Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ
Jizọs Kraịst abụghị naanị Onye Nzọpụta, Ọ bụ Eze, ma Ọ nwere ikike ịnara anyị ihe ọbụla na ihe niile n'ezi uche Ya. Anyị na-ekwu maka ọṅụ na nkasi obi nke nzọpụta; Jizọs Kraịst na-ekwu maka ibuli obe elụ n'eso Ya. Ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime anyị maara ihe ọ bụla gbasara iguzọsi ike n’ihe nye Jizọs Kraịst. Anyị na-ele Jizọs Kraịst anya dị ka ihe atụ kacha mma nke ndụ Isọ Ụzọ Kraịst; anyị adịghị eche Ya n'ududi Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, ji ike nile dị n’eluigwe na ụwa. Anyị na-eme Ya onye otu anyi, Onye n’ime agha nke ndụ nwere ume karịa anyị niile, ma Ya atụgharịkwa nyere anyi aka. Anyị na-emesọ Ya dị ka a ga-asị na Ọ bụ otu n'ime anyi; anyị anaghị ewepụ akpụkpọ ụkwụ anyị mgbe Ọ na-ekwu okwu. Jizos Kraịst bụ Onye-nzọpụta, Ọ na-azọpụtakwa anyị n’ime nke Onwe Ya zuru oke, na ịdị nsọ Ya.
Ajụjụ Ntụgharị uche: Olee ọṅụ m nwetara n’ime àjà? Ana m enweta ọṅụ dị ukwuu site n'inwe Jizọs dị ka onye ọrụ ibe m karịa Ya ịbụ Eze? Ọ̀ na-atọ m ụtọ karị iche echiche ịchị n’alaeze Chineke ma ọ bụ ịta ahụhụ iji mee ka ọ n'aga n'ihu?
Okwu ewepụtara n’aka Ọ Ga Eto M, nke Ndi Nkwusa Ulo Oru Nchoputa
Ajụjụ Ntụgharị uche: Olee ọṅụ m nwetara n’ime àjà? Ana m enweta ọṅụ dị ukwuu site n'inwe Jizọs dị ka onye ọrụ ibe m karịa Ya ịbụ Eze? Ọ̀ na-atọ m ụtọ karị iche echiche ịchị n’alaeze Chineke ma ọ bụ ịta ahụhụ iji mee ka ọ n'aga n'ihu?
Okwu ewepụtara n’aka Ọ Ga Eto M, nke Ndi Nkwusa Ulo Oru Nchoputa
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.
More
We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org