Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Asaa: Ọṅụ Na-enweta Ọchị Ikpeazụ
Ahụla m ngosipụta ọṅụ ọtụtụ oge ka a n'eli ozu.
N'ezie, ahụla m ya oge riri nneka a n'eli ozu. Ọbụna n'ihe mgbu na iru újú, a na-ahụkwa ndị enyi na ezinụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ ka ha na-egosi ihu ochi. Otutu mgbe, mgbe ha biliri ikwu okwu ka akwam ozu n'aga n'ihu, ha na-achị ọchị, kwaa ákwá ma chịa ochi ọzọ n'usoro a n'ejikwaghị n'ihi iru újú ha. Mgbe onye ọ bụla na-ezukọ maka oriri mgbe olili ozu gasịrị, a na-enwe ma anya mmiri na ọchị ka ndị mmadụ na-echeta oge ọma ha na onye ahụ nwụrụ anwụ nwekọtara.
Devid dere n’Abụ Ọma 30:5, sị: “Ịkwa ákwá pụrụ ịnọgidesi ike n'abalị, ma aṅụrị na-abịa n’ụtụtụ.” Pọl kwuru ihe yiri nke ahụ na 2 Ndị Kọrint 4:17, “N’ihi na nsogbu anyị bụ ndị dị mfe na ndị na-adịru nwa oge na-enwetara anyị ebube ebighị-ebi nke karịrị ha nile.” Ma Devid ma Pọl leghara ihe mgbu ha nwere n’oge ahụ anya wee hụ na ihe ka mma dị n’ihu.
Ikwu eziokwu, ọṅụ abụghị mmetụta mbụ ị na-enwe mgbe ọnwụ dara. Ka ị nụrụ maka ọnwụ ahụ, ọ na-adị gị ka e merụrụ gị ahụ, dị gị ka e ji mma n'enye gị ọnyá n'ime ahụ gị, apụghịkwa ijikwa gị n'iru újú gị. Ee, ịkwa ákwá na-anọgidesi ike n'abalị — mgbe ụfọdụ yabụ abalị n'adị ogologo ka ogologo, jupụtakwa n'ọchịchịrị.
Mana abalị niile na-abịa na njedebe. Ọbụlagodi abalị kachasị dị ogologo, nke yi ọchịchịrị ka uwe na nke kachasị dị mwute, ha niile na-agwụ. N'oge na-adịghị anya anyanwụ ga awa, ìhè ga-achụpụ ọchịchịrị, olileanya ga-ebilikwa ọzọ. Mgbe ị na-akwa ákwá n'abalị, ọ dị mkpa ka ị cheta na ụtụtụ ga-abịa, na ọṅụ nọ n'ụzọ.
Ọṅụ adịghị ewepụ nhụjuanya gị ma ọ bụ weghachi mfụ̀ bịakwutere gị, ikwu eziokwu. N'èzí ọ dịghị ka mgbanwe ọ n'eme. Mana n'ime, ihe niile na-agbanwe. Mgbe iru-újú gị malitere ịgbanwe site n’ọṅụ nke Onye-nwe-anyị, ume gị ga-alaghachi, olileanya gị ga-ebilitekwa ọzọ. Ị ga-enweta echiche doro anya, nke dị mma karịa gbasara ihe ọjọọ mere gị, na ọdịnihu mara mma cheere gị.
N'ezie, ị pụghị ịmanye ọṅụ ka ọ pụta ìhè karịa ka ị nwere ike ịmanye anyanwụ ka ọ waa. Oge a kara aka gbasara ihe ime, dị mkpa. Oge na ụbọchị gasị ga-abịa, ma laa. Ugbu a, ị nwere ike na-akwa ákwá, mana ekwela ka arịrị gbuo gị — nwee nkasi obi, ị gaghị akwa ákwá ruo mgbe ebighị ebi. Taa ị nwere ike na-eru újú, mana ị ga-agba egwu ọṅụ n'oge n'adịghị anya. Añụrị na-enwetariri ọchi ikpeazụ.
Ịkwesighi ịmanye ọṅụ ịwa, mana ị kwesịrị ịtụ anya ya. Ma mgbe ọ bịara, nabata ya. Zuo ike na ya. Nweta ọgwụgwọ na ya. Chọta ike na ya.
____________________________
Atụmatụ Ihe Ọgụgụ a o nyeere gị aka? Anyị nwetara atụmatụ ihe ọgụgụ a site naThe Art Of Overcomingnke Tim Timberlake dere. Gụzuo yabụ akwụkwọ! Nweta nke gị taa!Nzụta ọ bụla ị mere na-enye onye nọ ná mkpa ya, Akwụkwọ Nsọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More