Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Kedu ka iga esi hụ ya ma ọ bụrụ na nchekasị nwere ike ime ka ị bịarụọ Jizọs nso? Jọdan ji otu afọ n'ekpe ekpere ka ọ kwụsị ichegbu onwe ya rụọ mgbe ọ chọpụtara ihe miri emi—mmekọrịta siri ike n’ebe Jizọs nọ. Ọ nwere ike akụkọ ya dikwa ka nke gi:

“Echere m na aga m anwụ.”

Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe m chere n'ime obi m ọtụtụ abalị m n'enweghị ike irahụ ụra n'afọ gara aga. Aga m agbalị ịrahụ ụra, naanị ka m teta n'ụjọ n'enweghị ihe kpatara ya. Obi m kpachikwara akpachi. Ọ dị m ka m na-akpagbụ akpagbụ, enweghịkwa m ike ikụ ume mgbe ufọdụ. Usoro ahụ ga-emegharị ọzọ, n'ikpeazụ, ebụụrụ m onwe m gaa hiwe ura n'elu oche ka m wee kwụsị ịkpọte nwunye m.

Otu ụbọchị, agara m ga hụ dọkịta wee kọwaara ya ihe ndi n'enye m nsogbu—obi mgbu, ehighi ụra, na ụjọ ndi n'atu m. Mgbe e lechara m ule ugbọrọ ole na ole, ọ chọpụtara na m nwere nchegbu. Aga m ekwụnwu eziokwu? Ọ mere ka ọdi m ka adara m ada dị ka Onye Nso Ụzọ Kraịst. Ọ pụtara na m anaghi ekpe ekpere megide nke a n'ụzọ ziri ezi? Ekwesịghị m inwe udi nsogbu a, Aga m n'eche n'ime obi m, Ekwesiri m inwe udo na adịghị inọ n'iche echiche—ọ bụ ihe Jizọs si ka ana eme!

Mgbe m gbasọchara ntuziaka dọkịta wee malite ịna añu ọgwụ obere obere, anọgidekwara m n'ekpere ka nchegbu si m n'ahu pụọ ozigbo ozigbo. Achọghị m ka m nwee nsogbu ya ọzọ.

N'ime 2 Ndị Kọrint Isi Iri na abuo, na nsụgharị nke NIV, Pọl kwụrụ maka “ogwu di n’anụ ahụ́” ya. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe anyị maara kpọmkwem ihe “ogwu” Pọl bụ, ma nchegbu pụrụ n’ezie ịdị ka ogwu nke ọtụtụ mmadụ, gụnyere mụ onwe m. Pọl kwụrụ na ya rịọrọ Onye-nwe-anyị ugboro atọ ka Ọ wepụ ya, ma kama nke ahụ, Jizọs gwara ya, Sị: “Amara M ezụwọrọ gị, n’ihi na E mewọ M ka ike M zụọ oke na adịghị ike.” (akara mkwụsi ike bụ mụ onwe m tinyere)

Amara nke Jizọs bara uba, n’agbanyeghị ọnọdụ ọbụla. Ka m malitere ikpe ekpere maka ọgwụgwọ, amalitere m ịbịarụkwụ Jizọs nso. Dị ka Pọl, Chineke ewepụbeghị “ogwu” m. Otú ọbula osi dị, achọputawọ m na m nwere mmasị di ukwụụ n’ịgụ Okwu Ya, ma ekpeela m ekpere karịa ka m nwebụrụ ike ikpe na mbụ.

Echebụrụ m na ihe m chọrọ bụ ọgwụgwọ maka nchegbu m. N'ezie, ihe m chọrọ bu ọtụtụ Jizọs. Ugbu a, anaghị m ekwu na ọ bụrụ na m biarụrụ Jizọs nso na agaraghị m inwe nchegbu. Agaghịkwa m akwụsị ikpe ekpere ka nchegbu pụo. Aga m anọgidekwa n'ekpere ka a napụta m n’ogwu a dị ka Pọl si mee.

Mana ihe ka mma n'eme na ndụ m karịa ka a gwọọ m nchekasị m ozugbo: Ana m amụtakwụ nghọta di omimi banyere Chineke ma n'enwekwụ mmekọrịta bara ụba nke mụ na Ya.

Kama idi n'ekpe naani ekpere maka udo, ahụrụ m onwe m ka m na-abịarụkwụ Onyeisi Udo nso. Mgbe m malitere ichegbu onwe m maka ọdịnihu m, echetara m onwe m na Ọ bụ Alfa na Omega—mmalite na ọgwụgwụ, onye mbụ na onye ikpeazụ.

Ekpere m ekpere ka nchegbu m pụọ, mana ahụrụ m ihe ka nnọọ mma: ọnụnọ Jizọs na ịhụnanya Ya nke ukwuu n'ime ndụ m—ọbụnadi n’etiti nchegbu.

-Jordan

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere ...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara