Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ

Doing Business Supernaturally

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

Ndị Nwoke Nwụrụ Anwụ Adighị Eme Zipline

Ụnyaahụ, anyị kwuru maka adighị akpọgide n'obe nwoke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ. Mgbe anyị na-ebi ndụ mbilite n'ọnwụ...ebe anyị maara na Chineke dịịrị anyị na Mmụọ Ya dị n'ime anyị...anyị na-eje ije n'atụghị egwu. Nke a bụ ụdị ndụ anyị enwekataghi nweta mgbe mmehie na nhụsianya n'emekpa anyị anya.

A nọrọ m ọtụtụ afọ n’ụlọ ụka nke ịdị umeala n’obi na-ahụsi oku ike. Ụdi idi umeala n'obi n'abughi nke ezigbo ya. Anyị emetụtaghị ọtụtụ mmadụ maka Kraịst. Mana mgbe m malitere ije ije n'ike mbilite n'ọnwụ, amalitere m n'ụzọ nke ime ihe ike! Enwetụbeghị m ụtọ karịa ka m na-ebi ndụ ọhụrụ a. Ma ọ bụghị ihe na-agaghị ekwe omume maka onye ọbụla n'ime anyị Mmụọ Nsọ bi n'ime ya.

Achọrọ m ịkọ akụkọ gbasara Mak. Mak rụrụ ọrụ n'otu ụlọ ọrụ nke onye Juu na-ekweghị na Chineke nwere. Mak nọ na-amụta banyere ibi ndụ mbilite n'ọnwụ, ọ wee kpebie ịmalite ikpe ekpere maka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ ahu.

Otu ụbọchị ọ nụrụ ka onye nwe ulo oru ahu bụ onye na-ekweghị na Chineke na-eme mkpesa banyere isi ọwụwa n'awasi ya ike. Mak kpọkọtara obi ike ya ma gwa nwoke ahu ka ya kpeera ya ekpere maka ọgwụgwọ ya. N'enweghị olileanya, onyeisi ahụ kwetara. Mak kpere ekpere ngwa ngwa ma nwoke ahụ nwetere ọgwụgwọ ya ozugbo! Nke a masịrị onye isi ahụ nke ukwuu, mana akụkọ a akwụsịghị ebe ahụ.

Obere oge ka e mesịrị, ụlọ ọrụ ahụ gbaziri ụlọ ọrụ zipline n'ọgbakọ ndi ụlọ ọrụ di iche iche na Las Vegas. Nke a bụ ohere dị mkpa maka ndị isi ụlọ ọrụ na ndị ahịa ha iji jikọọ. N'ụzọ dị mwute, ka ihe ọmụme ahụ dị njikere ịmalite, oké égbè eluigwe bu nnukwu mmiri ozuzo bịarụtewere. Onye n'arụ ọrụ zipline wee gwa onye isi ahụ na ya ga-akwusi ọrụ ahụ. Ọ dị oke ize ndụ ina arụ ọrụ zipline mgbe e nwere oke ifufe na-abiarụte.

Onye isi ahụ bụ onye Juu na-ekweghị ekwe, na-ekweghị na Chineke, ekwetaghi na nke ahu bu nke ga eme-eme. “Mak! Bịa ebe a." Onye isi ahụ gwara Mak ka ọ kpee ekpere ka oké ifufe ahụ pụọ n'ebe mmemme zipline ha.

Ugbu a amaghị m maka gị, mana echere m na nke ahụ ga-abụ ihe ga-atụ ezigbo egwu. Isi ọwụwa bụ otu ihe. Mana nke a bụ oke ifufe. Chineke ọ ga-aza ekpere maka nke a? Ọ̀ dịla onye mebere otú ahụ kemgbe Jizọs?

Echiche otu aga esi mee maka nsogbu a biara gbagọkwụọ elu. Mak mirila amiri gaa n'ofu akuku idegara ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya ozi igwa ha...mba irịọ ha ka ha kpee ekpere. Oge erụwọ mgbe Chineke ga eme ihe Ọ ji bụrụ Chi! Mgbe ọ no n'ezi ozi, ọ nụru ka olu onye isi ụlọ ọrụ ya na-arị elu. Ọ kpọkọtawọri ndị ahịa nọ ebe ahu ikọwara ha ka aga esi mee maka nsogbu oké ifufe ahu...

“Ugbu a anyị anụla na oke mmiri ọzụzọ a ga-emechi zipline anyi. Mana onye ọrụ anyị, Mak, ga-ekpe ekpere. Mgbe ahụ, oké ifufe a ga-aga ebe ntụziaka ọzọ ma anyị alaghachi na mmemme ziplining anyi n'eme. Daalụ maka ndidi unu.”

Obi Mak dara n'ala. Mana n'oge ahu, otu enyi ya zighachiri ya ọzi na ọ hụrụ onyinyo nke "nnukwu ihe mkpuchi nchebe" n'elu zipline ahu n'ime anya uche ya. Ka nke a mere ka obi sie ya ike, Mak laghachiri n'ebe ahu ndi mmadu gbakọrọ ma kpee ekpere ka oké ifufe ahụ gaa ebe ọzọ.

Oké ifufe ahụ jisikwara ike n'abia ebe ha nọ. Mana ihe ana-atụghị anya ya mere. Igwe ojii nke oké ifufe ahụ yiri ka ọ kewara abụọ. Oké ifufe ahụ gafere n'aka ekpe na aka nri. Mpaghara zipline ahu enwetaghị otu mkpụrụ mmiri ozuzo. Otu onye gụzọ n'ebe dị anya sere ebe ahu fọtọ ya di n'ezie ka enwere ihe nnukwu nchebe kpụchiri elu zipline ahu. Mpaghara ebe mmiri na-ezọghị.

Chineke nwetara otuto. Ọtụtụ mmadu yiri ka ha nwere mmetụta n'ihi nke a ma akụkọ ahụ agawọkwa ebe niile. Mmetụta Mak mụbakwara n'anya CEO ya. Kedu onye i chere na onye isi ahụ nwere ike ịkpọ mgbe ọ nwere mkpebi siri ike ime?

Ị chọpụtala na ọ adịghị mkpa ka Mark bụrụ CEO iji nwee mmetụta dị ukwuu? Dị ka Daniel, Josef, na Esta n'ime Agba Ochie, ọ dịghị mkpa ka ị bụrụ onye isi oche iji rụọ ọrụ dị mkpa.

Mmetụta Mak nwere ike inwe mmetụta dị ukwuu na ngwaahịa ọhụrụ, atụmatụ ụlọ ọrụ, na ntụzịaka nke ụlọ ọrụ ahụ. Ma di ka ndị ahu anyi guru maka ha n'Agba Ochie, Mak nwere ike ịbụ onye mbụ onye isi ahụ ga-akpọ oku ma nsogbu bia.

Kedu maka gị? Ị na-edozi onwe gị ka ị wee nwe ike imetụta omenala? Ị na-atụkwasị Chineke obi na Ọ ga-eso gị rụọ ọrụ iji weta Eluigwe n'Uwa? Ụwa na-eti mkpu akwa maka ngwọta maka obere na nnukwu nsogbu nke ụdị ọbụla. Nnukwu nsogbu ndị so na ọrịa na-efe efe n'etechabeghi aka ọ bịara gọsiri anyị nke ahụ.

Chineke na-echere anyị ka anyị nweta ndụmọdụ Ya na nghọta Ya ka anyị wee nwee ike itinye ihe ngwọta nke Eluigwe n'ụwa ma kuzie ụzọ Ya site n'igọsipụta ihe ngwọta nye nsogbu ụwa. Ihe Jizọs gọsipụtara n'igwọ ahu ndi mmadu bụ otu ike ahu nke nwere ike ịgbanwe azụmahịa gị…na obodo…na mba dị iche iche.

Nke a bụ naanị mmalite. Ọ bụrụ na ịchọrọ isonye na obodo nke ndị kwere ekwe nwere ikike na-achọ ịzụ ahịa n'ụzọ karịrị ike mmadụ, pịa nke a NJIKỌTA ịmụtakwụ. Anyị nwere ike imekọ nke a ọnụ!

Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Doing Business Supernaturally

Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!

More

Anyi ga-achọ ikele Gateway Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, bikọ gaa na http://dbs.godsbetterway.com/