Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Njem HabakukIhe Atụ

Habakkuk's Journey

ỤBỌCHỊ 5 NKE 6

"Itụkwasị Chineke Obi"

Ihe Ofufe:
Dịka Ndị Kraịst anyị na-adaberekarị n'ịhụnanya Chineke ma na-elekwasi anya n'ebere Ya. Anyị na-echefukarị na n'ime ịhụnanya Ya, ọnụma dịkwa, mana ajụjụ a na-ajụ bụ gịnị kpatara anyị ji echezọ nke a? Àjà ahụ Ọ chụrụ maka anyị bụ nnukwu onyinye ịhụnanya nke n'eme na ọ na-emeri ngwa ngwa ihe oyiyi nke ọnụma Ya. Otu eziokwu dị mfe pụtara ìhè; Chineke bụ Chineke onye ezi omume, Ọ gaghị awụkwasịkwa ọnụma Ya n’elu ụwa na-erughị ọmụma ikpe mmeghie, Chineke abụghịkwa Onye obi na-elu ilu. Ịhụnanya Ọ nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ dị ukwuu nke mere na Ọ na-edubakarị Ya ọbụna n’imegide ihe nke Ya Onwe Ya chọrọ.

N’otu oge, anụrụ m ka a jụrụ otu onye na-ekwulara Chineke, sị, “Ọ bụrụ na Chineke bụ Onye ịhụnanya, gịnị mere Ọ ji eziga ndị mmadụ ka ha gaa ọkụ mmụọ?” Azịza ya nye nke a nwere mmetụta mgbanwe n'ụzọ m si chee banyere ya. N'ịkọwa okwu ahụ n'nkenke, "Ihe omume nke ịnọ n'ọkụ mmụọ bụ nke ikewapụ na Chineke, na n'ime nke ahu Chineke n'ezie bụ Onye ịhụnanya n'ihi na Ọ na-akwanyere nnwere onwe ime nhọrọ ugwu. Ọ bụrụ na mmadụ ahọrọ anọghị Ya nso na ndụ, Ọ gaghị amanye onye ahu ka ya na Ya nọrọ n’ọnwụ.” Ihe nke a pụtara dị ịtụnanya ebe 2 Pita 3:9 na-agwa anyị:

Onye-nwe-anyị adighị egbu oge banyere nkwa Ya, dịka ụfọdụ na-aghọta igbu oge, kama Ọ na-enwere gị ndidi, n'achọghị ka onye ọ bụla laa n'iyi kama ka ha niile bịa na nchegharị.

Ajụjụ Ntụgharị Uche Nkeonwe:
Wepụta oge chebara ajụjụ ndị a echiche tupu ị gawa n'ihu.
Zaa ha n'eziokwu na nkọwapụta dịka ọ kwere gị mee ma dịrị njikere maka echiche nke onye edemede echi.

Nke Mbụ. Gịnị bụ isi isiokwu nke isiakwụkwọ a?

Nke abụọ. Gịnị ka “selah” pụtara, oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n'aziza nye ya?

Nke atọ. N'icheghachi echiche azụ n'isiokwu bụ́ isi: Gịnị ka Habakuk na-agbalị ịgwa onye na-agụ okwu ya?

Nke anọ. Olee otú anyị ga-esi were nke a banye n’ụwa anyị bị n'ime ya ugbu a ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị kwa ụbọchị?

ụbọchị_nke ise?
Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Habakkuk's Journey

Atụmatụ a bụ njem site na oge siri ike jiri Habakuk.

Anyị ga-achọ ikele Tommy L. Camden II maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://portcitychurch.org/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara