Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ
N'ihi Na Akwụkwọ Nsọ Na-agwa M Otú Ahụ
Dị ka Ndị Kraịst, anyị ahọrọla Akwụkwọ Nsọ dị ka ụkpụrụ n'adịghị agbanwe agbanwe maka ihe niile anyị n'eme ma kwere na ya n'ihi na Jizọs mere otú ahụ. Anyị ga-agụriri ma rubere Okwu Chineke isi iji mata ndị anyị bụ na Kraịst. Jizọs kwuru na e guzosiri Okwu Chineke ọbụla ike n’eluigwe na n’ụwa dum—karịa dị ka ọ dị na mbara ala ụwa a anyị n'eje ije na ya. Ọ di mfe elu-igwe na uwa ikpochapụ, karịa ka mpempe akụkụ ọbụla nke Iwu nke Okwu Chineke ịhichapụ. (Luk 16:17)
Okwu Chineke na-enyekwa anyị ntachi obi, agbamume na olileanya ka anyị na-eso Jizọs n’ụwa dị mgbaji. Ka ị na-eso Jizọs ma n'ekwe ka Okwu Chineke gbanwee gị, Ọ ga-ewughachi gị ka ị wee nwee ike ịrụ ọrụ n'akụkụ ọbụla: mmekọrịta gị gasị, echiche gị gasị, àgwà gị gasị, na nhọrọ gị gasị.
N'ime ụwa nke n'adịghị nguzosi ike, na-achighari achighari, dị ize ndụ na nke na-adịghị enye obi ume ala, Chineke chọrọ ime ka ị kwụsie ike. Karịsịa nke ahụ, Chineke nwere ọrụ dị nma gasị Ọ chọrọ ka ị n'arụ. Chineke chọrọ ịme gị ka ị bụrụ onye n'amita mkpụrụ. Ọ chọrọ ime gị ka ị bụrụ ìhè n'ọchịchịrị dịnụ. Chineke ga-eji gị rụọ ọrụ na gburugburu gị nakwa na ndụ gị. Ọ ga-eme nke a ka ị na-edo onwe gị n'okpuru Okwu Chineke ma kwe ka Ọ meziwanye gị ma mee ka ị dịkwuo nma.
Onye ọbụla n’ime anyị bụ ọrụ na-aga n’ihu. Mgbe ịchọtara akụkụ ọzọ nke ndụ gị nke na-abụghị ebe gị ma ọ bụ Chineke chọrọ ka ọ dị, obi gị adala mbà. Mgbe ịchọtara mmehie ọhụrụ n'ime obi gị ma ọ bụ kpughee ụfọdụ ihe jọrọ njọ na ndụ gị, enwela obi nkụda. Ọrụ mweghachi ọbụla bụ ọrụ na-aga n'ihu, ma onye ọ bụla na-eso ụzọ Jizọs bụkwa ọrụ na-aga n'ihu.
Okwu Chineke dịkwa ka akwụkwọ nduzi ụzọ. Nke a bụ ihe m chọpụtara gbasara akwụkwọ nduzi ụzọ gasị. Ma ị na-eji akwụkwọ nduzi ụzọ edere ede ma ma ọ bụ nke nọ na ngwá, ị ghaghị ịtụkwasị ndị mepụtara yabụ akwụkwọ nduzi ụzọ edere ede ma ọ bụ nke ahụ dị na ngwá obi. Otu ahụ ka ọ dịkwa nye Okwu Chineke. Enwere ụfọdụ oge anyị na-eche, ọ dị m mkpa ka m gaa aka nri, mana Okwu Chineke na-agwa m ka m gaa aka ekpe. Obi gị sie ike ịtụkwasị Okwu Chineke obi n'ọnọdụ niile.
Iso Ụzọ Kraịst na ihe ndị dị mkpa anyị lere anya site n’ederede abụ ahụ bụ Jizọs Hụrụ M N’anya n'eme ka ihe dị́ iche ná ndụ anyị n'ebi ugbu a ma n'ụwa. Ka Chineke na-eme ka echiche gị dị ọhụrụ, site na nrube isi gị na site n'ike nke Mmụọ Nsọ, ị ga-amalite ibi ndụ site n'ebe nke ezi okike gị ahụ wee n'enwe ahụmịhe nke mejupụta na nzube nke Chineke kwadebere maka gị.
Ị nwere usoro kwudosiri ike na nke n'adịghị akwụsị akwụsị nke ịgụ Okwu Chineke? Ọ bụrụ na ịnweghị, mee mkpebi ahụ ụbọchị taa.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.
More