Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Abụọ: Okwukwe N'ime Ọchịchịrị
"Enwere ihe n'eyi egwù dị n'okpuru àkwà m!"
O nwetula mgbe nwatakịrị ji mkpu ụjọ a wee kpote gị n'ura? Ikekwe o nwere mgbe ị bụ nwa dị otù ahụ.
Ka anyị na-etolite, ihe ndị ahụ n'eyi anyị egwù n'okpuru àkwà anyị na-agabiga. Mana ndị nke dị n'ime isi anyị n'eto ma dị ike karịa. Nke a nwere ike ime ka anyị n'ebị ndụ jupụtara n'ụjọ nke ihe mmadụ ga-eme anyị ma ọ bụ ihe ọjọọ ga-eme n'ọdịnihu.
Anyị niile nwere ihe n'eyi anyị egwù. Ikwu eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka egwù tụọ anyị n'ụwa a ana ejighị ihe ọbụla n'aka. Anyị niile nwere ihe n'echu anyị ụra n'abalị.
Kedụzi ihe bụ azịza nye ihe ndị a niile?
Nwee okwukwe siri ike na Chineke nke dị ukwuu na dị eziokwu ịnabata ọnwụnwa na ndakwasi ọjọọ, abụghị naanị mmeri. N'agbanyeghị ihe ọbụla merenụ — ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, ma anyị meriri ma ọ bụ na awakpọ̀rọ̀ anyị, ihe ọ gaarà anyị nke ọma ma ọ bụ na anyị dara mbà — Ọ bụ Chineke n'achi, Ọ kwesịkwara ntụkwasị obi (Ndị Rom 8:38-39).
Anyị ga-eche ụfọdụ ihe siri ike ihu na ndụ. Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke. Ọbụlagodi na ihe anyị kacha atụ ụjọ meé, anyị ka pụrụ ịtụkwasị ịhụnanya na ọnụnọ Chineke obi. Nke a ọ́ bụghị ihe dum a na-akọ maka okwukwe? Ntụkwasị-obi dịkà nke nwata n'ịhụnanya nke Chineke?
Mgbe ị mụtara ijiri okwukwe bie ndụ n'ime Chineke, ọnwụ na mfụ̀ na-efunahụ ike ha. Okwukwe na-enye gị ike iche ihe ọbụla n'eyi egwù ihu, ozi ọjọọ ọbụla, ma ọ bụ ihe mmapụ-obi ọbụla, adaghị mbà. Ka okwukwe bụrụ isi ihe nke ndụ gị, i mee nke a ọ ga-eduru gị jee ije n'ihe ọnwụ ọbụla nke ndụ gị, é nweghi ihe mere gị. Asila naanị na ọ bụ mmeri ka okwukwe wetaara gị — ka o duru gị jee ije n'ime ihe agaghị nke ọma, ndakpọ olileanya na ihe mgbu dị iche iche. Ọ bụ mgbe ahụ ka okwukwe magburu onwe ya n'ọrụ.
Ee, ihe jọgburu onwe ya nwere ike ime. Mba, ọrụ ebube i tụrụ anya inweta nwere ike ọ gaghị adị irè n'akụkụ eluigwe a. Ee, ụbọchị ndị siri ike dị n'ihu.
Mana egwù ekwesịghị itu gị. Okwukwe n'emeghe anya gị ka ị hụ Chineke bụ Onye ji ogwe-aka ịhụnanya na ndị-agha Ya ana apụghị ịgụ ọnụ chebe gị na gbaa gị gburugburu.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More