Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Njem HabakukIhe Atụ

Habakkuk's Journey

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

"Nga N'Ihu Ịtụkwasị Chineke Obi."

Echiche Nke Onye Edemede:
Nke Mbu. Gịnị bụ isi isiokwu nke kachasị mkpa n'isiakwụkwọ a? Isiokwu nke kachasị mkpa bụ ike na ikikere nke Chineke.

Habakuk siri n’ịjụ ajụjụ banye n’ichere na n’ikpeazụ banye n’ito Chineke. Ọ ghọtara na Chineke nwere atụmatụ na ọ bụ naanị Ya nwere ike imezu ya. Ka anyị na-aga ná ndụ, anyị ga-ezute ọtụtụ n'ime ihe ndị a, ihe ga-akachasi di mkpa bụ otú anyị ga-esi kpebie iji soro ha. Dị ka ndị e kere n’onyinyo Chineke na ndi nwere onyinye nke onwe ime nhọrọ, anyị nwere ikike ime ihe n'ụzọ dị iche iche, ma mgbe a bịara na nke kachasị mkpa, ọ bụ ntụkwasị obi anyị ka Ọ na-achọ.

Mgbe ụfọdụ, Chineke ga-ekwe ka ọnọdụ anyị no na ya gabiga ókè anyị nwere ike isi mee ya ka ọ bụrụ na mgbe Ọ kpọghachitere anyị ka anyị mara na ọ bụ Ya. N'ime nke ahu ka Ọ na-emesi obi anyị ike maka ịhụnanya Ya n'ebe anyị nọ ma na-echetara anyị na ọ bụrụgodị na ọ dị ka ọ bụ naani anyị nọ n'ụzọ, Chineke agaghị, Ọ nwekataghịkwa gbahapụ anyị.

Nke Abụọ. Gịnị ka “selah” pụtara, oleekwanu otú anyị kwesịrị isi meso ya omume n'nzaghachi?

Selah bụ otu n’ime okwu ndị dị na Akwụkwọ Nsọ kpasuru echiche ọtụtụ ndị ọkà mmụta. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ gaghị ekwe omume ịmata ihe okwu ahụ pụtara n’uju ebe ọ bụ na ọ nwebeghị nsụgharị kpọmkwem a maara maka ya. N'iburu nke ahụ n'uche, enweela nyocha zuru oke maka uzo ndi esi jiri ya mee ihe iji ghọta nke ọma ihe ọ pụtara. Ya mere, n’ilekwasị anya n’ụzọ ndị ahu e jiworo ya mee ihe, ọtụtụ ndị kweere na ọ pụtara otu ihe ahụ dị ka okwu egwu, nke bụ́ “ikpọgide.”

Iche echiche banyere ya otú ahụ bụ iji ya dị ka ihe ezumike; nkwụsịtụ n'ihe a na-ekwu. Nke a bụ oge ntụgharị uche, mee ka ihe i gụrụ bamie gi n'uche ma gee ezigbo ntị n'okwu ndị a. A na-ekwu ihe dị mkpa n'oge otuto a ma onye edemede chọrọ ịhụ na e nwere oge ọ ji abiminye n'ime uche onye n'agu ya.

Nke Atọ. N'icheghachi echiche azụ n'isiokwu nke ahu bụ́ isi: Gịnị ka Habakuk na-agbalị ịgwa onye na-agụ okwu ya?

Habakuk n’ụzọ nke ya na-agbalị ime ka onye na-agụ okwu ya ghọta mkpa ọ dị ịghọta onye Chineke bụ n’ezie. Ịghọta Chineke n'amamihe, ike na ihunanya Ya na-enweghị ngwụcha, bụ ịmara onye ị nwere ike inye ntụkwasị obi gị niile. Ọ dị mfe ịjụ ajụjụ banyere ihe Chineke na-eme ma sie ike inwe ntụkwasị obi na Ọ maara kpọmkwem ihe Ọ na-eme. Dịka ndị mmadụ na-anwụ anwụ, anyị enweghị ọhụụ na-enweghị ngwụcha n'ime oge gara aga, ugbu a na n'ọdịnihu, n'ihi nke a ka anyị na-ezerekarị inwe ntụkwasị obi na Chineke na-achị ihe niile. Ọ nweghị ihe omere ịjụ ajụjụ na inwe obi ezughi oke, ebe ahụ ka okwukwe na-esi azobanye ukwu. N'ikpeazụ, Habakuk kwubiri n'ụzọ kachasị mma:

Iri Na Asato: mụ onwe m ka gā-emeri n'ime Yahweh;
Aga m aṅụrị ọṅụ n'ime Chineke nke nzọpụta m!
Iri Na Itoolu: Yahweh, bú Onye-nwe-m, bu ike m;
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị ka nke mgbada
na-emekwa ka m nwee ike ije ije n'elu ugwu!

Ngosipụta a nke nyefe na okwukwe bụ ihe niile a na-akọ. Habakuk na-egosi n’ụzọ zuru ezu ike na ikikere nke Chineke na ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Ya obi n’ihe niile nke ndụ anyị.

Nke Anọ. Olee otú anyị ga-esi ewere nke a banye n’ụwa anyị nke ugbu a ma jiri ya ruo ọrụ ná ndụ anyị kwa ụbọchị?

Azịza nke dị mfe bụ naanị ịtụkwasịkwu Chineke obi. Nke ahụ dị nnọọ mfe ikwu karịa ime ya n'ọtụtụ ọnọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka anyị na-amalite inwe ahụmahụ nke ihe isi ike, anyị na-adaberekarị na onwe anyị, sitezie n'ebe ahụ gawa n'ihu. Mgbe anyị ghọtara na anyị enweghị ike ime ya n'onwe anyị, anyị na-atụkarị ụjọ kama ịnọ n'udo n'ime Chineke. Inwe okwukwe na Chineke abụghị maka ikwere na Ya, kama ọ bụ maka ịmara na Ọ ga-akwado gị na ọ dịghị mgbe Ọ ga-ahapụ gị.

Ka emesiri, na-nlaghachi azụ n'ajụjụ a na-ajụ. Mgbe ị banyere n'ụwa gbara gburugburu, cheta na ihe ụfọdụ adighị n'nchikota gị na nke ahụ bụ ihe Chineke jiri nọro ebe a. Ọ dịghị ihe na-agbanarị Ya nakwa ihe niile ga-aza ajụjụ nye Ya. Gbalịa icheta Ilu 3:5:
Tukwasi Onye-nwe-anyị obi-gi niile, adabere-kwa-la n'uche nke-gi;

Ihe Ima Aka:
Enwere ihe ole na ole m chọrọ ịmara gị aka n'ime isiakwụkwọ a. Nke mbụ, megodi ya, gụọ Habakuk 3 ọzọ ma kwụsịtụ chebara ihe ị na-agụ echiche. Chee echiche banyere ihe Habakuk na-agwa anyị banyere Chineke na ọdịdị Ya.

Nke abụọ, ọ dị anyị mkpa ịgbalị iche echiche kwa ụbọchị otu anyị ga-esi na-atụkwasị Chineke obi anyị n'ụzọ ahuru anya. Mgbe anyị dabeere na Ya maka obere ihe na ndụ anyị, ọ na-eme ka ọ dịkwuo mfe ịdabere na Ya mgbe ihe ukwu batara. Chee echiche banyere Jemes 4:8:
Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenu ka aka-unu di ọcha, ndi-nmehie, mee kwa ka obi-unu di ọcha, ndi nwere uche abụọ!

Wepụta oge iji dabere na Chineke ma chọọ Ya n'okwu Ya. Gakwuru Ya, Ọ gā-abiakwute kwa gi. Chineke adịghị eji ike eso mmadu nakwa Ọ gaghị eme ka ịkwe Ya ka Ọ nyere gị aka. Ọ ga-abụ mkpebi gị ịtụkwasị Chineke obi ma were uche gị nyefee Ya n'aka. N'ime nke a, ị ga-achoputa na i nwekwuru udo na nkasi obi n'ime gị. Anyị apụghị ikwe ka nchegbu nke ụwa a rie echiche anyị ma mee ka anyị ghara inwe udo obi nke Chineke.

Ọ bụrụ na anyị ekwe ka uche anyị na-akpafu, ha ga na-achịkwa anyị. Debe echiche gị na nchekwa nakwa na Kraịst oge niile, i ga-ahu na omume gị ga na-egosipụta Ya.
Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Habakkuk's Journey

Atụmatụ a bụ njem site na oge siri ike jiri Habakuk.

Anyị ga-achọ ikele Tommy L. Camden II maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://portcitychurch.org/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara