Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jizọs Hụrụ M N'anyaIhe Atụ

Jesus Loves Me

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Nke A Ka M Maara 

Anyị enweghị ike inweta nzọpụta site n'ịgbalịsi ike ma ọ bụ ịdị mma zuru oke: “N’ihi na ọ bụ n’amara ka e jiworo zọpụta unu, site n’okwukwe—nke a esiteghịkwa n’onwe unu, kama ọ bụ onyinye Chineke—ọ bụghị site n’ọrụ, ka onye ọ bụla ghara ịnya isi” (Ndị Efesọs 2:8–9). Ịkwere na Jizọs na-ewebata ike nke Chineke na ndụ anyị, nke na-arụpụta nzọpụta anyị: “Maka na ihere ozi ọma adịghị eme m, n'ihi na ọ bụ ike Chineke na-eweta nzọpụta nye onye ọbụla nke kwere.” (Ndị Rom 1:16).

Ị nwewo oge pụrụ iche mgbe ị họọrọ ikwere na Kraịst n'onwe gị? Taa bụ maka mkpebi ịhọrọ Jizọs dịka Onye Nzọpụta gị, Eze, na Onye Nnapụta gị yana etu o si dị gị mkpa na iji obi gị niile mee nhọrọ ahụ. Ịnata onyinye Ya dị mfe dịka iji ọnụ gị kwupụta na Jizọs bụ Onye-nwe-anyị na ikwere n'obi gị na Chineke mere ka Ọ si na ndị nwụrụ anwụ bilie.

Nke a bụ ekpere ịburu eziokwu ndị a si n'isi gị gaa n'obi gị, site na eziokwu ị maara ruo n'okwukwe ị họọrọ. Okwu nke ekpere a abụghị anwansi, ma echiche ndị dị n'ekpere a ji ike niile nke eluigwe na ụwa ma ọ bụrụ na gị ekpee ya site n'obi nke dị umeala na okwukwe nye Onye Okike gị.

Jizọs M Hụrụ N'anya,

Abịakwutela m Gị, Chineke pụrụ ime ihe nile, ekwetakwara m na ndụ m ezighi ezi. Emehiewom, mejọkwa Gị n'ọtutu uzọ. Jizọs, a na m ekele Gị maka ịnwụ n'obe maka mmehie na mmejọ m niile. Taa a na m anabata Gị dịka Onye-nwe m na Onye-ndu nke ndụ m. Ana m echegharị wee si na mpako m chigharịa. Eji m obi m kwere na Gị, wee n'ahọrọ iji ndụ m soro Gị. Achọrọ m ịnata onyinye nzọpụta Gị dị akwughị ụgwọ. Onye-nwe-anyị, nyere m aka ibi ndụ dịka ihe okike ọhụrụ ugbu a. A na m ekpe nke a n’aha Gị na kwere n’ọrụ Gị, Jizọs. Amen.

Ozugbo ị tinyere okwukwe gị na Jizọs, ihe karịrị mmadụ na-eme na mkpụrụ obi gị, na ndụ gị, na n'ime ebighị ebi gị. Chineke na-etijisi agbụ nke mmehie ha wee si n'ahụ gị pụọ. Ọ na-ekepụtara gị ebe n'ụlọ Ya ma nabata gị n'ime ezinụlọ Ya. Chineke bụ Nna gị, Ọ hụkwara gị n'anya. Ị nwekwara ezinụlọ ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ndị ọzọ ga-eso gị n'eje ije ma n'agba gị ume ka unu n'aga n'ụzọ nke eluigwe.


Ị nabatala ọkpụkpọ òkù Kraịst ị so bụrụ ndị nke ezinụlọ Ya? Kanye akara n'ụbọchị a na kalenda gị ka ị jide n'aka na ọ bụ ụbọchị ị zara ọkpụkpọ òkù Ya!

Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Jesus Loves Me

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị si, "Gịnị ka m kwesịrị ikwere ka m ji bụrụ Onye N'eso Ụzọ Kraịst?" Kedụ ihe ị ga-ekwu? Site n'iji ederede dị mfe nke abụ a hụrụ n'anya, "Jizọs hụrụ m n'anya, nke a ka m maara, n'ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa m otú ahụ", onye odeakụkọ ghọrọ onye ụkọchukwu na-enyere gị aka ịghọta ihe ị kwenyere na ihe kpatara ijiri mee yabụ nkwenye. Ode-akwụkwọ akachasị gụọ akwụkwọ ya John S. Dickerson, n'ụzọ doro anya na dị ikwesị ntụkwasị obi n'enye nkọwa banyere nkwenkwe Ndị Kraịst dị mkpa ma n'egosipụta n'ụzọ dị ike ihe kpatara nkwenkwe ndị a ji dị mkpa.

More

Anyi ga-achọ ikele Baker Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: https://bakerbookhouse.com/products/235847

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara