Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ
Añụrị nke Jisọs dị n’ịmara na ike nile nke ọdịdị Ya kwekọrọ n’ụzọ Nna Ya, nke na Ọ ji obi ụtọ mee uche Nna Ya. Ụfọdụ n’ime anyị na egbu oge ime uche Chineke; anyị na-eme ya dị ka a ga-asị na akpụkpọ ụkwụ anyị bụ ígwè na liidi; anyị na-eme ya na nnukwu ima ọshụ na akuku nke ọnụ anyị idi ala, dị ka a ga-asị na uche Ya bụ ihe kachasi igwụ ike n'ụwa. Ma mgbe e mezigharịrị uche anyị ma mee ka ha kwekọọ n’ebe Chineke nọ, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ, oké ọṅụ nke kachasi, ime uche Chineke.
Gwa ndị nsọ gbasara ntarama ahuhu, ma ha elee gị anya na itunanya. "Ntarama ahuhu? Olee ntarama ahuhu?” Ntarama ahụhụ bụ ihe okwu nkọwa. Maka onye-nsọ, ntarama ahuhu bu inwe obi kachasi utọ n'ime Chineke nke ukwuu; obughi inwe obi uto na ntarama ahuhu, mana ọ bụrụ na uche Chineke eduba n'ime ntarama ahuhu, enwere obi uto n'ime uche Ya.
Ajụjụ Ntụghari Uche: Gịnị mere m ji egbu oge ime uche Chineke? Olee okwukwe ụgha na-eme ka m chee na Chineke achọghị ka m nwee obi ụtọ? Olee mgbe m nwetara obi ụtọ ime uche Chineke?
Okwu ndị e nwetara site na Omụme Oma Ntọala Nke Ndu, nke ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.
More
We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org