Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ
Ọ bụrụ na ọnọdụ gị ugbu a siri ike, cheta oge ahụ mgbe ha n'esighi ike, ọ ga-eju gị anya maka ikike ime ihe ziri ezi dị n’obi mmadụ ịtụgharị site n’otu ihe gaa n’ihe ọzọ. Nhụsianya ole ka obi mmadụ ga-anatanwu, ọṅụ ole! Ọ bụrụ na ike nke ịtụgharị site na otu ihe gaa na nke ọzọ efunahu anyi, anyị na-akpasụ nguzọzi. Mmụọ Chineke na-eweghachi ma na-edobe nguzọzi nke ọma.
Ikwụsa ozi-ọma nke “na-enwe obi ụtọ,” mgbe mmadụ na-enweghị ike ịnwe obi uto. Ịgwa ya ka ọ na-ele anya n'akụkụ ebe ihe na-egbuke egbuke mgbe ọ na-enweghị ihe na-egbuke egbuke bụ ezigbote ihe ọchị, dị ka ịgwa azu dika jellii ka ọ gee otu n'ime Ọnụnụ Okwu nke Handel. Ọ bụ nnọọ ihe efu ịgwa onye a mara ikpe n’ihi mmehie ka ọ ṅụrịa ọṅụ. Ihe ọ chọrọ bụ amara nke Chineke ịgbanwe ya ma tinye n'ime ya isi iyi nke ọṅụ.
Ajụjụ Ntụgharị Uche: Àna m ekpebi inwe obi ụtọ kama inwe ọṅụ? Obi sie ike m nwere n’ebe Chineke nọ, ọ̀ zuru ezu na m pụrụ inwe ọṅụ ọbụnadi n’oge iru uju? Ahụmihe amara m ọ̀ karịrị mmehie m?
Nhọta ndị e nwetara na Nka Mmụta Uche Nke Akwụkwọ Nsọ, nke ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.
More
We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org