Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 23 NKE 30

N'ọnọdụ ụfọdụ nke ndụ ime mmụọ, anyị na-enweta echiche ọjọọ na ihe niile anyị nwere, anyị ga-ahapụrịrị. N'ime Akwụkwọ Nsọ, ihe ịchụ-aja pụtara bụ ima uma nye Chineke ihe kachasi mma m nwere, ka Ọ mee ka ọ bụrụ nke mu na Ya rụọ mgbe ebighi ebi: ọ bụrụ na m ejidesie ya ike, oga efunahara m, funahakwara Chineke. Chineke gwara Ebraham ka ọ were Aịzik chụọ àjà nsụrụ ọkụ, mana Ebraham kọwara ya ka ọburu na ọ ga-egbu nwa ya nwoke. Ma n’elu ugwu Moraịa Ebraham tufuru omenala na-ezighi ezi banyere Chineke wee nweta nghọta ziri ezi maka ihe àjà nsụrụ ọkụ pụtara: àjà dị ndụ (Ndị Rom 12:1-2). Ọ dị ka a ga-asị na anyị ga-ahapụ ihe niile, tụfuo ihe niile anyị nwere, ma kama Isọ Ụzọ Kraịst ga-ewetara anyi ọṅụ na ịdị mfe, ya emee ka anyi hụsieanya; tupu anyi aghota ọzigbọ ihe ebumuche Chineke bụ, na anyị ga-ekere òkè nke onwe anyị maka izụlite mkparama agwa oma nke onwe anyi, na anyị na-eme nke a site n'ịchụ aja nke mburuputauwa nye nke ime mmụọ site n'irube isi, ọ bụghị ịgọnarị mburuputauwa, ma ọbụ iji ya chụọ àjà.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Olee echiche na-ezighị ezi banyere Chineke m na-ejidesi m ike nke na-eme ka m ghara inwe ọṅụ?

Okwu ewepụtara n’aka O Ga Eto M, nke Ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu

Ụbọchị 22Ụbọchị 24

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara