Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 7 NKE 30

Ma ị bụ onye maara ihe ma ọ bụ onye nzuzu, onye ziri ezi ma ọ bụ na ị bụghị onye ziri ezi, eze ma ọ bụ onye eze na-akpagbu akpagbu, ihe o na agara gi nke ọma ma ọ bụ ina ada ada, ino n'ime ọha mmadụ ma ọ bụ ino naanị gi, ibu onye isi ike ma ọ bụ onye gbagara agbaga, ha niile na-ejedebe n'otu ụzọ ahụ. Ihe niile na-agafe, ka Solomọn na-ekwu, anyị apụghịkwa ịhụ ọṅụ na-adịgide adịgide n'ihe ọ bụla ọ masiri anyị imetụ aka. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya maka mmadụ ịgbalị ịchọta ezi ọn̄ụ ya n'okwu ntakiri nke eziokwu ọ bụla, ma ọ bụ na mmezu nke ọchịchọ, ma ọ bụ na nnoro onwe nke anụ ahụ ma ọ bụ ọgụgụ isi, ma ọ bụ na ọha mmadụ; ọ ga-enweta ọṅụ nanị ná mmekọrịta onwe ya na Chineke. Jizọs Kraịst bụ Chineke egosipụtara n’anụ ahụ́ nke mmadụ, anyị kwesiri ileghara anya ruo nke ịkpọasị ihe ọ bụla na-emegide mmekọrịta anyị na Ya.

Ezi ọṅụ nke ndụ mmadụ bụ na mmekọrịta ya na Chineke, ma nnukwu isi okwu nke ntụkwasị obi Hibru n'ebe Chineke nọ, bụ na ọ dịghị eme ka mmadu ghara idaba na ndu ya n'ezie. Nke ahụ bụ ule okpukpe ụgha mgbe niile.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Olee ebe ma ọ bụ ọkwá m gbara mbo ichota ọṅụ? N'ime ọchịchọ, nkwenye, ma ọ bụ nguzo dị aṅaa ka m tụrụ anya ichoputa ọṅụ? N'ime mmekọrịta nke ndị mmadu dị aṅaa ka m leworo anya ọṅụ?

Nkwupụta ndị e nwetara site na Idikwa Elu Maka Elu Nke Ya Kachasi, nke ndi Nkwusa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu

Ụbọchị 6Ụbọchị 8

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara