Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Njem HabakukIhe Atụ

Habakkuk's Journey

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

"Ichere Na Chineke"

Nraranye:
Ka Habakuk na-aga n’ihu n’nkparịta ụka ya na Onye-nwe-anyị, ọ dị ka enwere ajụjụ ndị ọzọ. N'isi nke abụọ, Chineke na-ekpughe otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ nke dịka ọtụtụ ndị mmadu ha anaghị ahu ya. Chineke nyere ihe ngwọta dị mfe maka nsogbu ndị siri ike, ma n'otu oge ahụ ka Ọ na-ajụ ajụjụ siri ike nye uche nwere nghọta.

Ụzọ Chineke zuru okè nye Onwe Ya, na n'ihi na anyị adịghị ele anya n'otu oge na ịdị adị, anyị anaghị ama mgbe niile ebe Ọ na-aga na ihe anyị na-agabiga. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abịarute ịnakwere na Chineke maara ihe Ọ na-eme na anyị ga-ahapụrịrị uche anyị ma tụkwasị obi n'nke Ya.

Ajụjụ Ntụgharị Uche Nkeonwe:
Wepụta oge chebara ajụjụ ndị a echiche tupu ị gawa n'ihu.
Zaa ha n'eziokwu na nkọwapụta dịka ọ kwere gị mee ma dịrị njikere maka echiche nke onye edemede echi.

1. Lekwasị anya n'amaokwu nke mbụ nwa oge ma chee echiche banyere mkpa amaokwu a dị. Kọwaa echiche gị maka nke a.

2. Olee otú Chineke si họrọ iza Habakuk, gịnịkwa ka ọ kwuru banyere otú anyị kwesịrị isi na-ege ntị?

3. N’ihi gịnị ka iji chee na Chineke ji jiri okwu ahụ bụ́ “ahụhụ” mgbe Ọ na-agwa Habakuk okwu kama iji okwu ọzọ dị ka “abụm ọnụ”?

4. Olee otú anyị ga-esi were nke a mee ihe n'ime ndụ anyị kwa ụbọchị?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Habakkuk's Journey

Atụmatụ a bụ njem site na oge siri ike jiri Habakuk.

Anyị ga-achọ ikele Tommy L. Camden II maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://portcitychurch.org/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara