Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Njem HabakukIhe Atụ

Habakkuk's Journey

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

"Nganihu Ichere Na Chineke."

Echiche Nke Onye Edemede:
Nke Mbụ. Lekwasị anya n'amaokwu nke mbụ nwa oge ma chee echiche banyere mkpa amaokwu a dị. Kọwaa echiche gị maka nke a.

Habakuk doro nnọọ anya n’ihe ọ na-eme. Ọ nọ na-eche ka Chineke za ya, ma gịnị mere amaokwu nke mbụ jiri dị mkpa? Azịza dị mfe bụ na ọ bụ ihe ngosi nke otú anyị kwesịrị isi chere azịza Chineke. Ka ọ na-eche nzaghachi ọ guzosiri ọtọ ike. Dịka onye Marine na-alụbu ọgụ, amaara m mkpa ọ dị idobe ọkwa gị na ime ya nke ọma.

Habakuk anọdighị naani ala na-ekwu na ya ga-eme ihe ozugbo ya nwetara azịza, kama ọ sịrị na ya ga-anọgide na-eche nche ka ya siri guzogide ma na-echere ịnụ ihe si n’ọnụ Chineke. Ihe ọzọ e kwesịrị ịrịba ama bụ na Habakuk nọ na-eme atụmatụ nke azịza ya nye azịza Chineke. Ọ nọ na-adị njikere ịzaghachi Chineke n'ụzọ ụfọdụ.

Nke a na-echetara m mkpọsa nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe onye ndoro-ndoro ochichi na-azọ ọkwa ụfọdụ, ha na-akwadokarị maka nsonaazụ ọ bụla. Ha na-enwekarị okwu nnabata na okwu nkwenye nke ha kwadoro. Nke a bụ ụzọ isi gosi na ha dị njikere ido onwe ha n'okpuru ndị ọchịchị na-achị ha. Maka ndị ọchịchị a họpụtara ahọpụta, ọ bụ nhọrọ ndị mmadụ, na nke Habakuk ọ bụ ido onwe ya n'okpuru Chineke.

Nke abụọ. Olee otú Chineke si za Habakuk, gịnịkwa ka nke a kwuru banyere otú anyị kwesịrị isi na-ege ntị?

Dị ka anyị niile maara, ụzọ Chineke abụghị ka anyị tụrụ anya mgbe niile, ma ọ bụ na-eche na ha kwesịrị ịdị. Chineke kpebiri ịgwa Habakuk ka ọ detuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Nke ahụ bụ ihe siri ike ilo mgbe ụfọdụ. N'ọgbọ nke ugbu a, inwe afọ ojuju ngwa ngwa gbara anyị gburugburu. Anyị bi n'ọgbọ nke ndi ihe niile di ọsọ ọsọ, ndị chọrọ ịhụ nsonaazụ ugbu a. Anyị chọrọ ka mkpebi mee ozugbo ozugbo, mana ọ bụghị mgbe niile ka ọ bụ ihe kacha mma nye anyị.

Chineke maara nke a ma were oge a mee ka Habakuk mata, nwee ndidi, ihe ndi ịna ele anya adịghị mgbe niile ka I si chee na ha dị. Ọ nwere ike ịdị ka ọnọdụ na-agaghị ekwe omume, ma Chineke maara ihe Ọ na-eme. Ndidi abụghị omume ọma dị mfe ịmenyere onye ọ bụla. Ndidi bụ ima mgbe ị GA-ECHERE na mgbe ị ga-agawa n'ihu. Ndidi pụtara mgbe ụfọdụ na ị ga-eche ka Chineke mechaa tupu ị kpebie ịgawa n'ihu. Nke a bụ ahụmahụ nke Habakuk ga-enwe. Ọ bụ oge Chineke ga-aga n'ihu ma ya bụ Habakuk e nwee ndidi.

Nke atọ. N’ihi gịnị ka I ji chee na Chineke ji jiri okwu ahụ bụ́ “ahụhụ” mee ihe mgbe Ọ na-agwa Habakuk okwu, kama iji okwu ọzọ dị ka “abụm ọnụ”?

Okwu ahu bụ Ahụhụ bụ okwu e ji eme ebere. Nke a bụ ihe ịma aka nye onye na-agụ ya, obughikwa okwu ekwuru nye oha. Ọ dị mfe ịsị, "Lee ihe ịga nke ọma niile ha nwere, ọ dị m ka ya bụrụ na m nwere ụfọdụ n'ime ya." Ihe Chineke chọrọ ime ka anyị mara bụ na ndị e depụtara aha ha abụghị ndi anyị kwesịrị inwere anyaụfụ, kama ha bụ ndị anyị ga na-enwere obi ebere. Ọ bụghị n'ụzọ n'anyị ga-amalite ina-ekpe ha ikpe, kama ọ bụ n'ụzọ na anyị ga na-eti mkpu nrịọchite maka ha. Ndụ mmehie abụghị ihe a ga-enwere anyaụfụ.

Kapil Dev, onye bụbu onye n'egwu egwuregwu nke kriketi si India, kwuru ya n'ụzọ kacha mma mgbe ọ siri, “N'ikpeazụ, ekweere m na ịkwụwa aka ọtọ bụ uzo omume kacha mma. Mmadụ nwere ike ịlanarị site n'akwụwaghi aka ya ọtọ ruo nwa oge, ma n'ikpeazụ, ịkwụwa aka ọtọ bụ ihe na-akwụ ụgwọ." Onye na-adịghị akwụwa aka ya ọtọ na-echekarị na ajọ omume ya ga-alaghachikwute ya, nke ahụ abụghịkwa ụzọ isi bie ndụ nke Chineke jiri gọzie gị.

Nke anọ. Olee otú anyị ga-esi were nke a mee ihe n'ime ndụ anyị kwa ụbọchị?

E nwere ọtụtụ ụzọ dị irè isi tinye ihe isiakwụkwọ a na-akụzi n’ọrụ, ma eleghị anya, ihe kasị mma bụ inwe ndidi n’ebe Chineke nọ n’ihi na Ọ hapụbeghị gị. Ị nweghị ike ileghara okwa ime mmụọ gị anya ka ị na-eche ka Chineke zaa ajụjụ gị. Chineke zuru oke n'ihe niile, ọbụlagọdi n'oge Ya, ma ọ bụrụ na anyị eleghara ọkwa ime mmụọ anyị anya ka anyị na-echere Ya, anyị adịghị mma karịa ohu ahụ nwere otu nkà na Matiu 25: 24-26.

24 “Onye ahụ nke natara otu nkà bịakwara nso sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m gị. Ị bụ nwoke siri ike, na-aghọrọ mkpụrụ n'ebe ị na-akụghị ma na-achịkọta ebe ị na-agbasaghị mkpụrụ.


25 Ya mere m ji wee tụọ egwu wee pụọ wee zoo nkà gị n’ime ala. Lee, i nwere ihe bụ nke gị.’

26 “Mana nna ya ukwu zara ya, sị, ‘Ajọ ohu, na onye umengwụ dị ka gị! Ọ bụrụ na ị maara na m na-aghọrọ mkpụrụ n'ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-ekpokọtakwa ebe m na-agbasaghị;
Ruo ọrụ turu anya n'ihe Chineke nyeworo gị, Ọ ga-agọzikwa gị. Enwela akpiri n'ihe ị na-enweghị, mana n'ihe niile na-enye Onye kere eluigwe na ụwa ekele.

Ihe Ịma Aka:
Wepụta oge taa tụgharịa uche n'ihe ị nwere na otu i siri nweta ya. Gị na Chineke kwurịta okwu ma mee ka Ọ mara na obi juru gị n'ekele. Nnukwu ihe ịma aka m bụ gị ime ka Chineke mara na ị ga-anọgide na-eguzosi ike na nche ka ị na-echere Ya.
Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Habakkuk's Journey

Atụmatụ a bụ njem site na oge siri ike jiri Habakuk.

More

Anyị ga-achọ ikele Tommy L. Camden II maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://portcitychurch.org/