Ǹkà nke ImeriIhe Atụ
Ụbọchị Nke Atọ: Iru Ụ́jú Bụ̀ Ala Dị Nsó.
Nne ma ọ bụ nna ọ bụla ga-agwa gị na ọ bụ ihe na-agbawa obi iji ntị nụ mkpu-ákwá nwa gị. Ọ bụ ihe mburụ̀puta-ụwa ndị nne na ndị nna ilekọta ụmụ ha. Ihe mgbu ụmụ ha na-akpalite ọmịiko, ọ bụrụgodị na "ihe mgbu" ha bụ naanị ịgba isi akwara jụ imechi anya ha hie ụra.
N’otu aka ahụ, ihe mgbu anyị na-emetụta Chineke n'obi. O bù anyị n'obi mgbe niile, Ọ nọkwa anyị nso mgbe niile. Ọ bụghị Chi nọ n'eluigwe n'ele anyị anya ịhụ ihe anyị pụrụ ịrụpụta ma ọ bụ mmehie anyị n'eme kwa ụbọchị.
Ọ n'eche banyere anyị. Ọ ghọtara ihe mgbu niile anyị na-agabiga. O sokwa anyị n'ebe ákwá arịrị nke ndụ anyị
Akwụkwọ Nsọ na-ekwukarị banyere otú Chineke si "na-anụ mkpu-ákwá anyị" ma ọ bụ "na-ahụ ahụhụ anyị na-ata." Obere ọnwụ ndị a gasị anyị na-agabiga na-akpali obi Chineke. Anyị bara nnukwu uru nye Ya, ya mere O jiri soro na-ekerịta ihe mgbu anyị. Ọ bụrụgodị na ọ bụ obere mfụ̀ ma ọ bụ ihe na-abaghị uru n'anya ndị ọzọ — ikekwe a gafere gị na nkwalite i tụrụ anya ya n'ọrụ gị, ma ọ bụ etikara ụgbọ-ala gị wee kwaa ngwongwo gị dị n'ime ya, ma ọ bụ ị natara akwụkwọ-ozi njụ́ n'aka onye na-ebipụta akwụkwọ, ma ọ bụ anụ-ụlọ gị na ezinụlọ gị hụrụ n'anya nwụrụ — ahụmahụ ọnwụ ndị a niile dị mkpa n'anya Chineke.
Tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, O bụ̀ ụzọ zute ụmụnne nwoke ahụ nwụrụ anwụ, bụ́ Mata na Meri. Obi gbawara ha, n'ezie. Iwe jụkwara ha obi. Ị pụrụ ịnụ iwe a n’olu ha na Jọn 11. N’otu oge, mgbe Jizọs hụrụ iru újú nke Meri na ndị ọzọ, O nwere nnukwu ọmịiko wee malite ibe ákwá.
Ị ghọtara ka nke a siri gosipụta ka obi Chineke dị? Jizọs maara na Ọ ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ — mana nke ahụ egbochighị Ya ịkwa ákwá. Ihe mgbu ha metụtara Ya. Ọ legharaghị mfụ̀ ha anya; O jiri omume Ya gosipụta na iru újú ha abụghị ihe na-abaghị uru. Ya na ha nọdụrụ ala n’ahụhụ ha na-ata, bekọtakwa ákwá.
Gịnị mere anya mmiri anyị ga-eji bụrụ ihe bara uru n'anya Chineke?
Ọ dị mfe ikwu. Ọ bụ n'ihi na anyị bara uru nyé Chineke. Ịba uru a abụghị naanị ike anyị irụpụta ihe, ma ọ bụ ịdị nsọ anyị, ma ọ bụ mmesapụ-aka anyị. N'anya Ya, ihe mgbu gị dị oké ọnu-ahia. Iru újú gị dị nsọ nye Ya. Mfụ̀ gị dị nkewapú n'ụzọ dị nsọ nye Ya.
Ya mere, mgbe ọnwụ dara, erila újú gị n'ụzọ dị osiiso. Ejila ike mechie ọnụ nke obi gị banyere iru újú gị. Ejila ike nke okwukwe ma ọ bụ ike mee ka iru újú gị dịka ọ dịghị ihe ọ bụ. Kwe onwe gị “ka ị ruo újú n'uju na n'ụzọ niile i kwesịrị” ruo ogologo oge ịchọrọ, n'ihi na oge ihe ọnwụ gị niile dị oke ọnụ ahịa n'anya Onye-nwe-anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.
More