Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 21 NKE 30

Gịnị bụ ọṅụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst? Ọṅụ Ya di n’ịrụcha kpam kpam ọrụ ahụ Nna Ya nyere Ya ka Ọ rụọ; ma otu ụdị ọn̄ụ ahụ ka a ga-enyekwa nwoke na nwanyị ọ bụla a mụrụ site na Chineke dokwara onwe ya nsọ, mgbe ha rụzuru ọrụ Chineke nyere ha ka ha rụọ. Gịnị bụ ọrụ ahụ?

Ịbụ onye-nsọ, nke n'aga ije, n'ekwu okwu, n'adị ndụ, buru akwụkwọ ozi bara uru nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ike ime site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst—Nke di n'otu n’ime njirimara nke okwukwe nke Jisọs, nke di n'otu n’ime njirimara nke ịhụnanya nke Jisọs, nke di n'otu n’ime njirimara Mmụọ nke Jizọs, ruo mgbe anyị ga-abụ nnọọ otu n’ime Ya nke mere na obughi naani na aga aza ekpere Onye Isi Nchụàjà, kama aziza ekpere a ga a pụta ìhè n’ụzọ doro anya—“ka ha wee bụrụ otu, dị ka Anyị si wee dị.”

Job nyere mkwụpụta nke nchepụta ohuru banyere Chineke; olile-anya ya bụ na onye ikpe ga-ebilite nke na-agaghị agụ naanị Chineke ibu onye ezi omume, makwa onye ikpe a ga-aguyekwa ya onwe ya bu Job n'ibu onye ezi omume. Ọ bụ iru újú bụtere Job n’ebe a, ma naani iru újú bụ ihe ga emenwụ nke a; ọṅụ adịghị emenwụ ya, ma ọ bụ ọganihu, naani iru újú.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Olee ụzọ ndị m na-esi agbalị inweta ọṅụ mgbe m na-adịghị aga ije, na-ekwu okwu ka Jizọs? Kedu ihe mere m ji chee na nke a ga-ekwe omume?

Nkwupụta ndị ewetara site na Akwadọrọ Nye Chineke ma Agbagwọjụrụ Anya Ka A Lụọ Ọgụ Ka Nma, nke ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta
Ụbọchị 20Ụbọchị 22

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara