Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ

Doing Business Supernaturally

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

N'Ụwa Dịka Ọ Dị Na Eluigwe

Ụnyaahụ anyị mụtara na dị ka ndị ọchụnta ego, anyị nwere ọkpụkpọ okù nke mbụ site n'aka Onye-nwe-anyị. Anyị nwere ohere igọsipụta ike Chineke n'ụzọ pụrụ iche na ụzọ dị ike n'ime ụwa gbajiri agbaji nke agụụ na-agụsi ike maka ngwọta. Nke a kwesịkwara imetụta otú anyị si ekpe ekpere.

Anyị na-ekpe ekpere nke Onye-nwe-anyị. Ma gịnị ka ọ pụtara n'ezie? Kedu ihe ọ pụtara maka azụmahịa anyị?

O pụtara na ọbụrụ na ọ dighi n'Eligwe, ọ kwesikwaghi idi n'Uwa. Ọ buru na ọ dịghị n'Eligwe, ọ kwesikwaghi idi n'ime ndụ m ma ọbụ ezinụlọ m ma ọbụ azumahia m. Nke ahụ gụnyere enweghị mgbaghara na esemọkwụ na ọdịda azụmahịa. Ọ gụnyere ndị ọrụ ọjọọ na ndị isi ọjọọ. Ọ gụnyekwara arụzighi ọrụ na emezighi ndi n'azu anyi ahia ofuma. Ọ dịghị nke ọ bụla n'ime ihe ndị a so n'ime atụmatụ Chineke.

Ya mere, gịnị ka ọ dị ka mgbe Alaeze nke Eluigwe wakpọrọ Ala-eze nke Ụwa?

A na-eme uche Chineke n’Uwa dị ka e si eme ya n’Eluigwe. Ndị mmadụ, azụmahịa, na obodo na-eme nke ọma. Omenala na-enwe mmetụta nke ọdịmma. Ndị ahịa na-enweta ngwa ahịa ma ọ bụ ọrụ ha chọrọ, onye nwe ụlọ ahịa na ndị ọrụ ya na-eme nke ọma.

A na egọsipụta ebube na ịhụnanya na ike nke Jizọs. Ndị ọrụ na-arụsi ọrụ ike na ha na-aghọ ezigbo di na nwunye na nne na nna na ndị enyi na ndị ụka. Otu ihe nketa nke ụwa a abụrụ ihe a kpaliri n'ụzọ e si kee ya mbu n'Iden.

Mgbe anyị ghọtara nke a ofuma, anyị na-ekpe ekpere n'ụzọ dị iche. Ruo ọtụtụ iri afọ dị ka onye ndú achụmnta ego, ekpere m ekpere banyere izisa ozi ọma na ọrịa na uto nke Ụlọ Chineke. Ekpere m ekpere maka ezinụlọ na ndị enyi m. Mana enwere m mmetụta nke ihere irịọ Chineke ka ọ nyere m aka ịga nke ọma n'ahịa. Nke a bụ ihe so n'nkewa nke ụgha ahụ m kwuru gbasara ya ụnyaahụ. Ndụ ekpere gị ọ na-ata ahụhụ n'aka ụgha a?

Ọ nwere otu nwoke onye ji di ka ihe oji eri nri aka ọrụ itughari nkụ osisi mee ka ọ maa nma. Ọ ghọtara na kemịkalụ ndị ahụ oji arụ ọrụ siri ike ma nwee ike ịkpata ogologo nsogbu ahụike, ọ mekwara atụmatụ ịkwụsị azụmahịa ya ma ọ bụrụ na ọ nweghị ike ịchọta ngwọta nsogbu a. Ọ nọ na-arụgharị ọrụ n'ụlọ ahịa ya na-agbali imepụta kemịkalụ osisi ọhụrụ nke eji ihe ndi Chineke kere mee na nke na-adịghị egbu mmadu. Ma ọ lekwasiri anya n'ebe dị elu maka nke a: Kemịkalụ ahu ga-arụ ọrụ nke ọma dị ka ụdị kemịkal ndi ozo di n'ahia. Ya na nwunye ya nọ na-arịọ Chineke ka Ọ za ha maka nke a.

Otu ụbọchị, ọ lọtara n’ụlọ ibụtere nwunye ya nri ehihie. Nwunye ya dị ime, ma mgbe ọ tetara n’ụra, ọ gwara ya maka nrọ ọ rọrọ banyere edemede ndi pụrụ iche. Nwoke ahụ ghọtara na ha bụ usoro kemịkalụ. Ọ laghachiri n'ụlọ ahịa ya, wee jikọta usoro kemịkalụ ndị ahu ọnụ.

Ngwakọta ahu tụgharịrị bụrụ usoro zuru oke maka ihe mgbapụ arịa osisi na-adịghị egbu mmadu. Ọ rụkwara ọrụ di ka ụdị Kemịkalụ ndi ozo di n'ahịa. Nwoke ahu malitere rewe ya gburugburu mpaghara ya. Ya na nwunye mechara resị otu nnukwu ụlọ ọrụ ihe niile gbasara Kemịkalụ ahu. Ha zụtara mọtọ RV mara mma ma nwee ihe ha ga-eji gazụọ Amerika ikesa ọzi oma.

Ị chọrọ amamihe maka azụmahịa gị taa? Ị na-ahụ nsogbu ndị dị n'ụwa gị chọrọ ngwọta? Enwere m ike ime ka obi sie gị ike na Chineke nwere azịza, na Ọ dị njikere iji gị bute ha si n'Eluigwe bata n'ụwa. Ọ bụ ọrụ gị ịjụ...na-atụ anya azịza.

“Mgbe mmụọ nke eziokwu ga-abịa, Ọ ga-eduru unu baa n’ime ezi-okwu niile, n’ihi na Ọ gaghị ekwu n’ike nke aka Ya, ma ihe ọ bụla Ọ nụrụ ka Ọ ga-ekwu, Ọ ga-akọkwara unu ihe ndị gaje ịbịa." Jọn 16:13

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Doing Business Supernaturally

Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!

More

Anyi ga-achọ ikele Gateway Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, bikọ gaa na http://dbs.godsbetterway.com/