Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ
Ọkwa ọṅụ niile na-ebi n'ime obi. Olee otú Onye Kraịst ga-esi jupụta n’obi ụtọ (ọ bụrụ na obi ụtọ dabeere n’ihe ndị na-emenụ) mgbe ọ nọ n’ụwa, ebe ekwensu na-eme ike ya nile ime ka mkpụrụ obi gbapụ n’ebe Chineke nọ, ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’anụ ahụ́, ebe a na-eweda ụfọdụ n’ime ha, eme ka ha ghara inweta ohere? Ọ ga-abụ ihe ga-esi na ịchọ ọdịmma onwe onye kachasị njọ pụta, inwe obi ụtọ n'ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ma obi nke na-aṅụrị ọṅụ abụghị ihe mkparị, makwa ọnodu ihe ndi ahuru anya a dịghịkwa emetụta n'ahụ ọṅụ.
Akwụkwọ Nsọ kwuru ọtụtụ ihe banyere ọṅụ, ma o nweghị ebe ọ na-ekwu banyere Onye Kraịst “nwere obi ụtọ”. Obi ụtọ na-adabere n'ihe na-eme; ọṅụ adịghị. Cheta na Jizọs Kraịst nwere ọṅụ, ọ na-ekpekwa ekpere “ka ha wee nweta ọṅụ nke M jupụta n’ime onwe ha.”
Ajụjụ Ntụgharị Uche: Gịnị bụ oke ọṅụ na ańụrị na ndụ m? Ugboro ole ka m na-ahapụ ihe ndi na eme m gburugburu ka ha kaa ọnọdụ m? Ugboro ole ka m na-enwe ọṅụ?
Nhọta ndị e nwetara na Akparama agwa nke Akwụkwọ Nsọ, nke ndi Nkwusa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.
More
We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org