Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Atụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 17 NKE 30

Onyenwe Anyi kwụrụ okwu banyere ichọputa ihe ndi fụrụ efu.
Mụ onwe m na enwekari ihe mmasi a; Chineke chọrọ ihụ ụzọ site na anya nke m.
Chineke chọrọ iche echiche site na ubụrụ isi m.
Chineke chọrọ irụ ọrụ site na aka m.
Chineke chọrọ ibi, ma gaa ije n'ime ahu m maka otu ihe; igakwụte ndi fụrụ efu site na otu O chọrọ.
Ana m ekwe ka Ọ gaa ije ma biri n'ime m?

E nweriri ike igbahie ihe nke ime mmụọ pụtara ihe.
"Dabere n'ime Chineke" nwere ike igbanwe bụrụzie eziọmume "tara nchara" n'echiche.
Kedu ihe okwu anyi niile banyere isachapụsi ihe rụrụ ụnyi ga apụta?
O kwesiri ipụta buru idabere n'ime Chineke ahụ, nke bu idi n'otu n'ime Chineke, dika otu Ya na Jisọs nwere, n'abughi naani enweghi ntụpọ n'ihu Chineke, mana ibu añuri oke omimi nye Ya.

Ajụjụ Ntụghari Uche: Ana m enwe obi uto ichọta ihe fụrụ efu?
Abu m ezigbote onye esisọ n'uzo Chineke ichọ, na izọpụta ndi fụrụ efụ?
Olee otu m si buru onye dara iwụ maka ike ihe nke ndi mmụọ n'abughi ezigbo ya?
Ana m akwadọ ndabere ozo n'abughi nke idi n'otu n'ime Jisọs, ma enweghi ntụpọ nye Chineke?

Nkọwa Okwu sitere na Umu Nwoke Ndi Ọrụ Nke Chineke, na Ebe Inye Aka, nke Ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu

Ụbọchị 16Ụbọchị 18

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara