ, i di kwa njikere iso Ya?
Maka Ntụleghachi & Mkparịta Ụka:
- Ònye ka ị sị na Jizọs bụ?
- Gịnị ka ọ ga-ewe gị ka ị soro Jizọs? Dee amaokwu nke iri atọ na anọ n’okwu nke aka gị maka ndụ gị.
- Iso Jizọs ọ̀ bara uru? Dee amaokwu nke iri atọ na ise ruo amaokwu nke iri atọ na isii n’okwu nke aka gị maka ndụ gị.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More