Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

Odikwa ike, otu n'ime akụkọ ndị ahụ pụtara ezigbo íhé nye gị. Nwekwa ike akụkọ gị banyere nsogbu inwere site na nchegbu dị nnọọ iche. Mana n’ọgụ ọbụla ịna ahụ n'ime nchegbu, otu mmụọ ahụ nke mere ka Kraịst si n'ọnwụ bilie bi n’ime gi. Ọ nyeghịkwa gị mmụọ nke egwu.

Nke ahụ apụtaghị na ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu nchegbu na ịnweghị okwukwe zuru oke. Ọ pụtaghị na ị tụkwasịghị Chineke obi nke ọma. N'ezie, icheghi na nchegbu pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enyere gị aka ịmụta ịdabere n'Chineke na ịtụkwasị Chineke obi? Nchegbu ọ̀ pụrụ n'ezie ibu ihe ga-eme ka ị bịarukwuo Chineke nso?

Nchegbu na-aghọ onyinye mgbe ọ na-enyere anyị aka ịdabere na Chineke. Nke ahụ apụtaghị na anyị ga-akwụsị ịchọ enyemaka ma ọ bụ kwụsị ịnwe olileanya. Ọ pụtara na anyị maara na ịchụso udo bụ ihe usoro.

Ya mere, ọ ga-ekwe omume n'ezie ibi ndụ n'echekasighi ahu gbasara ịhe ọbula? Ee. Nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị mgbe ọbụla anyi agaghi enwe ihe anyi ga-eji chee echiche. Mana n’ihi Jizọs, anyị nwere ike ịbị ndụ na-adighi nchegbu ọbụlagodi mgbe enwere ihe anyị ga-eji chegbụọ onwe anyị—ọ bụghị site ná mgbalị anyị kama ọbụ site n’ọnụnọ Ya. Lekwụọ anya n'amaọkwu ndị a ọzọ:

Echegbụla onwe gị banyere ihe ọ bụla, kama n'ọnọdụ ọ bụla, site n'ekpere na arịrịọ, ya na ekele, were ihe ndi niile ina achọ kpesara Chineke. Ma udo nke Chineke, nke karịrị nghọta niile, ga-echekwa obi gi na echiche gi nche n’ime Kraịst Jizọs. Ndị Filipaị 4:6-7 NIV

Kụọ eziọkwụ ahụ dika ume. Anyị na-edọbekarị anya anyi na obi anyi n'okwu ahụ bụ́ “udo,” ma ọ na-ekwu, “udo nke Chineke.” A na-achọta ezi udo nanị n'ihu Chineke. Ya mere, icheghi na azịza nke nchegbu abụghị obere ntakasi ahu kama obu ịnwekwu Chineke?

Tụlee: Olee otú m ga-esi kpọkụọ ọnụnọ na udo nke Chineke n'ime ndụ m mgbe niile?

Kpee ekpere: Onye-nwe-anyị, daalụ maka ọnụnọ gị mgbe niile. Abịawo m n'ihu Gị taa na-arịọ maka udo nke naanị Gị nwere ike inye. Achọrọ m ihe Gị karịa. Ana m akpọ gị òkù ka Ị bata n'ime akụkụ ọbụla nke ndụ m. Nyere m aka ka m dabere na Gi n'uju na izu oké taa. Ana m enye Gị nsogbu na egwu m niile. Nyere m aka ibi ndụ na-enweghị nchegbu ọ bụla site na ịdabere na Gị. Atụkwasara m Gị obi. Ana m enye Gi ihe m niile. N’aha Jizọs, amen.

Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu nchegbu, ma ọ bụ onye ị hụrụ n'anya n'enwe nsogbu ahu, enwere enyemaka na olileanya maka ya. Mụtakwuo maka otu nchegbu nwere ike ịdị ka, otu ị ga-esi merie ya, na otu ị ga esi nyere ndị ọzọ n'agba mgba maka ya aka .

Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara