Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

N'Mgbụgba Ọsọ

Ibi ndu na nchekasi di nnọọ ka ibi ndu n'mgbụgba ọsọ—ewepụ na ina agbapụ ọsọ n'ime ndu onwe nke gi. Ujọ n'enwe onodu n'ime obi gi ka ina agbalisi ike igbaga n'ebe di nchebe dika ọ nọghi nso. Echiche na agbaghari n'ime isi gi ọsọ ọsọ nke n'eme ka ikụ ume sie ike, ma ujọ ana agbalite, n'ewete obi akwụghi chim na obi abụọ.

Ọ n'ada ka ihe ima ama? Enwere nrụgide mgbe niile ka ighara imechipụ ndu gi—imel enwekataghi kwụsi, ọzi kwa ọzi ejụpụta n'ekwe ntị anyi, ma ka anyi ghara ichefu ọnya ntụnyere nke mgbasa ọzi oha n'eze n'ewete. Ya mere, kedu otu anyi na ihe ndia ga esi wee biri, mgbe anyi ma na dika Ndi Nso Ụzọ Kraisti, akpọrọ anyi ka anyi bie ndu n'enweghi nchekasi ahu?

Kwa mgbe kwa mgbe obi ọmamikpe n'adagbụ anyi maka na anyi n'eche na ndị kwere na Kraisti ekwesighi inwe mmetụta n'ụzọ di otu a.

Mana kee ka ọga esi di ma oburu na anyi kwụsi igbara ihe ọsọ ma bido igbakwụrụ ebe mmadu nọ?

Anyi nwere ike. Ị nwere ike. Nkwenkwa na anyi nwere ike ibi n'enweghi nchekasi gbasara ihe obula adighi mgbakwasi n'ihe anyi nwere ike imepụta kama ọdi mgbakwasi n'ọninọ nke Chineke. Lee ihe ekwụrụ na Filipaị 4:6-7 NIV:

Echegbụna onwe gi maka ihe obula, kama n'ọnọdụ obụla, site n'ekpere na aririọ, jiri onyinye-ekele, were mkpa gi niile bụsa n'ihu Chineke. Ma udo nke Chineke, nke kafechara nghọta niile, ga echebe obi gi niile na uche gi niile n'ime Kraisti Jizọs.

Na onwe nke anyi, anyi enweghi ọlileanya banyere ọgụ a ana alụsọ megide nchekasi. Mana anyi na Chineke? Anyi nwere ohere n'ebe ọninọ Ya, nke n'enye udo nke anyi n'enweghi ike imalite ighọta.

Kedu ihe katụ nma banyere nkwenkwa ahu? Ọ bu ụsọrọ n'aga n'ihu. N'ime ọnọdụ obula. Oge obula anyi bidọrọ inwe mmetụta nchekasi, anyi nwere ike igakwụrụ Chineke maka udo Ya maka na udo bu ihe ndapụta nke ọninọ.

Nchekasi kwa mgbe agaghi akwusi kpam kpam. Ọ bu ihe oge-kwa-oge, ụsọrọ nganihu nke ichọ ọninọ Ya. N'ubọchi ole na ole sọchirinụ, anyi ga ekerita akụkọ nke ndi mmadu di ka mụ na gi ndi ha na nchekasi lụrụ ọgụ na ihe ha mụtawọrọ n'ụzọ ha.

Ị chọọ imụtakwụ ihe banyere nbibi ndu Echegbụna Maka Ihe Obula? Lee anya na ụsọrọ ọzi ndi ozo sọ n'abia ichọtakwụ udo.

*Oburu na ị na enwe ndọkasi ahu banyere nchekasi, ọdi mkpa ka ichọọ enyemaka kwesiri gi. Ọburu na ịchere na ịnwere ndọkasi ahu banyere nchekasi, gaa hụ dọkita gi. Ịchọ enyemaka anaghi eme ka idi ume ngwu; ọna eme ka ibụrụ onye amamihe.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara