Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ
Hụrụ̀
Taa, anyị na-eleba anya n’ihe ahụ Mezaịya—Jizọs Kraịst—mere pụtara, n’ihi na omume Ya na-egosi ihe isi ịhụnanya bụ. Ọ tọgbọrọ ndụ Ya iji kwụọ ụgwọ maka mmehie nke ụwa—ịkwụ ugwo maka mmehie gị na nke m. Ya mere, gịnị ka ọ pụtara ịsị, "Jizọs hụrụ m n'anya?" Gịnị ka okwu ahụ bụ “ịhụnanya” pụtara?
Jizọs ji obi Ya niile tọgbọọ ndụ Ya n’obe ka Ọ napụta gị n’aka mmehie na n'ọnwụ. Ugbu a ndụ ọhụrụ dị ozugbo ị kweere na Ya ma nata onyinye nzọpụta Ya. Nke a pụtara na ị nwere ike nweta:
udo n'ọnọdụ nchegbu chọrọ igbu gị egbu,
nnwere-onwe n'ọnọdụ ihere ebe ikpe ọmụma chọrọ ịchịkwa ndụ gị,
nnwere-onwe n'ọnọdụ mmehie chọrọ ime gị ohù ya,
ọdịdị nke izu oke ime mmụọ (ịdị nsọ)
nnabata n’ime ezinụlọ nke Chineke kama gị ibi naanị gị,
na mmesi obi ike na a hụrụ gị n'anya.
Nke a pụtara na ị dị mmasị nye onye kachasị dị ogo nọ n'ime ụlọ, bụ onye kachasị dị oké n'eluigwe na ụwa. Ma nke a pụtara na Jizọs—bụ́ Chineke—gosipụtara ịhụnanya Ya n’ebe ị nọ n’ụzọ kasị dị ịrịba ama: Ọ ji obi Ya niile chụọ ndụ Ya ka àjà iji napụta gị.
Ka anya gị n'emepekwu na nkwenye gbasara ịhụnanya Chineke n'ebe ị nọ, nke a bụ ekpere iji nyere gị aka ịme ka nkwenye gị ahụ bụrụ nke nke-onwe na Jizọs gosipụtara ịhụnanya Ya n'ebe ị nọ mgbe Ọ tara ahụhụ n'elu obe.
Ọ̀ Dị M N'obì Jizọs,
A na m ahọrọ ịnata mgbaghara nke Ị mere ka o kwe omume ịnata mgbe Ị nwụrụ n'elu obe maka m. Ekwenyere m na Ị gosiputara ihunanya Gị n'ebe m nọ mgbe Ị kwụrụ ụgwọ iji napụta m. A na m ekele Gị maka iburu mmehie m n'ahụ Gị. A na m ekele Gị maka ịnwụ n'ọnọdụ m. A na m ekele Gị maka inye onyinye gasị nke mgbaghara, ndụ ebighi ebi, na mmekọrịta ziri ezi na Chineke. Jizọs, Ị ji omume gosipụta ihunanya Gị n’ebe m nọ. Nyere m aka ugbu a ka m gosipụta ịhụnanya m n'ebe Ị nọ site n'omume m. Amen.
Ka a n'ekwu, gịnị bụ omume kachasị dị ịchụ onwe-onye ka àjà nke mmadụ pụrụ ime iji gosi ịhụnanya ya n’ebe onye ọzọ nọ? Jizọs zara ajụjụ ahụ. Nke a bụ ihe Ọ kwuru: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka ukwuu karịa nke a: mmadụ ịtọgbọ ndụ ya maka ndị enyi ya” (Jọn 15:13). Mgbe Jizọs kwuru okwu a, Ọ nọ n'ebu amụma gbasara ihe Ọ ga-eme n’elu obe: ịtọgbọ ndụ Ya n’ihi gị, bụ enyi Ya.
Ịhụnanya na-egosipụta onwe ya n'omume ka oge na-aga, na ka omume na-adịwanye ịchụ onwe-onye ka àjà, ka yabụ ịhụnanya n'esikwu ike. Kedụ otu ị si egosi ndị mmadụ nọ na ndụ gị na ị hụrụ ha n'anya?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.
More