Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime MmụọIhe Atụ

Doing Business Supernaturally

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

Ike Eji Eme Ihe N'enweghi Ngwucha

I nwere nghọta banyere ike iji eme ihe?

Ị nwere ike ịmaghị nke a, mana ị nwere ike eji eme ihe karịa Bill Gates! Nke a abụghị ụgha. Otu n'ime ndị kasị baa ọgaranya n'ụwa nwere ihe ndi ogbachi siri ike nke na-ekwesịghị igbọchi gị ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Ka anyị leba anya n'ihe eziokwu ndia...

1. E mere Bill Gates n’onyinyo Chineke. ( Jenesis 1:27) Onye Okike anyị nọ na-ele anya n’enyo mgbe Ọ kere Bill. Ma Bill emelitela nke a! Mana nke a na-emetụtakwa gị, ụmụnne m na ụmụnna m.

2. Ị nwere Kraịst n'ime gị, olileanya nke ebube. (Ndị Kọlọsi 1:27) Site n’ihe anyị na-ahụ, Bill enweghị nnukwu enyemaka a.

3. Ị nwere uche nke Kraịst. (1 Ndị Kọrint 2:16) Ọzọkwa, ọ yiri ka Bill enweghi nke a.

4. Ị nwere Mmụọ Nsọ. Chukwu nke bi n'ime gi! (1 Ndị Kọrint 3:16) Ọzọ, ihe di mkpa ọzọ i nwere karịa Mazi Gates.

Ya mere enwere ike ikwu na Bill na-arụ ọrụ naanị otu ụzọ n'ụzọ anọ nke ikike gị? Ndị enyi m, anyị ga-amalite ikwere na nzọpụta nke anyị! Na ihe ọ pụtara maka ndụ anyị na azụmahịa anyị.

Ọ bụrụ na Bill na ndị ọzọ rụrụ ihe ha nwere ikena-enweghị ohere ịnweta Mmụọ Chineke, na-enweghịkwa ihe mgbochi ha yikwasịwọrọ onwe ha site n’nkewa ụgha di n'etiti ihe ndi di nsọ na ihe ndi nke ụwa, chee echiche banyere ihe ị nwere ike ime! Tụlee ohere ị nwere ebe amamihe Chineke na mmepụta ihe nọ.

Oge erụọla ka anyị gbakọọ okwukwe anyị na azụmaahịa anyị di ka alum di na nwunye. Oge erụwọ ka mụ na gị weta ihe ngwọta na ihe ọhụrụ Chineke kere iji dozie nsogbu ụwa. Enwere nsogbu ebe niile. Ụfọdụ zuru ụwa ọnụ, ndị ọzọ nwekwara ike ịdị ka ha adịchaghị mkpa. Ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa, ọ dịkwa Chineke mkpa.

Matt McPherson bụ onye na-ezisa ozi ọma na onye n'edu ndi mmadu ka ha fee Chineke n'egwụ na abụ. Ọ na-amasịkwa ya iji ụta chụọ nta. Otu ụbọchị ọ nụrụ nke ọma ka Chineke na-ekwu, sị, “Amaara M azịza ọ bụla nye nsogbu ọ bụla dị n’ụwa. Ọ bụrụ naani na ndị mmadụ ga-ajụ M, aga M enye ha azịza ndị ahụ.

Ugbu a Matt gaara arịọ maka ngwọta maka agụụ ụwa. Ma ọ bụ ka esi emepụta nnukwu ụzọ isi zie ozi oma. Ma ọ meghị ihe ndia. Ọ rịọrọ Chineke ka Ọ nyere ya aka ịrụ ụta ngwakọta ka mma.

Ka m gwa gi, e chepụtala ụta agbakọta ọnụ na ngwụcha afọ iri isii, ha nwekwara kamera abụọ. Mana ndị na-emepụta ihe agbaala mbọ kemgbe ihe karịrị afọ iri na-agbalị ime ka kamera abụọ ndị ahụ mekọrịta nke ọma, mana ha enwetaghị nke a. Enweghị mmekọrịta a kpatara agbatazighi uta, bụ ezigbote nsogbu nye ndị dinta.

Ihe dị ka izu abụọ ka e mesịrị Matt biliri n'etiti abalị. Ọ kwuru na ọ dị ka e nwere mpempe akwụkwọ ndetu kwụchiri n'ihụ ya. Enwere esere ese nke ụta ngwakọta ejiri aka see na ya. Ọ nọdụrụ ala wee malite imapi ihe esere ese ahụ. Ọ chọpụtara na ọ dịghị ka ụta ọ bụla e wutụrụla. Ụta a nwere otu kamera.

Ọ nwere ike ịbụ na ị ghọtara na Honda na-ere ọtụtụ ụgbọ ala ma na-enweta obere uru kwa ụgbọ ala. Na Rolls Royce na-ere ụgbọ ala ole na ole mana ọ na-enweta nnukwu uru n'otu ụgbọ ala. Matt McPherson malitere Mathews Inc., ma ha bụzi ndị na-emepụta ụta ndi ana agba-agba kachasịa n'ụwa. N'adịghịkwa ka Honda, Mathews na-enweta nnukwu uru na ụta ọ bụla.

Matt gara n'ihu chepụtakwa ụdị ụbọ akwara ọhụrụ, a na-ewerekwa McPherson Guitars ya dị ka ndị kachasi mma n'ụwa. Ọrụ Matt bụ ozi ya. Ma Matt ka na-ejegharịkwa gburugburu nnukwu ụlọ ahịa obodo ya na Wisconsin na-ekerịta Oziọma. Ọ debere Chineke mbu n’ihe niile ọ na-eme.

Ya mere na gini kpatara ị nweghi ike ime nke a? Gịnị kpatara na Chineke enweghị ike iji gị dozie nsogbu n'ọkwa mba... ma ọ bụ n'obodo gị ma ọ bụ ụlọ ọrụ gị? Ụwa na-eti mkpu akwa maka ihe ngwọta, ndị Chineke nwere ohere inweta atụmatụ dị nsọ nke ga-agwọ mba dị iche iche ma weta udo. Ugbu a, ọ bụ oge iji rio.

Mgbe mbụ m gwara gị gbasara ekpere Matt McPherson ka ị guru n’elu, ahụ ọgbakasiri gi n'iwe? Ị chere na onye na-asọpụrụ Chineke n'ezie gaara arịọ maka ihe...bara uru n'ụzọ di nsọ karia nke a? Ọ bụrụ otú ahụ, ikekwe ya bụrụ na ị dabawọ n’ọnyà nke nkewa ugha ahu di n'etiti ihe ndi echere dị nsọ na nke ndi echere bụ ihe nke ụwa.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Doing Business Supernaturally

Ekweere m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a juru eju ebe niile n'ebe Ndị Kraịst nọ. Ekwenyere m na ezigbo nkewa di n'etiti ihe ndi bụ ihe nke uwa na ihe ndi dị nsọ. Ma nke ahu ekweghi ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọcha ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji weta Eluigwe n'ụwa a na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a ga-egọsikwa gị otú iga esi mee ya!

More

Anyi ga-achọ ikele Gateway Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, bikọ gaa na http://dbs.godsbetterway.com/