Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 2 NKE 15

Mak 2-3 | Idi Mgbaghara & Idi Nhọrọ

Nnọọ-ghachi na Mmalite. Anyị nọ na Mak Isi Nke Abụọ taa, ya na otu akụkọ so ndị kacha amasị m. N'ime Akwụkwọ Nsọ, Jizọs kwuru ụfọdụ okwu di ka okwu nkwakọ - bụ nke zuru ezu ime ka e gbụọ Ya. Mana onye ọ bụla nwere ike ikwu na ọ bụ ihe ọ bụla. Ajụjụ di nu bụ - Jizọs Ọ na-egosi na Ya zuru ezu ikwu otu a? Na Mak 2, anyị hụrụ ka Jizọs na-akuzi ihe n'otu ụlọ dị na Kapaniọm, ozi wee zipu na Ọ na-eme otu a. Amaokwu nke abụọ:

“Ha gbakọtara jụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke pụtara na ọ dịghị ụlọ fọdụrụnu, ọbụna n’èzí ọnụ ụzọ, Ọ wee kwusaara ha Ozi Oma.”

Ya bụ na e nwere ìgwè mmadụ gbakoro ọnụ wee jụ ebe niile, Jizọs E wee na-ekwusa Ozi oma - nke ahụ bụ Akwụkwọ Nsọ. Jizọs na e lekwasịkarị anya n’Okwu Chineke mgbe nile. Ọ mekwara ihe iribama, mana Ọ kpọrọ ihe iribama ndị ahu ihe ntuzi, na ihe ntuzi na arutu aka banyere ihe ozo. Ihe omuma atu zuru ezu: akụkọ nke ụbọchị taa. Amaokwu nke ato:

“Ụfọdụ ndị ikom bịara, butere ya otu nwoke kpọnwụrụ akpọnwụ, nke ha anọ bu. Ebe ọ bụ na ha enweghị ike ịbịakwute Jizọs n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha mere oghere n'ihe mkpuchi ụlọ dị n’elu Jizọs site n'igwu n'ime ya ma budata ute ahụ nwoke ahụ dina na ya. Mgbe Jizọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị nwoke ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.’”

Cheregodi. Weghachite okwu ahụ azu. Ọ̀ sịrị, “A gbagharawo gị mmehie gị?” Nwoke ahụ biara ka a gwụọ ya, ọ bụghị maka mgbaghara. Mana o nwere ihe Jizọs maara: ọ dịghị ihe iseokwu kachasi ná ndụ dị ka mmehie na mgbaghara. Ma lee ihe merenụ ka nke mesiri. Ụfọdụ ndị ozizi bụ́ ndị Juu nọ n’ebe ahụ, ihe a Jizọs kwuru mara ha ahu jijiji.

“Gịnị kpatara onye a ji ekwu okwu otu a? Ọ na-ekwulu onu! Ònye pụrụ ịgbaghara mmehie na a bụghi naanị Chineke?” (Mak 2:7).

N’okwu ikpeazụ ahụ ha kwuru, ha ziri ezi. Mmadu ikwu na o puru igbaghara mmehie bụ ịnara ikike nke Chineke. Ọ bụrụ na ọ bụghị eziokwu, ọ bụ nkwulu - mmehie dị oké njọ. Jizọs ma ihe ha na-eche, ya mere ọ jiri jụo ha ajụjụ. Amaokwu nke itolu:

“‘Olee nke dị mfe: ịsị nwoke a ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharawo gị mmehie gị,’ ma ọ bụ ị sị, ‘Bilie, buru ute gị gawa’?’”

Ajụjụ a masịri m. Chee echiche banyere ya. Kedu nke ka mfe ikwu?“A gbagharala gi mmehie gị.” Nke ahụ dị mfe ikwu n'ihi na ọ dịghị onye nwere ike ịhụ ya. Mana ọ kari sie ike ime! Naanị Chineke nwere ike ịgbaghara mmehie!Mana ịsị nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, buru ute gị gawa” - nke ahụ na-etinye ihe niile n'isi. Onye ọ bụla no n'ele anya. Ya mere n'amaokwu nke iri Jizọs gara n'ihu,

“‘Mana A chọrọ M ka unu mara na Nwa nke Mmadụ nwere ikike n’elu ụwa ịgbaghara mmehie.’ Ya mere O sịrị nwoke ahụ, ‘Asị M gị, Bilie, buru ute gị laa.’ Nwoke ahu biliri, were ute ya pụọ ​​n’ihu ha niile ka ha n'ele. Nke a tụrụ onye ọ bụla n'anya.”

Ọrụ ebube mere ebe a dị egwu: otu nwoke kpọnwụrụ akpọnwụ jere ije! Ma echefula ihe ntuzi no ebe a, o na-arutu aka na ikike Jizọs. Jizọs nwere ikike Chineke ịgbaghara mmehie, Ọ gosiputakwara ya. Ọ jikwa ya mee ihe ọzọ na akụkọ na-esote. N’amaokwu nke iri na ato, Jizọs no n'akuzi ihe n’akụkụ ọdọ mmiri, ọ wee hụ Livaị ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ọnaụtụ. Ugbu a, a na-eleda ndị ọnaụtụ anya n'oge ahụ, ndị ikom rụrụ arụ na-akpa n'akpa karịa ka ha na-enye gọọmenti. Anyaukwu jọgburu onwe ya. Ma n'agbanyeghi nke a, Jizọs biaruru Livai nso,

“‘Soro M,’ ka Jizọs gwara ya, Livaị wee bilie soro Ya” (2:14).

A hukwala okwu ndị ahụ ọzọ n'ebe a, otu òkù ahụ. Ma na nke ugbu a, Jizọs kpọrọ otu onye mmeghie - ezigbote onye ruru aru. Ma Livaị wee soro Ya! Na mgbe Livaị kpọrọ Jizọs na ndị na-eso ụzọ Ya ka ha rie nri abalị, e nwekwara ọtụtụ ndị mmehie biara soro ha rue ya bu nri. Nke a bụ nke n'ekweghi Ndị Farisii ighota. Ndị Farisii bụ ndị ndú okpukpe - ndị na-ama mmadu ibe ha ikpe na ndị ezi omume onwe ha juru onwe ha anya - ndị nke a Jizọs mere ekweghị nghọta. Ọ bụrụ na Jizọs bụ onye rabaị di nso,

“Gịnị mere O jiri soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe?” (2:16).

Amaokwu nke iri na asaa bụ okwu gbara ọkpụrụkpụ:

“Mgbe Jizọs nụrụ nke a, O sịrị ha, ‘Ọ bụghị ndị ahụ́ siri ike chọrọ dọkịta, kama ọ bụ ndị na-arịa ọrịa. A bịaghị M ịkpọ ndị ezi omume, kama ọ bụ ịkpọ ndị mmehie.’”

A ganahukwala nke a. Jizọs họọrọ ndị mmehie. Livaị bụ onye mmehie. Ndị enyi ya dịkwa otú ahụ. Mana dị ka dọkịta na-abịa ịgwọ ndị ọrịa, Jizọs na-abịa ịgbaghara na iweghachi ndị mmehie - ime ka ha bụrụ ndị ezi omume. Ezi omume pụtara izi ezi n'ebe Chineke nọ. Nke ahụ bụ okwu dị mkpa. Ị maara mmetụta ahu dị n'etiti mmadụ abụọ mgbe mmekọrịta ha ziri ezi - mgbe ọ na adịghị ihe guzo n'etiti gị na onye ahu? Eleghị anya ị makwaara mmetụta ahụ mgbe mmekọrịta mmadụ na ibe ya ezighị ezi - mgbe mgbidi dị n'etiti gị na enyi gi n'ihi na ị mejọrọ ya. Otu ahu, ka anyị na Chineke nọ. Mmehie na-ekewa anyị. Anyị mere ihe ọjọọ. Mana ozi-ọma - oké ozi - bụ na Jizọs bịara ime ka anyị zie ezi ọzọ. Ọ na-agbaghara mmehie, na-akpọkwa anyị ndị ezi omume. Ihe ọ na-acho n’aka anyị bụ okwukwe. Ezi omume site n'okwukwe. Ma ihe ịtụnanya karịri bu na, Jizọs na-ahọrọ ndị mmehie, na-eme ka ha zie ezi, ma zipụ ha ijere Chineke ozi. N'isi nke ato, anyị ga-agu otu Jizọs si kpooro onwe Ya ndi mmadụ iri na abuo, ma họpụta ha ịbụ ndịozi. Onye na-eso ụzọ bu onye nsuso, onye ozi bu onye e zipuru - dị ka onye nnọchianya. Ma n’ebe ahụ n’ime ndepụta mmadụ iri na abụọ ahụ bụ Livaị, naanị na a gbanwere aha ya ka o bụrụ Matiu. Jizọs na-ahọrọ ndị mmehie, na-agbaghara ha, gwọọ ha ma gbanwee ha, O na-ezipụkwa ha izi ndị mmehie niile ndị ọzọ ozi ọma: Chineke hụrụ unu n’anya. Ihe itụnanya. Ọ ka na-emekwa ya taa. Gụọ Mak Isi Nke Abuo na Isi Nke Ato taa. ọ bụrụ na ị nwere ohere, pia "Gụọ Isiakwụkwọ Dum" ka ị wee nweta akụkọ dum. Aga m ezutekwa gị azụ ebe a n'isi nke anọ.

Maka Ntụle & Mkparịta Uka:

  • Gịnị mere i ji chee na ọ siiri ndị ndú okpukpe ike ịnakwere na Jizọs na ndị mmehie rikotara nri?
  • Jizọs kwuru okwu gbara ọkpụrụkpụ na 2:17, “Ọ bụghị ndị ahụ́ siri ike chọrọ dọkịta, kama ọ bụ ndị na-arịa ọrịa. A bịaghị M ịkpọ ndị ezi omume, kama ọ bụ ịkpọ ndị mmehie.” Gịnị ka nke ahụ pụtara nye gị?
  • Olee ọrụ mgbaghara rụgooro ná ndụ gị? Kekọrịta akụkọ gị.
Igodo: ụbọchị_abuo ụbọchị_abuo

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org