Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ

Doing Business Supernaturally

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

Mgbe Eluigwe Wakpọrọ Uwa

Ị nụtụla maka ihe mere na Almolonga, Guatemala?

Ụnyaahụ anyị kwuru gbasara ihe ọ pụtara mgbe Chineke na-ewebata Eluigwe n'Uwa site na azụmahịa anyị. Taa, anyị ga-ahụ ihe ọ di ka ya n'ala.

Almolonga, Guatemala bụ ebe jọgburu onwe ya. Ịñụbiga mmanya ókè, mgbaasị, na amọọsụ juru ebe nile. Ikọ ọnụ, igbu mmadu, na ihe ọjọọ ndi ozo jụpụtakwa n'ebe niile. Ụlọ mkpọrọ anọ ha juru eju, ha na-ebunyekwa obodo ndị ọzọ ndị mkpọrọ ha. Ha bụ ógbè a na-akọ ugbo, ma ala ahụ adighi amị mkpụrụ.

Mgbe ọ fọrọ nke nta ka e gbuo ya, otu onye ọrụ ugbo nọ na njedebe nke ndụ ya. N’ime obi nke ezigbo ike gwuru, ọ gburu ikpere n’ala ma nyefee Chineke ubi ya, ndụ ya, na ala ógbè ahụ. Ndị ọrụ ugbo ndị ọzọ sonyeere ya ma kpee ekpere ka Chineke wụkwasi ngọzi Ya n’ala nke yiri ka a bụrụ ya ọnụ. Ha kpere ekpere ka akụkụ nke ụwa ha dị ka Eluigwe (Matiu 6:10).

Onye-nwe-anyị nụrụ ekpere ha wee zaa n’ụzọ dị egwu (Ọpụpụ 2:24-25). Ndị Almolonga jụrụ arụsị ha. Ha kwụsịrị ịga n'ụlọ mmanya ma malite ịga ụlọ ụka. Ọtụtụ ndị na-abaghị uru malitere ịrụsi ọrụ ike. A zọpụtara alụmdi na nwunye ma ndị iro biara dịghachi ná mma.

N'ime afọ ndị bịara abia, ụlọ mmanya iri atọ na isii nke Almolonga na ụlọ nkwu gbadara rụọ atọ. Ụlọ mkpọrọ anọ ndi ahu dị n’obodo ha mechiri, ma emegharịa nke ikpeazụ ka ọbụrụ “Ụlọ Nzukọ Nke Ụgwụ.” Onye isi obodo bụ onye Ndị Kraịst na ndị isi ụka n'ebe ahụ kwenyere na pasenti iri asatọ nke ndị bi n'Almolonga aghọọla ndị na-eso Ụzọ Kraịst.

Otu n'ime ihe kacha pụta ìhè bụ na ngalaba ọrụ ugbo. Rụọ ọtụtụ afọ, ihe ọkụkụ nọ na-ata ahụhụ n'ihi ala kpọrọ nkụ na àgwà nke adịghị arụ ọrụ. Ugbu a ala na-amịpụta ihe ruru ihe ubi atọ kwa afọ. Ndị ọrụ ugbo Almolonga na-ezigabu gwọngwọrọ anọ nke ihe ubi n'ahịa kwa ọnwa. Ugbu a, ha na-ebuga gwọngwọrọ iri anọkwa izu. Ndị ọrụ ugbo na-akwụ ụgwọ maka nnukwu gwọngwọrọ Mercedes ma were amaokwu Akwụkwọ Nsọ na nkebiokwu nke Ndị Kraịst bikasia ha n'ahu.

Ihe ubi n'onwe ha agbanwewọkwa. Akwụkwọ nri na-eto kafee ka ha si eto n'mbu. Karọtụ na-etokarị rụọ ogo aka nwoke gbara dimkpa. Ndị nyọcha ọrụ ugbo si US na ebe ndị ọzọ abiala leta Almolonga, na-agbalị ịghọta ka ha si enweta ọtụtụ ihe ubi kwa afọ nke ihe ọkụkụ gbara agba. Mana ha adighi ahụ ihe ha tụrụ anya ya.

Chineke gwọrọ ala ha.

Ị chere na Onye-nwe-anyị bu ihe gbasara ala gị n'uche Ya, kwa?

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Doing Business Supernaturally

Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!

More

Anyi ga-achọ ikele Gateway Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, bikọ gaa na http://dbs.godsbetterway.com/