Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Njem HabakukIhe Atụ

Habakkuk's Journey

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

"Nmata Habakuk Na-Aga N'ihu."

Echiche nke onye edemede:
1. Olee isiokwu kacha pụta ìhè mgbe ị gụrụ Habakuk 1?
E nwere isiokwu gbara ọkpụrụkpụ nke bụ́ “Gịnị mere Chineke ga-eji kwere ka ihe ọjọọ na-agafegide ihe ọma.”

Ajụjụ a bụ otu ezigbo ajụjụ nke ndụ taa. Mgbe anyị lere anya n’ụwa anyị bi n'ime ya, anyị na-ajụkarị ajụjụ a. Agbanyeghị nke a, ikwu eziokwu, nke a bụ ajụjụ n'ezighi ezi. Ajụjụ nke ka mma bụ; gini ka Chineke n'eme site n'ihe ọjọọ a niile?

2. Gịnị mere i ji chee na akwụkwọ a so wee banye n'ime akwụkwọ ndi e kwetere na ha bụ Akwụkwọ Nsọ? Gịnị ka i chere bụ nzube Chineke maka isiakwụkwọ a?

Mgbe m gụrụ nke a, ahụrụ m ozugbo na Habakuk no na-ajụ Chineke ajụjụ maka na Ọ naghị eme ka Ọ kwesiri maka ihe ndi ọjọọ n'eme. Echiche m dọọrọ gawa n'ụzọ abụọ: Nke mbụ, nke ahụ bụ okwu Habakuk kwuru n'atụghị egwu na nke abụọ, gịnị kpatara ọ ji wee nwee obi ike mee nke a?

Isiakwụkwọ nke a bụ ngosipụta nke amara na ịhụnanya. Dị ka Ndị Kraịst, anyị maara na Chineke nwere ikike kasịnụ n'ihe niile nwere ike ime, ma ọ bụ nke ga-eme. N’ime nke ahụ, ọ na-adị anyị ka à ga-asị na anyị ijụ ajụjụ maka ihe ndị anyị na-aghọtaghị bụ ịgbagha ọchịchị Chineke.

Nke a bụ ebumnuche nke akwụkwọ a. Ọ dịghi ihe ọ mere ma anyị nwee ma o bụ jụọ ọbụnadi Chineke ajụjụ. Ọ dịghị mgbe Chineke bu n'obi ka anyị bụrụ ndi na-enweghị uche nke aka anyị, ndi n'enweghị ọpụrụ iche ọbụla, ma burukwa Ndị Kraịst n'enweghị njirimara nke onwe anyị ọbụla. Ọ dịghi ihe omere ma anyị jụọ Chineke ihe mere ihe ji dị otu a, na ọbụna ihe Ọ na-eme gbasara ya. Azịza Ya nye Habakuk abụghị atụmatụ zuru ezu: isi ihe a ga-amuta n'nke a bụ na Chineke maara na ọ dị njọ, mana Ọ nwere ikike n'elu ya niile.

3. Gịnị bụ nchegbu n'oge e dere ihe a?
Ọgba aghara obodo dị gburugburu. Mba Izrel nọ n’oge egwu ka ọ bụ na ndị Babịlọn no n'eto n'ike n'ike. Ha no na-ejegharị na mba dị iche iche na-ewere ma na-achi ha. Egwu Ndị Izrel bụ na ha ga-abụ ndi sote aga ewere ma chia. Habakuk nọ na-elegharị anya ná mba ndị gbara ha gburugburu ma na-ahụ ọganihu aku n'uba na ọganihu nke ibu agha nke mba Ndị Izrel weere dị ka mba aghụghọ. Ihu nke a ma mara na Izrel nọ n'anya-ha, na Izrel di ajọ omume karia ezi omume, ma ekwule ekwu na iwu nke Chineke ka a na-eleghara anya ebe ihe ọjọọ di ka a na-akwado ya.

4. Olee otú e si sụgharịa ya ka ọ metụta anyị n'ebe anyị nọ ugbu a?
Ọgbọ anyị erutela n'ókè nke bu na akara ndị ahu dị n'etiti ezi ihe na ihe ọjọọ di ka ehichara ha ehicha. Elu buzi ala ma nwamba na nkịta na-egwuritazi egwu, yabụ keduzi ihe ziri ezi? Mgbe anyị leghariri anya gburugburu anyị na-enwe mmetụta nke odi mkpa ịjụ ajụjụ, mana anyị na-akwusi n'ihi egwu. Maka ụfọdụ ọ bụ egwu nke ịjụ ajụjụ na ndị ọzọ ọ bụ egwu nke azịza ha ga-enweta. Ihe anyi ga-ewepụ na nke a bụ na
anyị ga-aghọta, gaa n'ihu wee jụọ ajụjụ, mana anyị ga-amarakwa na Chineke ji anyị n'aka Ya na Ọ nwekwara atụmatụ nke Ya. Anyị na-ahụ ka onye iro na-azo ije n'aga n'ihu, a na-alụsokwa Ndị Kraịst ọgụ n’ụwa niile, ma e nwere ìhè maka anyị. Habakuk bụ ntọala maka ikike anyị nwere ịgwa Nna anyị okwu n'enweghị ujo ọbụla. Otu onyinye nke anyị nwetara n'aka Jizọs bụ na anyị nwere ike ịgakwuru Ya ozugbo banyere ihe ọ bụla na n'oge ọ bụla. Gwa Nna gị okwu n'ihi na Ọ na-eche banyere ihe gbasara gị mgbe niile.

Ihe ịma aka:
Gụọ Habakuk otu ugboro ọzọ ma gbalịa ịhụ ozi ya dị ka olileanya maka ihe ndị ga-abịa.

Mgbe Habakuk dere ihe a, ọ hụrụ ụzọ mbibi nke ndị gbara ya gburugburu n'ebi, mana ọ hapụrụ idakwasi n’ebe edere n'Akwụkwọ Nsọ ahụ nke ọ ji wee tolite. Jenesis 50:20 na-ekwu sị: “Ị kpara nkata ọjọọ megide m; Chineke zubere ya ka ọ dị mma iji wee weta ihe dị ugbu a–nlanarị nke ọtụtụ mmadụ.” Ndia bụ okwu Josef gwara umu-nne ya. Ha rere ya ka ọ bụrụ ohu ma mgbe ha jikọtara ọnụ, ha tụrụ egwu maka mmegwara ya, mana Josef enweghị mgbe ọ hapụru ntụkwasị obi ya n’atụmatụ Chineke. N'ọnọdụ ọjọọ ọ bụla, enwere ihe dị mma nke ga-esi na ya pụta ọbụna mgbe anyị na-ahụghị ya.
Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Habakkuk's Journey

Atụmatụ a bụ njem site na oge siri ike jiri Habakuk.

Anyị ga-achọ ikele Tommy L. Camden II maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://portcitychurch.org/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara