Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 1 NKE 30

Añụrị pụtara mmezu zuru oke nke ihe ahụ e ji kee m ma mee ka m dị ọhụrụ, ọ bụghị ime ihe na-aga nke ọma. Añụrị nke Onye-nwe anyị nwere n’ime ihe Nna zitere ya ka o mee. Anyị niile ga-achọta oghere anyị na ndụ na n'ụzọ ime mmụọ, anyị na-achọta ya mgbe anyị nwetara ozi anyị site n'aka Onyenwe anyị. Iji mee nke a, ọ ga-abụrịrị na anyị na Jizọs jikọrọ aka; anyị ga-amarịrị Ya karia dịka Onye nzọpụta nke onwe. Enwetala m ozi sitere n'aka Onyenwe anyị? Ọ bụrụ otú ahụ, aghaghị m iguzosi ike nye ozi ahu, ịgụ ndụ m dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa nanị maka ijezu ozi ahụ.

Onye-nwe-anyi, Mu onwem nābiakute Gi. Nye m mbata nke ndụ gị nke ọma ruo mgbe ntughari uche m, echiche m, na okwu m bụ nke Gị niile. Lee ka I meworo ka mmụọ m dị ọhụrụ wee weghachi m ọn̄ụ nke nzọpụta Gị!

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Gịnị bụ oghere nke ime mmụọ m? Kedu ihe m na-eme nke naanị m nwere ike ime? Gịnị bụ ozi m sitere n’aka Onye-nwe-anyi? Ana m eguzosi ike nye ozi ahu? Olee otú ndụ m si dị oké ọnụ ahịa nye Jizọs?

Nhọta ndi ewetere site na Akpọrọ Nke Chineke na Ikụ Aka N'Ụzọ Chineke, nke Ndi Nkwusa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org