Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

HABAKUK 3

3
1Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.
2Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu:
Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile,
N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya;
N'oké iwe cheta obi-ebere.
3Chineke si na Timan nābia,
Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah
Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,
Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.
4Onwunwu-Ya di ka ìhè;
Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya:
Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.
5N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga,
Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.
6O guzoro, we tùa uwa;
O lere anya, we me ka mba nile kuja:
Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi,
Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala;
Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.
7N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan:
Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.
8Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide?
Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide?
Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide?
Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile,
N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.
9Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ;
Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi. Selah
I nēji osimiri b͕awa ala.
10Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali;
Okè miri-ozuzo gabigara:
Ob͕u-miri mere ka olu-ya da,
Chilie aka-ya elu.
11Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha;
N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga,
N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.
12N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala,
N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.
13I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,
Izọputa onye-Gi etere manu;
I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu,
B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah
14I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:
Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:
Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.
15I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri,
Bú obo nke ọtutu miri.
16Anurum, afọm we ma jijiji,
N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;
Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji:
Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu,
Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.
17Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,
Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;
Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,
Na ubi nile emeghi ihe-oriri;
Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,
Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:
18Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,
M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.
19Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,
Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,
Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije.
Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

HABAKUK 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye