Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Mbụ: Ọgwụgwụ bụ Mmalite.
Ọ bụrụ na ị nwetụla ahụmahụ nke ọnwụ mberede enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị, ị matala ike dị egwu nke ọnwụ mgbe ọ dara. Otú ahụ ka ọ dịkwa nye mfụ̀ na mberede nke ihe ọ bụla anyị jiri kpọrọ ihe. Ọ bụ ihe ọjọọ na-atụ anyị n’obi. Anyị na-enwe mmetụta nke enweghị ike, enweghị olileanya, na enweghị mmeri.
Mana gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na ọnwụ na iru újú abụghị njedebe kpamkpam dị ka anyi siri chee?
Ka m na-agụkwu Akwụkwọ Nsọ na ka m n'esokwu Jizọs, otú ahụ ka m na-ahụkwu eziokwu a dị mfe ka ọ na-arụ ọrụ: ihe ndị anyị chere na ha bụ njedebe na-abụkarị mmalite. Ihe anyị chere na ọ bụ mfụ̀ na-abụkarị uru nye anyị. Ihe kwesịrị ịbụ adịghị-ike n'ụzọ ụfọdụ na-agbanwe ghọọ ike. Ihe ọjọọ e bu n'obi mee ihe maka anyị na-aghọrọ anyị ihe ọma. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi na ọ bụ otú ahụ ka Chineke anyị siri dị ike na dị mma. O dị ike ịgbanwe ihe e lere anya ka ọ ghọọ ezigbote ihe ọjọọ ka ọ ghọọ ihe magburu onwe ya pụrụ ime.
Ịgbanwe echiche obi anyị ka anyị si ahụ ihe ndụ anya adịghị mfe ma ọ bụ bụrụ nke ihe mgbu n'adịghị na ya.
Ịchetula ihe n'aga n'uche nwa ọhụrụ mgbe a n'amụpụta ya. Anọ m ya mgbe a n'amụ nwa m nwoke. Ka esi mupụta ya atoghi ya ụtọ ma ọlị! I si ya họrọ, ọ ga-ahọ ịnọ n'afọ nne ya, ghara ịpụta n'ụwa a. Ụdị nnwere-onwe chere ya ma ọ pụta abụghị nke ọ pụrụ ibu n'uche ya.
N'otu aka ahụ, anyị na-ejigidesi ike ndị mmadụ, ebe, ma ọ bụ ebumnobi na-amalite imipụ n'aka anyị n'ihi egwù nke ihe anyị n'amaghị. "Ọnwụ ndị a dị nwa obere nwa obere" na-atụ anyị egwù n'ihi na anyị apụghị iji uche anyị hụ ihe dị anyị n'ihu. Dị ka nwa a mụrụ ọhụrụ, anyị enweghị asụsụ ọbụla iji kọwaa ya.
Ma n’akụkọ nke Chineke maka anyị, mmechi nke otu isiakwụkwọ na-abụkarị mmalite dị nma nke ohere ka ukwuu. Jizọs kọwara ndụ Ya dị ka mkpụrụ nke dị mkpa ka ọ nwụọ ewee lie ya tupu o wetara ndị mmadụ ndụ (John 12:23-25). Ụkpụrụ ahụ bụkwa nke metụtara ụdị ịnwụ-anwụ ndị ọzọ n'eme na ndụ anyị.
Ọnwụ abụghị njedebe. Ọ bụ ọgwụgwụ ihe, ee, mana ọ bụghị njedebe. Ọ bụkwa mmalite, nzọụkwụ dị mkpa ka o mee tupu ihe ọhụrụ enwee ike ịmalite.
Ya mere, kama ịtụ egwu n'ihi ejighị n'aka maka ọdịnihu, nọrọ jụụ, kuruo umé ala. Họrọ ịtụkwasị Chineke obi. Jee ije n'ọnụ ụzọ a dịka ọ bụ oké ihe mgbu nye gị. Ọ bụrụ na ebumnobi gị tiwasiri etiwasi, mfụ̀ i nwere maka ọrụ gị, mmekọrịta gị na onye i hụrụ n'anya mebiri emebi, ma ọ bụ ihe ọzọ emeela ka obi gị gbowaa n'ụzọ a na-apụghị ikọwa, ọ bụ gị ka ọ dịịrị iji ụzọ ziri ezi hazie ọnwụ nke ahụ mere gị — wee banye n'ime ihe ọhụrụ Chineke kwadooro gị.
Chineke chọrọ ịgbanwe njedebe gị ka ọ ghọọ mmalite mara nma.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More