Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ

Doing Business Supernaturally

ỤBỌCHỊ 1 NKE 6

Nkewa Nke Di Ụgha

Ekweere m ụgha n’ime afọ iri abụọ na asatọ mbụ nke ndụ m n'ime Kraịst.

Ọ bụ ụgha a na-ahụkarị n'ime ọgbakọ Ndị Kraịst, ma ọ bụrụ na ị bụ onye ọchụnta ego, a na m eche na gị na ugha a, agbawọkwa mgba.

Ekwere m na e nwere nkewa dị n'etiti ihe ndi dị nsọ na ihe ndi bụ ihe nke ụwa. Nke mere ka m na-eme ihe n'adighị otu m kwesiri. Ma na azụmahịa ma na Ụlọ Ụka.

Ka m kọwaa...

Mgbe m ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst n'afọ ikpeazụ m nke mahadum, n'ụzọ di añaa enwetara m ihe ndetụ echiche n'ime obi m nke kwụrụ na ndị niile kwere ekwe na-asọpụsiri Chineke ike...ndị kacha kwesịi ike n'okwukwe ha...bara n'ọrụ aka nke izi ozi ọma oge niile. A sị ka e kwụwe, akụkọ ndụ ndị a ma ama, okwuchukwu, na n’elu ebe a na-anọ ezipu ozi ọma jupụtara ná ndị ‘gbahapụrụ ihe niile wee soro Jizọs. Na ọ dịghị onye ọbụla n'ime ha bara n'ime azụmahịa (ma ọ bụ ọtu ahu ka o pụtara).

Ya mere onwe m adim ka mụ erughi eru. E chekwara m echiche ịkwụsị ihe ọmụmụ MBA m ka m wee gawa kọleji nke Akwụkwọ Nsọ. Echere m na ọ bụrụ na m anọgide na-azụmahịa, na m ga-abụ Onye Kraịst nke n'abaghi uru nke mbụ mgbe niile, onye ọrụ ya n'Ụlo Uka bụ ịnọdụ na kọmitii na-ahụ maka ego ma ọ bụ ime ka efere onyinye jụpụta n'ego iji wee kwadọọ ndị na-eme ezi ọrụ nye Chineke. Ndi n'arụ ọrụ igbasa ozi ọma oge niile.

Ma a dara m ighọta na a kpọbanyere m n’ọrụ izi ozi ọma oge niile n’ụbọchị a zọpụtara m. Ma gi onwe gi kwa.

A dakwara m mba ighọta na azụmahịa abụghị ịkpọ oku nke n'abaghi uru nke mbụ. Ọ bara ezigbọte uru di ka izipu ozi oma site n'elu pụlpiti.

E nweghi nkewa ọbụla di n'etiti ha

E nweghị nkewa ọbula di n'etiti ihe ndi akpọrọ ihe ndi uwa na ihe ndi akpọrọ ihe nsọ. Ihe niile bụ ihe mmụọ. Alaeze Chineke gbasasiri n’akụkụ ihe niile nke ndụ, ọ bụghị naanị n’ime mgbidi anọ nke ụlọ ụka. Ma anyị, dị ka ndị ọchụnta ego, na-enwekarị mmekọrịta dị irè na nke sara mbara n'ụwa karịa ka onye ụkọ chukwu na-eme. Na ohere ndị ọzọ jụpụtara iji gọsipụta ịhụnanya na ike Chineke n'ụzọ ndị a na-atụghị anya ha.

Ọ kwere nkwa na Ya ga-anọnyere anyị nakwa na Mmụọ Ya ga-eduba anyị n’ime ezi-okwu niile. E wepụghi azụmahịa gị na nkwa a. Nke ahụ bụ ozi ọma di ukwuu, ọ bụghị ya?

Chineke na-eche anyị ka anyị nweta ndụmọdụ Ya na nghọta Ya ka anyị wee nwee ike itinye ihe ngwọta nke eluigwe n'ụwa ma kụzie ụzọ Ya site n'igọsipụta ihe ngwọta nye nsogbu ụwa. Ụwa di mgbaji ma na-eti mkpu maka azịza (lee Ndị Rọm 8:19). Anyị nwere ohere inata azịza...site na Mmụọ Nsọ. Anyị kwesịrị ịtụ anya ịbụ ndị na-emepụta ihe ọhụrụ, ndị na-ekepụta ihe, ndị na-emepụta ngwa ọhụrụ, na ndị na-emepụta ihe ngwọta maka mkpu ákwá nke umu mmadụ n'eti.

Ihe Jizọs gọsipụtara na igwọ ahụ ndi mmadu bụ otu ike nke nwere ike igbanwe azụmahia gi… na obodo… na mba di iche iche.

Ị hapụla nkewa dị n'etiti ihe ndi echere di nsọ na nke ndi echere bụ nke ụwa? Ị na-emekọ ihe iji weta Eluigwe n'ụwa n'ime akụkụ ebe azụmahịa gi na ndụ gị taa?

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Doing Business Supernaturally

Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!

More

Anyi ga-achọ ikele Gateway Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, bikọ gaa na http://dbs.godsbetterway.com/