Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ǹkà nke ImeriIhe Atụ

The Art of Overcoming

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ụbọchị Nke Ise: Chineke Chọrọ Ka Inyeghachi Ya Igwe Okwu.

Ị nwetụla ahụhụ nke ịnọ odụ̀ karịa ka i kwesịrị n'ihi ị n'ege okwu togburu onwe ya n'ogologo mmadụ n'ekwu mgbe a n'eli ozu? Ama m na m ataala ụdị ahụhụ a. Kedụ ihe e debere n'ime igwe okwu n'eme ka ndị mmadụ na-atụfu oge kpamkpam mgbe ha ji ya n'ekwu-okwu?

Ọ bụghị naanị nwanne nna gị n'eme omume mkpasu iwe a bụ ikwu ogologo okwu karịa ka o kwesịrị n'oge a na-eli ozu. Anyị na-emekarị otu ihe ahụ ma a bịa n'ihe gbasara ọnwụ gasị nke ndụ anyị. Anyị na-eru újú ha, na-echeta ha, na-akwa akwa arịrị gbasara ha — mana anyị anaghị etinye uche na oge. Anyị na-arapara n'obi na n'ọnọdụ iru újú anyị ma jụ ịga n'ihu.

N’oge na-adịghị anya ma ọ bụ ugbu a, Chineke chọrọ ka ị nyeghachi Ya igwe okwu ahụ iji akwa ákwá.

Ọ dị mkpa ka olili ozu gaa n'ihu. Ya mere, Ọ na-akpa anyị aka nwa obere ime ka anyị mara na anyị n'ejigịde njedebe ma ọ bụ ọgwụgwụ iru újú anyị ahụ. Ọ na-agba anyị ume ka anyị hapụ obi mgbowa anyị wee gaa n'ihu. Ọ dị mkpa ka olili ozu gaa n'ihu, mana nke a apụghị ime ma ọ bụrụ na anyị ejigidesie mfụ̀ ahụ mere anyị, aka.

N’Abụ Ọma nke 23, Devid dere n’ụzọ a ma ama, sị: “Ọ bụrụgodị na m na-eje ije na ndagwurugwu kasị gbaa ọchịchịrị, a gaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla, n’ihi na Ị nọnyeere m.” Rịba ama na Devid kwuru banyere ije-ijesite na ndagwurugwu ahụ. E meghị ndagwurugwu nke ọnwụ na ọchịchịrị ka ha bụrụ ebe obibi ogologo oge. Ha bụ ebe a n'esi agafe, ha abụghị ebe ekwesịrị ibi ka ụlọ, ma ọ bụ nọrọ ogologo oge. Njem isi n'ime ha gafee nwere ike iwe obere oge, mana ekwesịrị inwe ọganihu ka a na-eje yabụ ije.

Anaghị m agwa gị ma ọlị ka ị kwesịrị isi wee rie újú, mana achọrọ m ka ị ghọta na ị ka nọ na ala ndị dị ndụ, ọbụnadị na ị na-eru újú ndị nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ihe mgbu mere gị. Ụwa sará mbara mara mma dị, nọrọ na-echere gị, ị sokwa bụrụ akụkụ dị mkpa nke ụwa. Kwụsị ijigide igwe okwu nke iru újú gị ka ị ghara ifunahụ ihe niile Chineke nwere maka gị. Ma i kwụsịghị, i ga-abụ ụdị mmadụ akụkọ ndụ ya niile bụ maka ihe mgbu mere ya, kama ibu onye na-akọ akụkọ mmeri banyere ihe mgbu ahụ.

M ga-abụ onye ikpeazụ ga-agwa gị kpọmkwem mgbe iru újú gị kwesịrị ịnwụ pii, gaa n'ili. Nke ahụ dị n'etiti gị na Chineke.

Ya mere, jụọ onwe gị ma Chineke Ọ n'akpatu gị aka nwayọ nwayọ ka ị nye Ya igwe okwu iru újú ahụ ị ji n'aka gị. Ọ na-agwa gị na oge na-agbanwe, na oge eruola ka ị kwụsị ikwu okwu na ikwa-akwa iru uju gị wee banye n'ọdịnihu mara mma Ọ n'egosi gị? Ọ bụrụ na Chineke akpatubeghị gị ụdị aka a, ma ọ bụ gwa gị otu ahụ, biko jiri nwayọọ rie újú ka ị kwesịrị.

Mana ọbụrụ na Chineke n'eme gị mkpali ka ị baa n'oge na ọnọdụ Ọ kwadebere maka gị, ka amara Ya duru gị gaa n'ihu.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Art of Overcoming

Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.

More

Anyị ga-achọ ikele Biblica maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.biblica.com/timtimberlake