Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 20 NKE 30

Uba nke ihe ndabara! Nke ahụ bụ ụzọ Pọl si lee ndọkpụ n’agha ya anya. Ọ chọghị ka ha daa mbà n’obi n’ihi ya, ma ọ bụ chee na e gbochiwọ nzube Chineke; ọ na-ekwu na egbochibeghị ya, kama ọ gara n'ihu. Ihe ndị yiri ihe ọjọọ agbanwọọla buru ihe ndi kacha kwesiri ekwesi, n'ihi nke a obi ya juputara n'ọñụ, ma mkpụrụ uda egwu ana-apụtakwa.

Mmụọ nke nrubeisi na-enye Chineke ọṅụ karịa ihe ozo obụla dị n'ụwa. Mgbe ihunanya nke Chineke wụsara n’ime obi m (Ndị Rom 5:5), enwere m ụdịdi nke Chineke, ma marakwa na site na nrube-isi m, ahụrụ m Ya n’anya. Ntụle kachasị mma nke ndụ ime mmụọ abụghị nnukwu obi ụtọ ya, kama ọbụ nrube isi ya.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Olee ọdachi gbanwewọrọ ghọọ ohere di nma? Kedu ọṅụ dị aṅaa gaara ifunahụra m ma asị na mụ na Chineke ejeghị ije ná mkpagbụ?

Nkwupụta ndị e nwetara site na Kwekọritara Na Ọyiyi Ya na Amaghị Ebe, nke Ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta
Ụbọchị 19Ụbọchị 21

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara