Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Isii: Ịchọta Ụdọ Site Na Nnabata
Ọ bụghị naanị na obì nwere ike igbawa. Ọ n'emechakwaa dị ndozi.
Ya mere otu n'ime usoro kachasị mkpa maka mmechi ihe mgbu merenụ bụ ịnakwere na yabụ ihe mfụ̀ mere eme — mkpebi nke mmetụta uche, echiche, na ọbụna nke ime mmụọ inakwere na ihe mgbu anyị mere eme ma ji olileanya cheé ọdịnihu-anyị ihu.
O nwere ike ị nụla banyere Job, bụ́ nwoke akọrọ akụkọ ya n'Akwụkwọ Nsọ, onye funahụrụ́ ihe niile ọ kpọrọ ihe na ndụ ya n’ime ụbọchị ole na ole.
Job bụ ezigbo ihe nlereanya maka nnabata n'ihi na ọ dịghị mgbe o zoro ọnụ banyere nhụjuanya dakwasịrị ya, mana ọ chịkọtakwarà onwe ya nyefee ngabiga ya niile n'aka Chineke. Ọ pụrụ ime ụdị nnabata a n'ihi na o kwenyere n'ịdị ike na ịdị ume nke Chineke banyere ihe niile ekere-eke n'ụwa dum. Ọ maara okè ya nke ọma banyere ihe ọ pụrụ ijikwa, na nke ike ya n'erughị.
Anyị amaghị ogologo oge nhụjuanya Job dịrurù. O nwere ike iru ọnwa kwa ọnwa, ma eleghị anya. O nwere diruo afọ kwa afọ. Mana yabụ nhụjuanya kwụsịrị. Nke ahụ bụ otu n'ime ihe bụ isi n'akwụkwọ Job. Job nọgidesiri ike, o cheere Chineke, nwee ntụkwasị obi na Chineke. Ka o n'emekwa ihe ndị a ka ọ n'ata ahụhụ, ka ọ n'ekpesara Chineke, ka ọ n'ajụkwa ajụjụ gbasara ọnọdụ ya. Ọ dịghị ihe ndị a o mere n'otu n'otu wee hapụ ibe ya.
N'ikpeazụ, Chineke mere ka o doo Job anya na oge eruwo yanwa ikwusi iká n'ele anya n'ihe ndị mere na ndụ ya. Chineke chọrọ ka Job ji obi ya niile nakwere ọnọdụ ya nke ọ n'ahụ anya. Nke ahụ bụ nke pụrụ ime naanị ma a nabata udo nke Chineke, udo karịrị echiche na nghọta nke mmadụ.
Ya mere, ngị́ kwanú?
Kedụ ebe ị nọ ugbu a n'usoro nnabata iru újú gị? Ị ka na-ahụ onwe gị n'alụ ọgụ banyere ihe ọ dị mkpa ka ịhapụ ma ọ bụ ika n'ejigidesi ike ihe ịma n'ezie na ị pụghị inweghachita ya ọzọ? Ị nwere olu ndị na-atamu gị ntamu na ntị (dị ka nke Job mere) n'atụnyeré gị na ọ bụ gị kpatara nhụjuanya gị? Ka ị na-anụ́ olu sitere n'eluigwe na-echetara gị na ọ nweghị ohere maka ọrụ nke onye-ọchịchị nke eluigwe na ala, na onye ọ bụla kwesịrị ịdajụụ nwa obere ma kwe ka Chineke bụrụ Chi n'ọnọdụ anyị niile?
N'agbanyeghị ebe ị nọ n'usoro nke iru újú, abịaghị m ebe a ikpe gị ikpe, abịaghịkwanu m ịkwa gị aka ka ị ruo újú gị ọsọ ọsọ.
Nke kacha ihe niile m kwuru, bụ na a chọrọ m ichetara gị na Chineke ka dị mma, ka na-achịkwa. Jisie obi gị ike ma n'aga n'ihu. Nọgide n'ikwere na Chineke. Nọgide n'inweta udo nke Chineke. Ekwere m n’ezie na, dị ka Job, ị ga-ahụ ịdị mma na ngọzi nke Chineke ọzọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More