Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ

Jesus Loves Me

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Mụ N'anya

Ọ bụ ihe n'adọrọ mmasị iche echiche banyere ụmụ mmadụ n’ụzọ Chineke si ahụ ha—ọtụtụ narị nde mmadụ nke ọbụla na-eme ọtụtụ puku nhọrọ kwa ụbọchị. Chineke na-ahụ igbu mmadụ gasị na-emenụ. Ọ na-ahụ azụmahịa gasị nke ọgwụ ndị n'egbu mmadụ. Ọ na-ahụ nne dị ime bụ́ onye na-aṅụ cocaine, na-emebi nwa nọ ya n'afọ. Ọ na-ahụ ka ndị di na ndị nna n'emegbu ma n'emebisi ndị e kere ha ka ha chebe. Ọ na-ahụ agha gasị na ịkpa ókè agbụrụ dịnụ, ịkpọasị, na ikpe na-ezighị ezi dịnụ.

N'otu oge ahụ, kwa ụbọchị, Chineke na-ahụ ọtụtụ nde ndị ezigbo nne ka ha n'agugù ụmụ ha akwa, n'elekọta ha anya n'abalị. Ọ na-ahụ ndị nna dị ịhụ n’anya na-akụziri ụmụ ha nwaanyị otu esi agba ígwè. Ọ na-ahụ ka ndị dike n'achụ ndụ ha na udo nkeonwe ha ka àjà iji napụta ndị ọzọ.

Mgbe Chineke na-ahụ ọgbaghara a nke ihe akpọrọ mmadụ—ndị ọma na ndị ọjọọ—kedụ ihe n'adị Ya n'obi? Ana m atụ aro na otu ajụjụ a—Kedụ otú Chineke si ahụ m?— n'aza ajụjụ niile nke ụmụ mmadụ dum na-ajụ.

Chineke na-ahụ ihe mebiri emebi dị ebube Ọ na-agụsi Ya agụụ ike iweghachi.

  • Dị Ebube. Emere gị n’oyiyi Chineke. Ị nwere uru na ùgwù nke onye ọbụla n'enweghị ike ịnapụ gị.
  • Dị Mmebi. Dị ka mụ na onye ọbụla ọzọ ị ga-ezute, ihe ọjọọ dị n'ụwa emetụla gị aka ruo n'ókè ụfọdụ.
  • Dị Nkwesị Mweghachi. Chineke chọrọ iweghachi gị na otu Ọ sịrị mee gị na mbụ. Ọ chọrọ ka ị na-ebi ndụ na-enweghị ihe mmebi ọbụla dị na ya; nke egwù ọnwụ adịghị na ya; nke n'enweghị nkewa, ihe mgbu, ntirisi, ma ọ bụ ụdị ihe ọjọọ ọbụla.

Mmadụ ọbụla, n'agbanyeghị otú o si dị njọ, dị ntirisi, ma ọ bụ bụrụ onye afọ ọjọọ, ka bu n'ime ya akara na ihe ngosi nke ebube mbụ a Chineke nyere mmadụ niile.

N'otu oge ahụ kwa, mmadụ ọbụla, n'agbanyeghị otú ọ si dị nkà, nwe omume ọma, ma ọ bụ bụrụ ezigbo mmadụ, ka dị mmetọ ruo n'ókè ụfọdụ site n'ihe ọjọọ nke jupụtara n'ụwa a na mmehie nke anyị niile meworò nhọrọ.

Na Ndị Efesọs 2:10, Chineke na-akọwa gị dị ka ihe mmepụta Ya kachasị dị mma, poemaa kwọrọ aka mee; nke ahụ bụ okwu Grik anyị si nweta okwu anyị bụ "poem." Na mgbe ebighị ebi, anyị bụ ndị tụkwasịrị Nna-anyị-ukwu obi na Ọ ga-eweghachi anyị ga-egosipụta mmuke Ya, na-ekwupụta na ọ bụghị nanị na Ọ bụ onye kachasị dị ike n'eluigwe na n'ụwa, ọ bụghị nanị na Ọ bụ Onye Okike n'enweghị onye ma ọ bụ ihe aga-eji tụnyere Ya, ma Ọ bụkwa Onye Mgbapụta Kasịnụ, Onye na-eweghachi ihe onye iro zubere ibibi. Nke a bụ onye anyị bụ n’ime Kraịst.


Kedụ akụkụ nke ndụ gị ị maara nke ọma maka ọnọdụ gị dị 'mmebi'? Kedụ akụkụ nke ndụ gị ọ kacha dị gị mkpa iji ike “nweghachi” nke Chineke mee ka ị dị ọhụrụ?

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Jesus Loves Me

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.

More

Anyi ga-achọ ikele Baker Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://bakerbookhouse.com/products/235847