Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Anọ: Otu Esi Emeso Nrọ Ndị Mebiri Emebi Omume.
O nwetula mgbe ị nwere nnọọ nrọ nke ndụ ma ọ bụ ebumnobi mara mma i chọrọ ịhụ ka ọ pụta ìhè n'ezie, o wee nwụọ?
O nwere ike bụrụ echiche azụmahịa nke ị maara nke ọma na ọ ga-eme gị abụrụ ọgaranya n'agụ ego na nde na nde. O nwere ike bụrụ okpụ́kpá gị na onye i hụrụ n'anya i che n'ọga emecha daba na alụmdi na nwunye, mana o mechaghí dị irè.
Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị ebi ụdị ndụ ọma anyị bụ n'uche. Nrọ ọma nke ndụ ma ọ bụ ebumnobi anyị gbasara ndụ anaghị emezu mgbe niile. Mana ikwu eziokwu, ụfọdụ nrọ ma ọ bụ ebumnobi nke ndụ anyị ekwesịghị ịbịa na mmezu. Ma nke ahụ adịghị eme ka ha ghara iwute anyị nke ukwuu mgbe ha tiwasiri n'ihu anyị.
Ndị na-arọ nrọ nọ nso obi Chineke — Akwụkwọ Nsọ juputara na ha. N'ihi na ụfọdụ nrọ nke ndụ gị aghọọla ihe jọgburu onwe ha nye gị ma ọ bụ tiwaa gị obi apụtaghị na ị ga-akwụsị iro nrọ.
Naanị cheta na nrọ gị nwere ike ịnwụ, tupu ọ dị ndụ, rụwa ọrụ.
N'ime Akwụkwọ Nsọ, akụkọ Josef bụ onye na arọ nrọ, bịara na njedebe n'ụzọ magburu onwe ya. Mana Josef gabigara ọtụtụ ahụmahụ ọnwụ iji ruo ebe ahụ, gụnyere nrara mmadụ nye, ịgba ohu, ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike, na ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ. Eji m n’aka na o nwere ọtụtụ oge o chere na ndụ ya agwụla ma ọ bụ na olileanya ya niile efuola.
Ma mgbe oge ruru, Chineke mezuru nrọ ya n'ụzọ dị nnọọ ukwuu karịa ka Josef tụrụ anya ya, n'ụzọ ọbụla.
Nrọ Chineke na-akakarị nrọ nke mmadụ. Mgbe ụfọdụ, ọ dị mkpa ka nrọ anyị nwụọ, o bụrụgodị nwa oge, ka obi anyị wee kpọnwụọ n'ebe nrọ anyị ndị ahụ nọ. Ya bụ na anyị ga-ewepụ echiche anyị na ịdabere n'onwe anyị dịka ndị siri ike, wee bụrụ ihe niile debe n'elu ebe ịchụàjà nke Chineke. Mgbe ụfọdụ ọnwụ nke obere nrọ anyị gasị n'emehe ụzọ maka mmezu nnukwu nrọ nke Chineke. Nrọ anyị ahụ dị mma ga-anwụrịrị iji mee ka ohere nọrọ maka nrọ kachasị mma, maka nrọ nke Chineke.
Ozugbo anyị chọtara nchekwa na ntụkwasị obi anyị na Chineke karịa n'ihe ọbụla ga-ewetara anyị obi ụtọ nwa oge ma ọ bụ nkwanye ugwu, anyị ga-adị ike ịchụso nrọ anyị n'atụfughị onwe anyị ma ọ bụ daba n'onya ekwensu ka anyị n'emezu yabụ ebumnobi.
Ya mere, ọ bụrụ na ị na-enwe nkụda mmụọ na mgbu obi n'ihi nrọ nke gị n'emezubeghị, jiri oge a bịaruo Chineke nso. Nye Ya atụmanya gị niile. Ka O jiri aka Ya pụrụ ime ihe niile jigidere gị nrọ gị ndị ahụ, nwa oge.
Ị nọ nchekwa n’aka Ya, nrọ gị niile dịkwa nchekwa n’aka Ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More