Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ

Jesus Loves Me

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Gịnị Mere Ọ Ji Dị Mkpa Ka Ị Gụọ Nke A?

Jisọs kwụrụ sị, "Mụ onwe m bịara ka unu wee nwee ndụ, ma nwebiga ya oke" (Jọn 10:10). Jisọs bịara ka o kunye anyị ndụ. Ọ bịara ịkụnye anyị ndụ ebighị ebi ka anyị na Chineke wee nọdụ n'eluigwe oge anyị ga-rapu ụwa a. Ọ bịara ikunye onye ọ bụla kwere na ya ma nara onyinye efu nke nzọpụta ọ nyere anyị ndụ.

Mgbe ọ bụla anyị nwụrụ na mmehie anyị, Jisọs na-abata ka ọ nyeghachi anyị ndụ ọhụrụ. Mmadụ niile - na mpaghari ụwa na okpukpere dị iche na iche- na-achọsi mmekọrịta Jisọs n'enye ike. Chineke bịara na uwa ka ọ wee napụta anyị na njọ.

Dịka ndị nke Kraịst, ọ bụ Jisọs a ka anyị kwenyere - ọ bụghị naani ezigbo mmadụ ma ọ bụ echiche zuru oke. Anyị kwere na Jisọs nke bụ Chineke yiri anụ arụ, onye nzọpụta nwụrụ n'elu obe maka njọ ụwa nile ma si n'ọnwụ bilie.

Ebe ọtụtụ ndị nke Kraịst ghọtara eziokwu a, olileanya m bụ ị nyere gị aka ịza ajụjụ a, Gịnị ka m kwenyere dika nwa Chineke? Ebe ọtụtụ mmadụ n'ụwa a ji akọnuche ha akọwa ndu nke iso Kraist, ọ dị mkpa na anyị ga aghọta na nkwenye anyị na Kraịst bụ eziokwu n'enweghị mgbanwe. Site na eziokwu a ka ji anyị nara mgbaghara na ndụ ọhụụ Kraịst n'enye. Okwu a si n'ebe Chineke nọ bia, ọ bụghị n'ọnụ mmadụ. Ọ bụ okwu n'enweghị mgbanwe, nke mmadụ ọ bụla pụrụ ịghọta.

N'okpuru ụlọ ewusiri ike, e nwere ntọala adịghị ahụ anya n'ejidesi ụlọ ahụ ike. Ọ bụ ntọala a ka ihe ọmụmụ anyị ga-enye anyị maka okwukwe anyi n'iso Kraịst. I hapụ otu n'ime nkwenye a di oke mkpa ga-eme ka okwukwe gị daa.

N'otu aka ahụ, ịdebe nkụzi a di mkpa maka ntọala okwukwe gị, ị ga-ahụ ka Chineke ga-esi mee ka ndụ bụrụ ihe e wusiri ike. Okwu Chineke na-akọwa eziokwu a. Akwụkwọ ọmụmụ a ga-enyere gị aka inyocha ntọala nkwenye gị dika onye nke Kraịst k'i wee wuo ndụ oke okwukwe. Ọ bụ naanị mgbe anyị kwenyere okwu Chineke ma tinye ya n'ọlụ ka anyị ga-eto. Ọ bụ ebumnobi m na na ngwusi ihe ọmụmụa, na anyi g'eto eto n'ime ịhụnanya Kraist, ma kwudosie ike na nkwenye anyị ma dikwazia ike irubere Chineke isi.


Kedụ ka ị g'esi za ajụjụ a, "Gịnị ka m kwenyere dika onye nke Kraịst?"

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Jesus Loves Me

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.

More

Anyi ga-achọ ikele Baker Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://bakerbookhouse.com/products/235847