Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Jizọs na-ezụte anyị n’etiti nchegbu anyi, ọbụlagọdi mgbe anyị n'enweghị mmetụta Ya na mbụ. Chelsea bụrụ ụzọ nweta nsogbu nchegbu ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ na kọleji. Nke a bụ akụkọ ya banyere otú Chineke si kpọpụta ya n’ime ọchịchịrị wee kpọbanye ya n’ime udo Ya.

Mmetụta nke egwu, nchegbu, na ịda mbà n'obi dị nnọọ ezie. Enweghị m ike iri nri kwa ụbọchị n'ihi ọgbụgbọ. Ana m ehi ụra ihe karịrị elekere iri na abụọ kwa abalị, ma kwa ụtụtụ, ọ bụ agha ime ka mụ onwe m si n'àkwà bilie. Ekechiri m onwe m nke ukwuu n'ime uche m nke pụtara na ọtụtụ ụbọchị adighị m ekwu okwu. Achọrọ m enyemaka site n'aka ezinụlọ m, dọkịta, onye ndụmọdụ, ndị ụkọ chukwu, na ndị enyi m, mana ụbọchị ọjọọ m dị ka ha anaghị agwụ agwụ.

Anyị niile na-enweta ụbọchị ọjọọ. Ma ụbọchị ọjọọ ndị ahụ nwere ike ịdị izu izu. Ma ọ bụ ọnwa ọnwa. Ma ọ bụ afọ afọ. Ma ọ bụrụ na ị maara akụkọ nke Gụd Fraịde, ụbọchị Jizọs nyere ndụ Ya maka gị, ị maara na e nwere ozi ọma, ndi enyi m. Fraịde gbara ọchịchịrị, mana Sọnde na-abịa!

Anyi nwere olile-anya n'ime ọchichiri, olile-anya anyi nwekwara aha. Aha ya bụ Jizọs.

N’ụbọchị m nke kachasi njọ, otu Fraịde n’ọnwa Julaị, a bịarụtere m Ya nso n’ikpeazụ dịka otu Ọ si wee na-abịaru m nso. Ekpere m ekpere:

Jizọs, nyere m aka ịjụ ụgha nke onye iro.
Jizọs, nyere m aka imeri obi nchegbu m.
Jizọs, nyere m aka inwe ntụkwasị obi na Ị na-achị.
Jizọs, nyere m aka ikwere na Mụọ ahụ nke mere ka Ị si n'onwu bilie bi n'ime m.

Ma ụbọchị abụọ ka m kpechara ekpere a, na Sọnde, e tetara m ura na-enweghị oke ịda mbà n'obi makwa n'enweghị mmetụta nke nchegbu. Na nke mbụ n'ime ogologo oge, enwere m ike inwe mmetụta udo Ya. E nwetara m ọgwụgwọ ọrụ ebube nke a pụrụ ịkọwa naanị site n’ịdị mma nke Chineke.

N’ime ụbọchị m ndi di njo, Jizọs nyere m olileanya. Ọbụnadi mgbe m na-enweghị ike ịnwe mmetụta Ya, Ọ nọ ebe ahụ. Ubọchị niile m chere na Ọ dị anya n'ebe m nọ, Ọ no na-adọkwu m nso Onwe Ya.

Amaghị m ma ị ga-enwe ahụmahụ nke ị na-atughi anya, bu ọrụ ebube nke ọgwụgwọ ihe mgbu gị dịka m si wee nwete. Ma ama m n'ezie na Chineke nọnyeere gị n'ime ihe mgbu gi.

Jizọs ghọtara ahụhụ nke ụmụ mmadụ na-ata. Ọ na-eche banyere ya. Ọ metụtara Ya nke ukwuu nke mere Ọ ji hapụ Eluigwe wee nwụọ maka anyị iji wee bibie ọchịchịrị anyị otu mgbe ma maka oge niile.

Akwụkwọ Nsọ kwụrụ, sị: … Ndụ Ya wetara ìhè nye onye ọ bụla. Ìhè ahụ na-enwu n’ime ọchịchịrị, ọchịchịrị apụghịkwa imenyụ ya ma ọlị. Jọn 1:4-5 NLT

Ụbọchị Sọnde na-abia.

-Chelsea

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara