Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ

Jesus Loves Me

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Jizọs—Zuru Oke Ka Chineke na Zukwaa Oke Ka Mmadụ 

Jizọs bụ Chineke zuru oke: “Na mbụ ka Okwu [Jizọs] dị, Okwu ahụ na Chineke dịkọtara, Okwu ahụ bụkwa Chineke” (Jọn 1:1). Jizọs bụ mmadụ n’ụzọ zuru ezu: “Nwee otu echiche dị ka Kraịst Jizọs nwere: Onye, bụ Chineke n’onwe Ya, e cheghị na nha Ya na Chineke hà bụ ihe Ọ ga-eji mee ihe-uru nke onwe Ya; kama Ọ mere Onwe-Ya onye n'abụghị ihe ọbula site n'iwere ụdịdị orù, e wee mee Ya n'oyiyi mmadụ. Ebe ọ bụ na ahụrụ Ya dị ka mmadụ, Ọ wedara onwe Ya ala site n’idi nrube isi ruo n'ọnwụ—ọbụna ọnwụ n’elu obe” (Ndị Filipaị 2:5–8).

Ime ka nkwenkwe anyị dị mkpa bụrụ nke ziri ezi abụghị maka “ime ihe ziri ezi” kama ọ bụ maka “idi ezi omume” n'ebe Chineke nọ. N'otu aka ahụ, otù plọg ọkụ kwesịrị ịdị ndaba na oghere ọkụ ya ka o wee rụọ ọrụ nke ọma, ka mụ na gị kwesịrị ijikọta onwe anyị n'ezie na eziokwu nke eluigwe na ala, dịka Chineke si kọwaa ha.

Oge ọzọ mmadụ ga-asị “Ònye ka a ga-asị na Jizọs bụ?” anyị pụrụ iji eziokwu a dị mfe mee nzaghachi: “Kedụ maka Jizọs? Ọ gaghị adị nma ma anyị kwe ka okwu ndị Ọ kwuru zaa anyị ajụjụ ahụ?” N'ezie, Jizọs ji ọtụtụ ụzọ zaa ajụjụ a, n'ọtụtụ okwu na omume gasị. Otu oge, Jizọs jụrụ ndị enyi ya iri na abụọ kachasị dị Ya nso onye ha kweere na Ọ bụ.

E dekọrọ mkparịta ụka a dum n'Oziọma Matiu isi nke iri na isii. N'ime ya, Jizọs jụrụ ha, sị: “Ma unu? Ònye ka unu na-ekwu na M bụ? (Amaokwu. 13–15). Ndị na-eso ụzọ Ya maara na Jizọs ekwupụtaworị na Ya bụ naanị ụzọ nke eluigwe na ndụ ebighị ebi (Jọn 14:6). Ha makwa na Jizọs nwere ikike ịrụ ọrụ ebube. Ha makwa na ọtụtụ puku mmadụ n’oge ha malitere ikweta na Jizọs bụ Chineke.

Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na mkparịta ụka a kpọmkwem na Jizọs ji okwu ahụ bụ́ “Nwa nke mmadụ” na-ezo aka n’onwe Ya. Jizọs ji itu aha ahụ bụ́ “Nwa nke mmadụ” mesie ike na Ya bụ mmadụ zuru ezu. Nke ahụ nwere ike ịdị ka ihe n'agba gharii maka mmadụ nkịtị ị na-ekwusi ike si—Lee m, abụ m mmadụ. Mana ọ bụrụ na ị bụbu Chineke pụrụ ime ihe nile n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi, ma ugbu a ị nọ na Planetị Ụwa a dị ka mmadụ, ikekwe ị ga n'ekwu sị, “Leenụ M, Abụ M mmadụ!” Nke a bụ ụzọ kachasị amasị Jizọs isi na-ekwu banyere Onwe Ya.

Laghachi azu na ajụjụ a n'ekwu maka ya. Pita n'eso ụzọ Ya zara Ya ozugbo. Ọ lere Jizọs anya n'mkpuru anya wee sị: “Ọ bụ Gị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ” (Matiu 16:16).


Gịnị ka ọ ji bụrụ na nkwenkwe anyị banyere Jizọs kwesịrị ịdị ndaba na ihe nke ahụ Jizọs sị na Ya bụ? Gịnị mere ọ ji dị mkpa ka anyị ghara ịgbagha nkwenye anyị nke a banyere Jizọs, kama jisie ya nke ọma?

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Jesus Loves Me

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.

More

Anyi ga-achọ ikele Baker Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://bakerbookhouse.com/products/235847