Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ
![Doing Business Supernaturally](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F20746%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Akpọgidele Nwoke Ahụ A Kpọlitere N’ọnwụ N'Obe
Ka anyị na-azụ ahịa n'ụzọ karịrị nke mmadụ, ọ dị oke mkpa ka anyị ghara ịgbalị ịkpọgide nwoke ahụ a kpọlitere n'ọnwụ n'obe.
Chere... Gini?
Ihe dị ka ugboro asaa n’ime Oziọma, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ Ya iwu ka ha nwụọ n’ihe onwe anyị. Ana m ewere nke ahụ pụta ìhè na anyị ga-anwụ maka ọdịmma onwe anyị, ọchịchọ ọjọọ anyi ma buru Alaeze na Eze tinye ka ihe mbu n'ihe niile anyị n'eme.
Na Ndị Rọm Isii rụọ Asatọ, Pọl rụtụrụ aka n'ibi ndụ a kpọlitere n'ọnwụ ihe dị ka ugboro iri anọ. Nke a bụ ọkpụkpọ oku anyị...ibi ndụ n'ike mbilite n'ọnwụ nke Jizọs n'oge ndụ anyị niile.
“Ma chere,” anụru m ka mmadụ na-ekwu. Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru sị, ‘Ọ ga abariri ụba, ma mụ onwe m ga ebelatariri.’ Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ịbụ ekpere anyị?”
Elezụọ anya n'ihe niile, echeghị m otu ahụ. Jọn, bụ́ onye amụma kasịnụ, dị ka Jizọs si kwuo, nọchiri anya ọgwụgwụ nke otu oge. Mmechi nke Ogbụgba Ndụ Ochie. Ọgwụgwụ oge nke Iwu na Ndị Amụma. Jọn na ozi ya nọ n'ụzọ ịpụ.
Ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs ga-eweta ọgbọ ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ụdị ihe e kere eke ọhụrụ na-achọ iputa ìhè: Ụmụ mmadụ ndi Chineke nọ n'ime ha. Nke ahụ bụ ihe ị bụ.
Ya mere eleghị anya ọ dị mkpa ka nlekwasị anya gị gbanwee. Kama ilekwasị anya n'ihe ị ga-egbu n'ime gi, ikekwe ọ bụ oge ịhụ ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ibuli elu n'ime gị. (Ilekwasị anya n'igbu mmehie adịghị arụ ọrụ otu ọbula isi lee ya. Ilekwasị anya n'ịkwalite mmasị anyị nwere n'ebe Jizọs nọ bụ ihe ngwọta maka mmehie.)
Mụ na Gị ka akpọrọ igbu ịchọ naanị ọdịmma onwe onye. Ma ọ bụghị igbu ọchịchọ ndi nke Mmụọ Nsọ na-akpali n'ime anyị. Ị bụ mpụta ìhè, a na-ahụ anya, nke Jizọs bi n'ụwa taa. Mmụọ Nsọ na-eyi gị ka akwa eji ekpụchi aka.
Onye-nwe-anyị ga eji ihe ndi n'amasi gi, ihe ndi ichọrọ, ihe ndi n'agụsi gi aguu ike, ihe ndi ekere gi n'ime iji rụọ ọrụ, ụdị mmadụ ị bu, na ọdịdị gị. Enwere m mgbagwoju anya na nke a n'afọ gara aga. Echere m na ọchịchọ m inwe ihe ịga nke ọma n'achụmnta ego bụ ihe so na nke ịchọ ọdịmma onwe m nke m kwesịrị igbu. "...ma mụ onwe m ga ebelatariri." Ma eleghị anya nke ahụ bụ ihe so na nkewa ugha ahu nke dị n'etiti ihe ndi echere di nsọ na nke echere bụ ihe ndi ụwa. Nke n'enwusi ike site n'olu onye iro.
Ndị kwere ekwe Mmụọ Nsọ jụpụtara n'ime ha kwesịrị ịnọ n'isi n'azụmahịa, mmepụta ihe, ihe mmepụta ohuru eji enyere ndụ aka, ojiji, ihe ndi mara nma eji aka ese ma ọ bụ eme, na egwu. Ma anyị enwekataghi rute ebe ahụ ma ọ bụrụ na anyị na-agbalị igbu nwoke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ.
Anyị enwekataghikwa rukwa ebe ahụ ma ọ bụrụ na anyị na-enwere onye ọzọ anyaụfụ. Ọ bụrụ na ị ghọtara oku Chineke n'ime ndụ gị, agụụ Chineke maka gị, na ike na-enweghị njedebe nke Chineke iji weta Eluigwe n'Uwa site na gị, ị nwekataghi chọọ ịbụ onye ọzọ. Gụọ ahịrịokwu ahụ ọzọ ma chee echiche banyere ya.
Ya mere kedu ihe ndi ọchichọ Chineke tinyeworo n'ime gị? Ị̀ nwụola n'ebe nrọ ndị Jizọs chọrọ ịkpọlite n'ọnwụ? Kedukwa nrọ ndi ọhụrụ Ọ chọrọ ka ị chụo taa? Ana m ekpe ekpere ka ị na-eje ije na akara aka gị zuru oke na ịkpọ oku, na-ebi ndụ gị nke ọma. Ọ ga-enweta otuto, ma gi enwee utọ karisiri nke ndụ gị!
Chetakwa, Ọ nweghị oke site na ihe ọ bụla ị nwere ike ịjụ ma ọ bụ chee n'echiche. (Ndị Efesọs 3:20-21)
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Doing Business Supernaturally](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F20746%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!
More