Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Kedụ otu iga esi hụta ya ma ọ bụrụ na ị nwere ike ito Chineke ọbụnadi n'etiti ihe mgbu? Brian nwetara ahụmahụ nchegbu nke bụterekwa mgbaàmà ufodu n'anụ ahụ ya. Ma site n’ahụmahụ ya, ọ chọpụtara na ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eji kelee Chineke. Nke a bụ akụkọ ya:

Mgbe mbụ m lụrụ ọgụ maka nnukwu nchegbu na ụjọ obi bu afọ ole na ole gara aga mgbe m bi na mba ọzọ n'oge ndụ m siri ike. Ka m na-agbalị ịmụ asụsụ ọhụrụ, malite azụmahịa, bụrụ ìhè nke Kraịst n'ebe ana enweghi ụlọ ụka ọbụla nọ, ma zulite ejima m dị otu afọ, ọ dị ka a ga-asị na m ji nwayọọ nwayọọ n'adakpụnye n'ime ndagwurugwu gbara ọchịchịrị.

N'ime ọtụtụ ọnwa, enwere m ntarama ahụhụ nke mgbu obi, isi ọwụwa na ọrịa ndị ọzọ bu ndi malitere egwu na nchekasi dika ihe m n'ahụbeghi na ndụ m. Rụọ oge a na ndụ m, n'ezie enwebeghị m nsogbu nchekasi nke ukwuu, ma ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, ana m anya isi na abụ m onye nwere obi isi ike n'ime ihe ize ndụ. Ma n'oge na-adịghị anya, amalitere m tụghariwa uche banyere ọnọdụ ndị digbụrụ onwe ha na njọ—mụ adi mkwenye na e nwere ihe dị oké njọ na-ezighị ezi n'ebe m nọ ma ọ bụ na ihe ọjọọ ga-eme ezinụlọ m.

Ndị mmadụ na-ajụ ma nchegbu m ọ̀ bụ ihe ọnọdụ gbara m gbụrụgbụrụ kpatara, ihe anụ ahụ m kpatara, ma ọ bụ nke ime mmụọ. Mgbe m tụlechara nke a nwantakịrị, enwere m obi sie ike na azịza ya bụ “ee.” Ekwenyere m na ọtụtụ mgbe enwere ike inwe ọtụtụ ihe na eweta nsogbu nchegbu. Ndọkasi ahu nwere ụzọ ọsi asụ ọkụ rụọ n'ókè ebe ọbụnadi ndị nwere nnụkwụte ndidi nwere ike idaba n'ime ikikere ọ ji ari elu.

Ọzọkwa, dị ka adịghị ike anụ ahụ ndị ọzọ ma ọ bụ ọrịa, ụfọdụ n'ime anyị na-enwekwa oge mgbe kemịkalụ nke ahụ anyị na-ọnọzighi anọzi. Tụkwasị na nke ahụ, onye iro ime mmụọ anyị di ka ọ̀bu onye n'enwe nnukwu ohere ma a bịa ná mmegide ya, na-alụsọ anyị ọgụ n’ebe ndị anyi na-adịghị ike.

N’ihe ịma aka Pọl a ma ama ka anyị ghara ichegbu onwe anyị n’ihe ọ bụla ná Ndị Filipaị 4:6-7, ọ kpọghị anyị ka anyị kpee naani ekpere kamakwa ka anyi nye ekele. Ihe dị n’akụkụ ntụziaka Pọl anọghị na mmeri ma ọ bụ mgbe ọ nwetasịrị ọrụ ebube. N'ezie, ọnọdụ Pọl n'onwe ya nọ amagbụghi onwe ya. Ọ si n’ụlọ mkpọrọ na-edegara Ndi Ụlọ Ụka Filipaị akwụkwọ ozi ma na-eche ọdịnihu ọ na-ejighị n’aka ihu. N'agbanyeghị nke ahụ, akwụkwọ ozi ya na-egọsipụta ọñụ ya miri emi na àgwà ya nke ịñụrị ọñụ.

Ya mere, n’etiti ihe mgbu anyị, anyị nwekwara ike inye otuto.

Ekwetaghị m na Pọl na-asi anyị ka anyị na-akụ igba obi ekele na-enweghị ezi obi. Echere m na Pọl na-ama anyị aka inye ekele n'ebe ekele kwesiri, ọbụlagọdi n'etiti mgba ọ bụla anyị na-agabiga ugbu a.

Achọpụtara m na ọ dịghị mgbe m na-enweghị ihe ọ bụla m ga eji-eme emụme. Ọbụnagọdi n'oge ụfọdụ n'ime ọnwụnwa ndị kacha sie ike m gabigara, enwekwara m ihe ndị m na-enwe ekele maka ha. Ịtụgharị uche na ihe ndị ahụ na ikwupụta ekele nye Chineke na-enye aka ịgbanwe otu m si ahu ihe makwa megharịa uche m.

Mbụgide echiche nke na-adịghị mma ma ọ bụ nke na-adọkasi ahu nwere ike ịmepụta echiche nke di ka ezigbọte ihe ọjọọ ọ na-abịa. Mana mgbe ọbụna m na-ekwụpụta ekele m nye Chineke dị ka ịhe m manyere onwe m ka m n'eme, ana m enwekarị ahụmahụ na ibu nchegbu ahu si m n'ahu n'ebuli.

Nke ahụ abụghị ịsị na e nwere usoro awụwọ obula eji ebi ndụ n'enweghi nchegbu. Mana ụkpụrụ nke ito Chineke ọbụnadi n'ime ihe mgbu bụ ụzọ nke ọnụnọ Ya na-enye ndụ, nke na-enye anyị udo.

-Brian

Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara