Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Udo ọ̀ bụ ihe kwere omume n'ezie ụbọchị taa? Cheri pụrụ n'ọchịchọ afọ iri na otu gara aga iji chọpụta. Nke a bụ ihe ọ chọpụtara n'ụzọ ya:

Echetara m ya nke ọma. Ụbọchị m kpebiri na mụ enweghị ike ịbị ndụ otú a ọzọ.

Ebe a ka m nọ, bụ onye na-eso ụzọ Kraịst, nke ji obi ya niile n'ebi ndụ dị ka onye ọ bụla ọzọ. Ebiri m ndụ m n'egwu na nchekasị, ma amaara m na ọ kwesịghị ịdị otú ahụ! Ana m agụkarị n'Okwu Chineke ka m ghara ịtụ egwu na ichegbu onwe m n'efu. Mana nke ahụ dị ka ihe n'agaghị ekwe omume!

Chineke nwere ọtụtụ ihe Ọ na-ekwu na Akwụkwọ Nsọ banyere egwu na ihe ngwọta ya: udo. N’otu oge, Jizọs na ndị na-eso ụzọ Ya nọ n’ụgbọ mmiri na-agafe n’Oké Osimiri Galili mgbe oké ifufe chọrọ imikpu ha. Ha niile lụrụ ọgụ ka ha na-ese n’elu mmiri, ma gịnịkwanụ ka Jizọs nọ n'eme? Ọ no n'ehi ezigbọte ụra! N'ime etiti oké ifufe.

Ndị na-eso ụzọ Ya jụrụ sị, “Onye Nkuzi, ị chọghị ịma ma mmiri ọ riri anyị?” Jizọs biliri baara oké ifufe ahụ mba, ọ wee daa jụụ. Ọ wee si ndi n'ēso uzọ Ya, “Gini mere unu ji n'ātu egwu otú a? Unu ka enweghị okwukwe?” Mk 4:40 NIV

Nke ahụ chịkọtara mkparịta ụka niile mụ na Chineke n'enwe. Enwere m ike ịhụ Ya ka Ọ na-ajụ m ihe mere m ji atụ egwu, ma mụ ana aza si, Ọ bụghị ihe dọrọ anya? Lee ọnọdụ m niile! Kedu onye na-agaghị atụ egwu ma ọ bụ n'enweghi ike itu egwu?

N'ọchịchọ m maka udo, ọtụtụ ihe bịara dọọ m anya.

  1. Ọnọdụ m nọ na-ekpebi ọkwa udo m. Ọ bụrụ na ọnọdụ ndụ m niile dị mma, mgbe ahụ enwere m udo. Ọ bụrụ na oké ifufe na-agba m gburugburu, ana m enwe ahu ezụghi oke, nchekasị, na ike ogwụgwu mgbe nile - ezigbọte ike gwụrụ m site na mmetụta uche m. Adị m nnọọ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst mgbe ha nọ n'ime oké ifufe. Enwere m ụjọ maka oke ifufe ahụ, di mkpasụ iwe, nakwa di mgbagwọjụ anya n'ihi na echere m na Chineke achọghị ịma ihe ọbụla gbasara m. Ma Jizọs wetara m n'isi ihe ọzọ n'ndu m.
  2. Jizọs nọ na-agbalị ịkụziri m na udo ga-ekwe omume, agbanyeghị oké ifufe ọbula. Ọgụ a ọdikwa ka nke gi? Ọ dịghị mfe, ọ kwa ya? Aka m na-agbasi mbọ ike ịghọta otú Jizọs si chee m ka m nwee ahumahu udo n’ime oké ifufe, mụ a n'eche ma ihe gbasara m ọdikwa Ya n'uche n'ezie, mgbe m ghọtara isi ihe oganihu m nke ọzọ.
  3. Oke ifufe m kpụghere ọkwa ntụkwasị obi m. Udo apụtaghị na ihe niile na-aga nke ọma na ndụ gị. Ọ pụtara ịnọ n'udo mgbe oké ifufe na-ama ndụ gị jijiji. Amụtabeghị m ịtụkwasị Chineke obi na ịchọta udo ọbụnadi n'ime oké ifufe ndị ahụ. Ị kụgbụọla ahu gi n'mgbidi ahụ?

Ọ dọrọ anya na enwere m ohere iji tọkwụọ. Ma, ana m amụta na ana-achọta ụzọ udo site n'ịtụkwasị obi na idọzi echiche anyị n'ebe Onye ahụ nke oké ifufe n'enwekataghi bụgharia. Ọ meghị n'otu ntabi anya, mana obere obere, nnukwu udo na izụ ike wee mee ka mkpụrụ obi m ike gwụrụ, gbasie ike ma di ọhụrụ.

-Cheri

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara